Anyị gbanahụrụ ọnwụ mgbe ụlọobibi anyị dara - Ụmụakwụkwọ Mahadum Alex Ekwueme dị n'Ebonyi Steeti

Akụkọ ụlọobibi ụmụakwụkwọ Mahadum Alex Ekwueme dara ada n'Ebonyi Steeti
Nkọwa foto, Ọ bụ onye nkịtị nwe ụlọobibi a a kpọrọ 'Pentagon Lodge' bụ nke kachasị ukwuu na gburugburu Mahadum Alex Ekwueme.
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụmụakwụkwọ Mahadum Alex Ekwueme dị na Ndufu-Alike Ikwo nke Ebonyi Steeti akọwaala etu ha siri gbanahụ ọnwụ mgbe ụlọobibi ha dara n'isi ụtụtụ ụbọchị Fraịde 25 Julaị, 2025.

A sị na ụlọobibi a a kpọrọ 'Pentagon Lodge' bụ nke kachasị ukwuu na gburugburu mahadum ahụ dịka ọtụtụ ụmụakwụkwọ bijuru na ya tupu ọ daa.

Ebe ụlọobibi akụ kewara ụzọ abụọ

Mgbe onye ntaakụkọ BBC Igbo ruru ebe ahụ n'ụbọchị Satọde, a hụrụ ka ọtụtụ ụmụakwụkwọ na-agba mbọ ịkwapụta ụfọdụ ngwo ngwo ha ndị ka dị mma maka na ụlọ a dakwasịrị ma mebie ọtụtụ n'ime ha mana o nweghi onye ọbụla nwụrụ.

Ụfọdụ ụmụakwụkwọ a jụrụ ajụjụọnụ bụ gụnyere; Ujunwa Rita, Wisdom Ugochukwu na ndị ọzọ kọọrọ BBC Igbo etu ụlọ ahụ siri daa ma mebie ngwo ngwo ruru ọtụtụ nde naịra.

Ihe ụfọdụ ha sị mebiri gụnyere ekwentị, igwe kọmputa, ihe onyonyo TV, igwe njụoyi na ọtụtụ akụrụngwa eletrọniks na ihe ndị ọzọ e ji bi n'ulọ.

Mgbe ụmụakwụkwọ na-achọ ịkwapụta ngwo ngwo ha ndị ka dị mma.

Ha kọwara na ụlọahụ dara ihe dịka elekere itoolu nke ụtụtụ Fraịde ahụ mgbe ọtụtụ ụmụakwụkwọ na-akwado ịga n'ụlọakwụkwọ.

Ndị a kwuru na ha nụrụ ka otu nwata akwụkwọ tiri mkpu, ha gbapụtara ma hụụ ka ahụ ụlọ ahụ kewara ụzọ abụọ, ebe ụfọdụ akụkọ ya mibara n'ime ala ma ngwo ngwo ndị mmadụ dị n'ime ya.

Ọnọdụ ahụ mere ka ụmụakwụkwọ malite ịkpakeri ala iji zọo onwe ha ndụ.

Ha kwuru na ndịisi ụlọakwụkwọ nyere ha ụlọ ebe ha ga-anọ a kpọrọ 'Convocation Arena' mana ebe ahụ abụghị ebe dị mma ụmụakwụkwọ ịnọ.

Ha kwuru na ụgwọ ụlọ ha kwụrụ ebe ahụ agwụbeghi dịka ọtụtụ n'ime ha ka kwụchapụrụ ụgwọ ụlọ na nso nso a.

Ha rịọrọ ka onye nwe ụlọ ahụ na gọọmentị gbatara ha ọsọ enyemaka site n'inyeghachị ha ego ụlọ ha kwụrụ ka ha nwee ike chọta ụlọ ebe ọzọ biri.

Ụlọ a bụ ụlọelu ogogo abụọ

"Onye aka ya dị n'ịrụ ụlọ adịgboroja ga-ata ahụhụ ya"

Ebe akụkụ ụlọ ahụ mibara n'ala

Mgbe kọmishọna na-ahụ maka ụlọ na mmepe obodo n'Ebonyi Steeti bụ Elechi Inyima gara mgbarụ n'ebe ahụ, o nyere iwu sị ka emepie ụlọ ahụ ma malite inyocha ọnọdụ ya iji chọpụta ihe mere o jiri daa.

N'otu aka ahụ, Gọvanọ Francis Nwifuru nke Ebonyi Steeti enyela iwu ka e mee ezigbo nnyocha n'ụlọ ahụ dara ma ṅụọ iyi sị na ọ bụrụ na aka mmadụ dị na ya, na onye ahụ ga-ata ahụhụ.