Nwoke a sị gburu Eke na Nkpọr, Anambra Steeti adanyela na nsogbu

Ebe foto si, Screenshot
Ụfọdụ obodo n'ala Igbo nwere anụmanụ ha n'akwanyere ugwu ma na-asọ mmadụ ọbụla igbu ya.
Ihe nke a pụtara bụ na mmadụ enweghị ike kpachara anya gbuo ya bụ anụmanụ n'ihi na onye ọ bụla gburu ya ga-akpụ arụ dika omenala mba ahụ siri kwuo.
Iji maa atụ, obodo Ọka dị n'Anambra steeti na-efe Enwe, ebe obodo ndị nọ n'okpuru ọchịchị Idemmili Anambra Steeti na-efe Eke, obodo Ihe dị n'Awgu nke Enugwu steeti n'efekwa Eke nke ha kpọrọ "ọgbụrụgbụ"
Obodo Ọka nwere alụsi na-elekọta enwe nke a kpọrọ "Imo Awka", ebe alụsi na-elekọta Eke n'Idemmili niile bụ "Alụsị Idemmili"
Na mkpụrụ abalị ole ma ole gara aga ka otu nwoke dara iwu a site na-igbu Eke na Nkpọr dị n'okpuru ọchịchị Idemmili n'Anambra steeti.
N'ihe onyonyo na-efegharị na soshal midịa, ka e gosiri ka ndị ntoroọbia Nkpor n'eti nwoke ahụ ihe ma were Eke ahụ o gburu nyanye ya n'olu ka mgba olu.

Onyonyo ahụ gosikwara ka ndị ntoroọbịa obodo ahụ si na-akpụgharị ya n'obodo niile n'ekwu "gị bụ onye Abakaliki bịara na Nkpor be anyị, egwu atụghị gị, i were mma gbuo Eke Idemmili nke ị mara na anyị n'asọ ya nsọ."
Otu onye n'ime ha piara ya itari kwuo "ọ bụghị na ị gburu ya. Ị suola ose na yabasị ị ga-eji sie Eke ahụ ma rie. Anyị tachaa gị ahụhụ n'ije a, ụbọchị ọzọ ị ga-asọpụrụ omenala obodo ọbụla ị batara."
Ha gwara ya gụwa egwu: "gbuo gbuo gbuo, anyị egbuo Eke. Anyị akwaghị ya. Gbuo gbuo gbuo, anyị egbuo Eke, anyị akwaghị ya."
Gịnị ka a na-eme onye gburu Eke Nkpọr?
Onye ọbụla e jidere na Nkpọr maọbụ n'obodo ọbụla dị n'Idemmili gburu Eke, ga-akwa ya dịka e si akwa mmadụ.
Nke a bụ maka na ndị obodo ọbụla n'efe Eke kwetara na ọ bụ nna nna ha bịara ụwa dịka Eke. Nke a pụtara na ya bụ Eke dị ha ka mmadụ ibe ha siri dị.
Onye dara iwu a ga egota ihe ọbụla alụsị gwara ya, dika mmanya, ọ ga esi nnukwu nri, gota akwa, oji Igbo na ihe ndị ọzọ. Ọ ga akpọrọ ndị ezi na ụlọ ya gaa ebe ndị isi obodo gwara ya gaa mee akwamozu ya bụ Eke dika mmadụ.
Otu onye Nkpor gwara anyị na onye ahụ gburu Eke, ga-eme akwamozu ya ngwa ngwa tupu alụsi Idemmili egbuo ya.
Gịnị ka eke na-emere ndị Nkpọr?
Otụtụ obodo dị n'ala Igbo gụnyere okpuru ọchịchị Idemmili niile ma n'Ihe dị n'nugwu steeti, kwenyere na ọ bụ Eke ahụ na-echekwa ma na-eweta ihe ọma na ndụ ha.
Maazị Okoye Benard, onye Nkpọr anyị gbara ajụjụ ọnụ kwuru: "Ọ bụrụ na Eke ahụ abịa n'ụlọ onye ọbụla, ị ga-ewere nnukwu ihe chụọ aja were kelee ya maka ọbịbịa ọ bịara."
Dịka o siri kwuo, onye ahụ ga-asị ya nnọọ mana ya biko laghachi n'ebe o si.








