"Ọ bụghị n'ihi agụụ mmekọrịta nke anụahụ ka m ji si n'ọrụ ụkọchukwu Fada pụọ"

Aha onyonyo, Ihe mere m jiri gbahapụ ụka Kraịst ma banye n'ihe omenala - Onye bụbu Ụkọchukwu
"Ọ bụghị n'ihi agụụ mmekọrịta nke anụahụ ka m ji si n'ọrụ ụkọchukwu Fada pụọ"
    • Onye dere ya, Ikechukwu Kalu & Kelechi Anozia
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist & Video Journalist

Echezona Obiagbaosogu bụbu onye ụkọchukwu nke ụka Katọlik akọwaala ihe mere o jiri gbahapụ okpukperechi Kraịst ma banye n'ihe omenala.

Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere, ọ kọwaara na ọ bụghị n'ihi agụụ mmekọrịta nwoke na nwaanyị mere o jiri pụọ dịka ọtụtụ ndị mmadụ na-eche.

O kwuru na ọ gbahapụrụ ọrụ ụkọchukwu nke ọ rụrụla kamgbe afọ iri na isii n'ihi na o nweghizi mmasị ịbụ onye ụkọchukwu, tinyekwara mmasị o nwere n'ihe banyere omenala.

"Ọtụtụ na-eche na ọ bụ n'ihi agụụ nke anụahụ mere m jiri hapụ ọrụ ụkọchukwu mana nke ahụ abụghị eziokwu.

"O nwere oge o ruru mgbe m na-enweghizi mmasị n'ọrụ ụkọchukwu, agwara m ndịisi m na mụ arụjuola ma hapụ ụka."

Echezona Obiagbaosogu kwenyere na ọ bụ otu Chineke nke ndị ụka Kraịst na ndị omenala na-ekpere.

Ebe foto si, Echezona Obiagbaosogu

Obiagbaosogu bụ onye nkuzi ihe banyere omenala mba Afrịka na Mahadu Nnamdi Azikiwe dị n'Awka, Anambra Steeti kwuru na ọ banyere n'ihe omenala n'ihi mmasị o nwere na ya.

O mechara dee akwụkwọ banyere etu e si 'aha mmiri' nke a kpọrọ 'rainmaking' n'asụsụ Bekee.

Ọ gara n'ihu kwuo na mgbe ọ gbara arụkwaghịm n'ọrụ ụkọchukwu na ọ gara lụọ nwaanyị.

''Alụọla m nwaanyị, ọ bụru na mụ abụghị Fada ụkọchukwu, ka m bụrụ nụ nna ụmụaka, ka o kwuru."

O nyere ndị okpukperechi Kraịst ndụmọdụ; ka ha kwụsị ịhụta ndị omenala dịka ndị na-ekpere ekwensu, ma kwuo na ọ bụ otu Chineke ka mmadụ niile na-ekpere, ma ndị Alakụba, ndị Omenala, ndị Kraịst na ndị Hindu.

Kirie ihe o kwuru n'uju;