Ala Bini na ebe ndị ọzọ Igbo gara njem Bịambiri oge gboo

Oba Ewuare nke Benin

Ebe foto si, Obaewuare/Instagram

    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Na ndị Igbo bụ ndị njenje abụghị taa ka ọ malitere n'ihi na o teela otele dị n'azụ.

Akụkọ ihe ndị mere oge ochie kwuru na Igbo gara njem bịambiri n'ebe dị iche iche na Naijiria gụnyere Ugwu Naijiria, ala Bini nakwa ala Yoroba oge gboo.

Aha onyonyo, Ugboro atọ ndị Igbo zọpụrụ njem bịambiri oge gboo na ebe ha gara

Ụfọdụ ndị dere akụkọ ihe mere mgbe ochie banyere ndị Bini dịka Jacob Egharevba na-asị na obodo ndị nile gbara Bini gburugburu gụnyere ndị Igbo bi na Ọdịda Anyanwu Naija (West Niger Igbo) bụ ndị Bini.

Njem Mbịambiri n'ala Bini

Eze Bini, Oba Ewuare

Ebe foto si, Oba Ewuare/Instagram

Ọ bụ akụkọ doro ewu na ọkụkọ anya na ndị Igbo mere njem bịambiri gaa ala Bini tupu ndị ọcha abata na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịka ma weghara ọchịchị.

Ụfọdụ na-ede akwụkwọ dịka Jacob Egharevba bụ onye dere akwụkwọ a ma ama maka mmalite obodo Bini nke o bịpụtara n'afọ 1968 na-asị na ndị Igbo, ọkachasị, ndị nọ ma a gafee akwa Naijia bụ ala Bini ka ha sị.

Obodo ndị a gụnyere Ubbulu-Ukwu, Issele-Uku, Issele-Azagba, Agbor, Umunede, Ogwashi-Uku Wdg.

Ọkammụta Nkemcho Onyekpe na Oni nke Ife, Oba Adeyeye Ogunwusi

Ebe foto si, BBC/OniofIfe/Instagram

Mana Ọkammụta n'akụkọ ihe mere oge ochie(History) na Mahadum 'University of Lagos' bụ Nkemcho Onyekpe kwuru na nke a abụghị eziokwu.

Onyekpe kwuru na ndị ahụ a sị si Bini pụta bụrị nlọghachi ijem ha mere oge gboo ka ha na-alọghachi.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

"Nke bụ eziokwu bụ na ha bụ ndị Igbo mere njem Mbịara mbịara gaa Bini lọghachiri azụ ma biri ebe ahụ."

Oge gboo ndị Igbo ụfọdụ ji maka ụkọ ala nakwa mụba kwara si ala Igbo gaa Bini maka ọrụugbo na azụmahịa.

"Ọtụtụ n'ime ha gara ebe ahụ ga biri ma nwekwa agba."

"Ụfọdụ n'ime ha ka eze Bini chiri echichi. Mana n'ihi etu ụfọdụ ha si awa anya maọbụ agba mbọ, ha na ndị na-achị Bini malitere nwewe nsogbu nke mere ka, malite na 16 Senturi, ha malitere laghachitewe ala Igbo.

"Mana ọ bụghị ha nile gafere Osimiri Naijirịa laghachiri ebe ha si pụta na mbụ."

"Nani ndị Ọnịcha bụ ndị gafere mmiri Naijia."

Ọtụtụ ndị laghachiri biri n'ogbe dị n'agbata Abudu na Asaba.

"Ndị a abụghị ndị Bini. Ndị na-asị na ndị Igbo nọ n'Ọdịda Anyanwụ Naija (West-Niger Igbo) bụ Bini n'ihi na ha si Bini pụta, amaghị akụkọ ihe mere oge gboo ruo ala."

"Ha bụ ndị Igbo gara bịambiri Bini. Ha bụ ndị lọtara alọta, ihe ndị ọkachamara n'okwu akụkọ ihe mere oge gboo na-akpọ, 'reverse migration'. "

Ndị na-asụ Igbo sị na ha abụghị Igbo

Ụfọdụ ndị nwere asụsụ na omenala e ji mara ndị Igbo na mpagha Delta nakwa ,Edo akwa Riva stteeti na-ekwukarị na ha abụghị Ndị Igbo.

Ụfọdụ ha na-ekwu na ha bụ Ndị Bini, ebe ụfọdụ na-asị na ha si Igala.

Mana Ọkammụta Onyekpe sara ụdị ndị ahụ sị, "Ndị Igbo mpaghara Ọdịda Anyanwụ Naijia(West Niger) sị na ha abụghị Igbo amaghị ntọọala ha."

Ọ rụtụrụ aka na Agha Biafra soro bute ngọnarị ha na-agọnarị ebe ha sị.

" E nwere mkpachapụ na mkpagbu ndị Igbo nke na-aga n'ihu. Nke a mere ka ụfọdụ iji chekwa onwe ha hapụ aha Igbo ha dịka o siri mee na Rịvas Steeti."

"Ọtụtụ obodo dị na Rivas wepụrụ mkpụrụ okwu mbụ nke mere ka aha ha zawa ihe ọzọ abụghị Igbo."

"Ị bụrụ Nwike, i wepụ 'N', ị bụrụ Wike. Anaghị m ekwu maka aka ch̄ịbụrụ Rivas bụ Wike, ọmụma atụ ka m na-enye.Obodo dị na Rịvas dịka Ikwere na Ndọnị bụ obodo ndị Igbo."

" Pọtakọt bụ ndị Igbo hiwere ya tupu ndị ọcha abịa.

Ọ gara n'ihu kwuo na nke kachasị nke bụ "e kwube maka Biafra,ị gaghị ewezụga Igbo na Biafra. Igbo bụ ala, ebe Biafra bụ mbọ nwere onwe. Onye Igbo ọbụla sị na ya abụghị Biafra abụghị ezigbote Igbo."

Njem Bịambiri ala Yoroba

Ọnị nke Ife bụ Oba Adeyeye Ogunwusi bụ onye ndu ndị Yoroba

Ebe foto si, Oni of Ife/Instagram

Akụkọ a na-anụkarị bụ na ndị Igbo mere njem Bịambiri gaa ala Bini, ọtụtụ amaghị na njenje buuru ụmụ Eri gaa ala Yoroba.

Dịka Ọkammụta Onyekpe sịrị na ndị Igbo mere njem biambiri rue ala Yoroba tupu ndị Yoroba abịa biri ebe ha bi taa.

"Tupu Oduduwa bụ onye a ma ama dịka nna mụtara ndị Yoroba abịa, ihe ndị ochie e gwupụtara n'ala gosiri na o nwere ndị ogbe bicha n'ala Yoroba. Ufodụ ogbe ndị ahụ bụ ndị Igbo."

"Anyị na-ekwu maka etu ndị Igbo si akpa ike n'ụfọdụ mpaghara ala Yoroba tupu Ezenwaanyị Moremi were jiri ụzọ aghụghọ zọpụta ndị be ha."

Okwu a Ọkammụta Onyekpe gbaghara ihe Oni nke Ife bụ Oba Adeyeye Ogunwusi, kwuburu n'okwu ihe jikọrọ Igbo na Yoroba.

Akpụrụakpụ Moremi
Nkọwa foto, Moremi bụ Ezenwaanyị ala Yoroba a ma ama bụ onye meriri mazọpụta ndị ala ya n'aka ndị iro dịka ọ ji aghọghọ mata ebe ike ndị iro ha dị.

N'afọ 2023, Ọba Ogunwusi gwara ndị ntaakụkọ na, "Anyị nwere ezigbo ihe aka ebe gosiri na ndị Igbo nwere mgbọrọgwụ n'Ile-Ife."

Obodo Ile-Ife dị n'Osun steeti bụ ebe bụru ndị Yoroba ihe obodo Nri bụụrụ ndị Igbo.

Ile-Ife bụ ochie obodo ebe a ma dịka ebe ndị Yoroba si pụta.

O kwuru na e nwere ebe a na-akpọ Ile-Igbo n' ala-eze ya nke be ebe dịwara gboo.

Nke a yiri ihe o kwuburu n'afọ 2019 bụ oge ọ sịrị na " E nwere ọnụmara Igbo dị iche iche si Ife ga hiwe alaeze ebe dị iche iche."

Onị gara n'ihu sị na akụkọ na ndị Igbo si Juu bịa abụghị eziokwu.

N'ezie Igbo biri Ile-Ife tupu ndị Yoroba abịa - Igwe Achebe

Igwe Achebe

Ebe foto si, Igwe Achebe

N'otu aka ahụ, Obi nke Onicha bụ Igwe Nnaemeka Achebe kwuru na ọ bụ ezie na ndigbo bibu ala Yoroba oge gboo.

Achebe kwuru sị, "O bụ ihe were anya na ndị Igbo ebirila n'Ile-Ife tupu ndị Yoroba abịa ebe ahụ."

Achebe, onye gbadoro ụkwụ na ihe nchọpụta ndị ọkachamara n'okwu gbasara ihe mere oge gboo dere, kwuru na ha mechara nwebe nghọtahịe ikike mere ka 'ndị Igbo ji mmanwụ na-abanye ndị Yoroba ọgụ bụ ndị chere na mmanwụ bụ mmụọ n'ezie."

O kwuru na ndị Igbo mekpara ndị yoroba ahụ ganye na Moremi ewepụta onwe ya ka Eze Igbo lụọ ya o nwere mata ihe zoro maka ndịigbo, na mmanwụ abụghị mmụọ."

Ọ gara n'ihu kọwaa na a ka nwere ndị Igbo alaghachighị ala Igbo kama ha binyere ndị Yoroba ma nwekwaa emume ndị Yoroba ji eme ncheta mmeri ha meriri ndị Igbo n'agha a kpọrọ, "Edi".

Njem Bịambiri Ugwu Awụsa

Attah nke Igala

Ebe foto si, Indigenous People of Igala/Facebook

Na ndị Igbo bụ ọkpa nkọ, abụghị ihe taa.

A mara ha dịka ndị e nweghị ebe ha anaghị atụnye ụkwụ dịka ha na-achọ ebe ụwa ga-akara ha mma.

Ndị Igbo enweghị ike ibinyere ndị Igala n'ihi na ndị Igala bụ agbụrụ kpọrọ akpọ n'ịlụ agha oge gboo.

Mana akụkọ ihe mere oge gboo kwuru na Igbo gara ebe ụfọdụ ndị ọzọ dị mpaghara Ugwu Awụsa bụ ebe ha nọ rue taa.

Ọkammụta Onyekpe kwuru sị na "nke mere na e nwere Igbo na Kogi, Benue na ụfọdụ mpaghara Platu steeti."