Agha Igala na Igbo: Ọ bụ eziokwu na ndị Ịgala meriri Igbo n'agha ma mee ụfọdụ ha ohu oge gboo?

Ebe foto si, Getty Images/NPF
- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5
Ọtụtụ ụmụafọ Igbo na ndị Igala na-anya isi ịma ihe niile e kwesịrị ịma banyere ntọọala agbụrụ abụọ a.
Mana ha amaghị na e nwere ọgụ agbụrụ abụọ a lụrụ n'oge ochie tupu ndịọcha abata were ọchịchị n'ebe a kpọrọ Naijiria taa.
Ndị Igala bụ agbụrụ ndị bi na Ndịda na Ugwu Kogi steeti, ebe ndị Igbo bụ agbụrụ ndị bi na steeti ndị n'Ọwụwa Anyanwụ dịka Abia, Anambra, Ebonyi, Enugu, na Imo steeti. E nwekwara ndị Igbo na Benue, Kogi, Edo, Delta, Krọs Riva nakwa Rivas steeti.
Akụkọ ihe mere oge elu bụ ala ọsa kwuru na ndị Igala busoro ndị Igbo agha malite na mpaghara Nsuka rue n'ala Igbo dị n'ikpere mmiri Osimiri Benue na Niger dịka ha kwatara n'ihi okwu ịzọ ala, mmiri a na-akụ azụ , anụ a gbara na nta na ihe enwenwe ndị ọzọ.
Mana ụfọdụ ndị ọkachamara Afrịka n'akụkọ ihe mere gboo kpọrọ ya bụ akụkọ 'iji obu ama atụ nwa nza'.
Oge gboo, ọtụtụ mba dị iche iche , ọ kachasị ndị gbara agbata obi ịka ndị Bini, ndị Oyo, ndị Jukun, ndị Dahomi, ndị Arochukwu wdg. lụrụ agha wuru ewu oge gboo ịjị zọta ala, ohu maọbụ ikike ọchịchị.
Mana ọgụ Igbo na Igala bụ ihe ọtụtụ amaghị maka ya na-agbanyeghị na ọtụtụ akwụkwọ akụkọ rụtụrụ aka na ya.

Ebe foto si, Getty Images
N'akwụkwọ o dere a kpọrọ 'A History of a Voyage to the Coast of Africa", otu nwa Bekee onye Amerịka a kpọrọ, Hawkins Joseph kọrọ akụkọ etu o siri bụrụ ọbịa otu Eze Igbo ya na Eze Igala lụrụ ọgụ dịka Eze Igala wakporo alaeze ya ma buru ụmụamala ya gbalaga.
Dịka Eze ahụ sị kọọrọ Hawkins, ihe butere esemokwu bụ na ndị dinta si ụfọdụ obodo dị n'ala Igbo chụrụ anụ, anụ ahụ agbaba n'ala ndị Igala, ndị dinta Ịgala malitere chụwa anụ ahụ, mana ndị dinta Igbo gbatara ya bụ anụ, esemokwu daa dịka ndị Igala zọwara anụ. Ọ gụ ahụ tara isi otu onye Ịgala , nke mere ka ha gbaa ọsọ, ebe ndị dinta Igbo ahụ bu anụ ahụ laa na mmeri na-agbanyeghị na ọtụtụ ha merụrụ ahụ.

Ebe foto si, Indigenous Igala People/Facebook
Hawkins sịrị, " Iwe were otu abụọ; Eze Igala kpokọbara ndịagha ya wakpoo obodo Igbo ma gbaa ogbe abụọ ọkụ, buru ehi ha ma kpụrụ mmadụ ole na bụ ndị o lere ohu."
Akụkọ Hawkins kwadoro ihe Bishọp Ụka Katọlik bụ Achịbishop Geofrey Onah kwuru na nso nso a.
Onah kwuru na ndị Igala lụrụ agha megide Igbo na mpaghara Nsuka na mba ndị bi na ikperemmiri Osimiri Naija dịka Asaba.
Onah kwuru n''ihe onyonyo fegharịrị na nsonso a sị, "Dịka ndị Jukun chụsoro ndị Igala n'Ugwu, ha wabatara na Ndịda Anyanwụ na mpaghara Ala Igbo ụfọdụ luso ha ọgụ, merie ma weghara ọchịchị na mpaghara dị iche iche n'Ugwu Alaigbo malite na Ndianaeku Nsuka rue Asaba."

Ebe foto si, Godfrey Onah/Facebook
"Onyeisi ndị Igala bụ Atta iji okpukperechi were merie ma na-achị n'ebe ndị ha meriri nke bụ na rute n'afọ 50 gara aga,ọ bụ ndị Igala na-abịa echi ha Atama."
Achịbishop Onah rụtụrụ aka n'ụfọdụ ihe ndị Nsuka na-akpọ omenala ha ugbua dịka m̀manwụ Oriọkpa bụ usoro Atta webatara o ji edobe iwu ma ana ụtụisi nke nwaBekee na ụka kwụsịrị oge ha batara Ala Igbo.

Ebe foto si, Martin Okolo
'Akụkọ ndịọcha ji emesa anya mweghara ọchịchị ha were n'Afrika'- Ọkammụta

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Mana Ọkacharamara n'akụkọ ihe mere oge ochie na Mahadum 'University of Lagos' bụ Ọkammụta Nkemcho Onyekpe gbaghara akụkọ na ndị Igbo na Igala lụrụ agha.
Ọ sịrị, "Ihe ndị Igbo na ndị Igala nwere bụ nghọtahịe ịzọ ala, ebe a na-akụ azụ maọbụ anụ a gbara na nta."
"E nweghị agha nwere isi Igbo na Igala lụrụ oge gboo karịa agha nke otu odogwu Igala a kpọrọ Onojo Ogboni bụ onye meriri ogbe ole ma ole n'Igbo. Ya na ndị na-eso ya gara n'ebe ahụ biri."
Ọ kọwara na na-agbanyeghị mmeri ahụ, na omenala ndị igbo loro omenala ndị Igala n'ebe ndị ahụ dịka ndị Igala bịara njem mbiri ahụ dị ole ma ole.
Ọkammụta Onyekpe kwuru na akụkọ agha Igbo na Igala bụ akụkọ ndịọcha na-ede akwụkwọ iji mesaa ndị mmadụ anya iji kwadoo mwakpo ha wakporo Afrika, sị na ndị Afrịka na-aluso onwe ha agha.
"Ihe ndị a bụ obere nghọtahie maka ala maọbụ mmiri a na-akụ azụ nke ndị ndịọcha na-ede akwụkwọ mere ka ọ bụrụ nnukwu ihe iji kwado mwakpo Afrịka na ọchịchị ndị ọcha."
Maọbụ ọgụ ka ọ bụ aka ka Igbo na Igala dụrụ onwe ha n'ọnụ oge gboo, ihe were anya bụ na ọtụtụ ihe jikọrọ ndị Igbo na Igala.
Nke a gunyere omenala na okpukperechi.
Ụfọdụ obodo n'ala Igbo bụ ndị agbụrụ Igala bụ ndị ndu ha na-agbanyeghị na ha na-asụzi Igbo.
Ọzọ bụ na echichi Atta ka di ire n'Ala Igbo ugbua.









