Ụlọikpe atụọla Baltasar Ebang na mmadụ isii ndị ọzọ nga afọ asatọ

Baltasar Engonga

Ebe foto si, Baltasar Engonga/Facebook

Nkọwa foto, Baltasar Engonga
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ụlọikpe Malobo na-eme nnyocha dị na mpaghara Bioko na mba Equitorial Guinea atụọla Baltasar Ebang nakwa mmadụ ruru isii ndị ọzọ nga afọ asatọ maka ebubo gbasara mpụ na nrụrụaka.

Dịka ụlọ mgbasaozi Realequatorialguinea si kwuo, ụlọikpe ahụ wepụtara mkpebi ha n'ụbọchị Tuzde ma nye ya ntaramaahụhụ ego ruru puku pụrụ puku.

Ọ sị na Ebang Engonga dara iwu imepe akara ọbọ ego ụlọọrụ ya gi arụ ọrụ nke naanị ya ga-ebinye aka ma nwepụta ego n'ụlọakụ dịka onye nọ n'ọchịchị.

Ndị ọzọ ụlọikpe ahụ mara ikpe gunyere onyesis ụlọọrụ ngaraba ọba ego bụ Ireneo Mangue Monsuy Afana, nakwa Rubén Félix Osá Nzang, Carmelo Julio Motogo Ndong, Rolando Asumu Ndong Oyé na Florentina Iyanga Iñandji.

Cheta na Baltasar Ebang wuru ewu n'afọ garaaga mgbe onyonyo ya na ọtụtụ ụmụnwaanyị gbasara na soshal mịdịa.

Ihe ị kwesịrị ịma maka etu ihe onyonyo Baltasar Engonga si gbaa n'anwụ

Baltasar Engonga

Ebe foto si, Baltasar Engonga/Facebook

Baltasar Ebang Engonga bụ onyeisi ngalaba na-enyocha mpụ na nrụụaka ego na mba Equitorial Guinea ka aha ya na-akpọtụ dịka ọtụtụ ihe onyonyo ebe ya na ọtụtụ ụmụnwaanyị nọ n'ọnọdụ dị aghaa nke kpalitere asịrị ka ibe ya n'intaneti n'Afrịka niile.

Ihe onyonyo ndị a bụ ihe a chọpụtara dịka otu gọọmenti hibere maka inyocha Engonga maka ebubo nrụrụaka ụtụisi gara n'ụlọ Baltasar.

Dịka ha ruru n'ụlọ ya nakwa ụlọọrụ ya, ha chọpụtara ihe onyonyo karịrị narị anọ (400) nke gosiri Baltasar Ebang Engonga na ụmụnwaanyị dị iche iche na-emekọ.

Ụfọdụ ụmụnwaanyị gosiri n'ihe onyonyo ahụ gụnyere nwunye ndị welitara isi na ndị a ma ama na mba ahụ.

Oge a gbara ya ajụjụ ọnụ, Baltasar kwuru na ọ natara ụmụnwaanyị ahụ ikike ka o mee ihe onyonyo ebe ha na-emekọ.

Baltasar na ụmụnwaanyị ahụ nwere mmekọ ahụ ebe dị iche gụnyere ụlọ oriri na ọṅụṅụ, ụlọọrụ ya nakwa ụlọmposi.

Baltasar Engonga: A chụọla nwoke Equitorial Guinea a n'ọrụ maka ebubo ịgba ọtụtụ ụmụnwaanyị okoso

N'aka nke ọzọ, akụkọ na-erụ anyị ntị na-ekwu na ndị ọ dịị n'aka achụọla otu nwoke n'isi akụkọ dịka akụkọ ifo na-efegharị na soshal midia maka nwoke a na-ebo ebubo idina ọtụtụ ụmụnwaanyị gụnyere ndị nọ na di n'ọrụ na mba Equitorial Guinea.

A chụrụ Baltasar Ebang Engonga dịka onyeisiala mba ahụ mabụrụkwa nwanne nnanna Engonga bụ Teodoro Obiang Nguema binyere aka n'iwu ka e mee nke a.

Engonga, bụ onye a na-etu "Bello" n'ihi oke mma ya mabụrụ onye ji nwaanyị bụ onye ihe onyonyo ebe ọ na-agwọrị ụmụnwaanyị ụfọdụ n'ime bụ nwunye ndị ọrụ Bekee welitere isi na ndị ọrụ Ministri na-ahụ maka ego na mba ahụ gbara n'anwụ na nso nso a.

A na-eche na agwa Engonga kpara nwere ike imetụta nna ya bụ onye a na-eche ga-eso zọọ ọkwa onyeisiala.

Ntaramahụhụ ndị nwere ike ịdịrị Baltasar n'Equitorial Guinea

Baltasar Ebang Engonga

Ebe foto si, Baltasar Ebang Engonga

Osote Onyeisiala Guinea bụ Teodoro Mangue ekwuola na onye ọrụ ọbụla e jidere na-eme mmekọahụ n’ụlọrụ, ga-enweta ntaramahụhụ kpụ ọkụ n’ọnụ.

Nke a n’abịa dịka vidio mmekọ ahụ Baltasar Ebang Engonga na ọtụtụ ụmụnwaanyị akụkọ kwuru na ha bụ nwunye ndị a ma ama fesara na soshal midia.

Baltasar Ebang Engonga bụ onyeisi ụlọọrụ National Financial Investigation Agency ma bụrụkwa nwanne Onyeisiala mba ahụ.

Ozi Mangue wepụtara n’aka sochal midia X kwuru na "Ha na-aga n'ihu ịkwụsịtụ ndị ọrụ niile na-eme mmekọ nwoke na nwanyị n'ụlọ ọrụ ministri mba ahụ ọrụ”.

Mangue gbakwụnyere sị na Gọọmenti ga-enye onye ọbụla e jidere na-eme nke a n’ihi na ọ bụ ihe megidere iwu ọrụ mba Guinea.

Ọ gara n'ihu kwuo na amalitela itinye igwe kamera n'ogige ụlọọrụ dị iche iche ma dọọ aka na nti ka ndị ọrụ sepụ aka n'ihe ọbụla megidere iwu obodo.

Baltasar Engonga

Ebe foto si, Baltasar Engonga/Facebook

Nkọwa foto, Baltasar Engonga

Ọkaikpe Kachasị na Equitorial Guinea kwuru na ọ bụ eziokwu na Baltasar Ebang Engonga nwetara nkwado ụmụnwaanyị ahụ tupu o mee vidio ahụ fesara ebe niile mana e nwereike ịkpụpụ ya ụlọikpe mpụ ahụike ọha ma ọ bụrụ na a chọpụta na o bu ọrịa na-efe efe.

Ọkaikpe ahụ gara n’ihu kwuo na nkea bụ atụmatụ gọọmenti wepụtara iji hụ na onye ọrụ ọbụla rubere isi nye iwu obodo, rụọ ọrụ etu okwesịrị ma kwanyere ndị ọrụ ibe ha ugwu ruru ha.

Osote Onyeisiala Teodoro Mangue amachiela mmekọahụ dị n’etiti ndị ọrụ n’ibe ha ma gwa ndị ọrụ ka ha tinye uche ha niile n’ọrụ ha bịara ịrụ.

Ọ gara n’ihu kwuo na e nwere iwu dị maka onye ọbụla e jidere na-eme mmekọ ahụ n’ụlọrụ mba ahụ.

Onye bụ Baltasar Engonga?

Baltasar Ebang Engonga bụ onye welitere isi no gọọmenti mba Equitorila Guinea ma bụrụkwa onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọ gbara afọ iri ise na anọ (54).

Ọ bụbu onyeisi ụlọọrụ na-eme nnyocha maka nrụrụaka ego National Agency for Financial Investigation (ANIF).

O bidoro ọrụ gọọmenti n’afọ 1998 oge a họpụtara dịka minista na-ahụ maka agụmakwụkwọ.

Baltasar Ebang Engonga bụ nwa Baltasar Engonga Edjoo onyeisi ụlọọrụ Economic and Monetary Community of Central Africa (CEMAC).

Ọ lụrụ nwaanyị ma mụta ụmụaka isii (6).