Ị ma na 'Soursop' na-agwọ ọrịa dị icheiche n'ahụ? Lee ha ebe a

soursop

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Michael Ilediagu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

E nwere otu mkpụrụ osisi na-enyere ndi nwere ọrịa dị icheiche aka, ọ kachasị ndị na-arịa ọrịa akpụ (cancer) nakwa ọrịa shuga na ndị ọzọ.

Ndị Igbo na-akpọ mkpụrụ ọsịsị ahụ ‘shawansọp’ mana ndị bekee kpọrọ ya ‘soursop’.

Ọkachamara n’ihe gbara nrị na ahụike bụ Gideon Bassey kọwara ọtụtụ uru dị icheiche soursop bara nakwa ọnọdụ ahụike mmadụ nwereike iji mkpụrụ ọsịsị ahụ were nyere onwe ya aka.

Gideon Bassey kwuru na ya na-agwa ndị nwere ọrịa dịka ọsa, ọrịa shuga, nakwa ọrịa akpụ (cancer) na ọrịa ndị ọzọ dị icheiche ka ha na-ata soursop.

Bassey kwuru na mkpụrụ osisi ahụ ma akwụkwọ ya na-enyere aka akwalite ahụike ndị were ọrịa ndị ahụ.

Bassey kwuru na soursop were ọtụtụ uru dị na ya dịka mkpụrụ osi.

Nke mbụ bụ na o weghị nnukwu ọtọbịrịbịrị n’ime ya. Ọzọ bụ na o nwere vịtamin-B n’ime ya nakwa vịtamin ndị ọzọ.

Bassey kwuru na “soursop na-eme ka akpụ si n'ọrịa akpụ kpọnwụọ ma kwụsị ya ị na-amụba.

O kwuru na “Soursop adịghị agwọ ọrịa akpụ (Cancer) ọlaa mkpamkpam, mana ọ ga enyere ndị nwere ọrịa ahụ aka nke ukwu ma kwụsị ọrịa ahụ ị na-amụba”.

Soursop na mkpụrụ osisi ndị ọzọ

Ebe foto si, Getty Images

Ụzọ 'shọwanshọp' si edozi ahụ gị

Gideon Bassey kwuru na soursop were ọtụtụ vịtamin ọkachasị vịtamịn B na-enyere aka n’ịgwọ ọrịa dị icheiche.

Ọ sịkwa na o nwere vitamin C na-enyere ahụ aka ịdọzị akpụkpọ ahụ, ịwụlite ahụike nakwa ịme ka ọnya laa n'oge.

O nwekwara ihe Bekee kpọrọ "antioxidants" bụ ihe dị n'ime ahụ na-edozi ma na-echekwa akụrụndụ pụtara 'cell'.

"Ọ bụrụ na ị nwere 'ulcer', ọ bụ otu mkpụrụoisi anaghị akpalite ulcer" ka o kwuru.

N’okwu Bassey “e nwere ọgwụ e si na mkpụrụ soursop emeputa a kpọrọ ‘graviola’.

“e jikwa akwụkwọ soursop ebelete ọrịa ọtọbịrịbịrị dị n’ọbara”.

Gideon gara n’ihu kọwaa ka ndị nwere ọrịa ndị ahụ ga-esi rie soursop.

“ị were akwụkwọ soursop, tinye ya na mmiri, ị sie ya n’ọkụ ma na-aṅụ mmiri ya. Ọ ga-enyere aka beleta ọtọ bịrịbịrị dị n’ọbara gị”.

Ọ bụrụ na ịbụ onye na-agbara shuga ọsọ, ịnwereike i ri 'soursop' ka i si chọọ n'ihi na o nweghi shụga n'ime ya.