Kedụ ihe jikọrọ ndị Igbo na ndị Ịgala?

Aha onyonyo, Ị ma Igbo na ndị Igala nwere ọtụtụ ihe jikọọ site n'oge gboo?
Kedụ ihe jikọrọ ndị Igbo na ndị Ịgala?

Ndị Igbo ụfọdụ nwere nkwenye na ọ bụ nna nna ha ochie bụ Eri mụtara nwa zọpụrụ ije gawa Eri dị na Kogi steeti, ebe ndị ndekọ ihe mere mgbe ochie n’ala Igala na-ekwu na ha esighị Igbo kama na Igbo si na mpaghara ahụ pụta.

Ayegba Abdullahi Ayegba bụ onye nnọchiteanya alaeze Igala gwara BBC na mkparịtaụka na e nwere ọtụtụ ihe jịkọrọ Igbo na ndị Ịgala nke mere ndị ọkammụta ihe mere mgbe ochie ji arụtụ aka na agbụrụ abụọ ndị a bụ nwanne.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Ihe ndị a gụnyere njem mbiri (migration) nke butere inwe ndị Igala n'Ọwụwa Anyanwụ, ọkwa Ọkpara n'Igbo nakwa n'Igala, ọkwa 'Agaba idu', Egwu Afia', okwu Igbo asụsụ, mmemme omenala (preharvest season), uchu ero, alụsị (Spiritual worship), inye na ịwa ọjị, ejiji: ịma akwa abụọ na ike agwa n'olu, ikpu okpu uhie dgz.

Igbo na Igala nwere ihe yiri ibe ha

Mana Ọkammuụta Igbo na mahadum University of Lagos' bụ Chigozie Nnabuife ekwenyeghị na Igbo si n'Igala pụta .

O kwuru na ndị Igbo anọrọla ebe ha nọ ugbua kemgbe chi ji kee ụwa kama n'ụfọdụ ha zọpụrụ ihe gawa ebe ndị ọzọ dị iche iche.

O kwetara na njem biri bụ ihe jịkọrọ Igbo na ndị Igala.

Kirie ihe onyonyo a ka ịghọta okwu a n'uju.

Uche Akolisa dere akụkọ a, ebe Nnamdi Agbanelo haziri ya.