Haiti, Barbados, na mba ndị ọzọ n'ụwa si agbụrụ Igbo pụta

Ndi Haiti

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos

N'ime agbụrụ atọ kachasị na Naijiria; Hausa, Igbo na Yoruba, ha niile were anya na ha nwere ibe nne na mba ndị ọzọ.

Ndị Hausa nwere umunne na mba Nijie na Chad, ndị Yoruba nwere umụnne na Dahomey (Benin) nakwa Togo, ebe ndị Igbo dịka nwa enwe nwanne na mba ụwa.

Mana nke a abụchaghị eziokwu, e nwere ndị bu ọbara Igbo na mba ndị ọzọ dịka Jamaica, Barbados, Haiti, dgz.

Mba ndị a bụ ebe ndị Igbo gbasara ka ụkpaka tupu ndị ọcha abịa chịwa ndị ojii.

Mana ndịiche dị na Igbo nọ n'ụlọ na ndị agbụrụ ndị ọzọ bụ na ọtụtụ ndị ahụ anọrọla na mba ndị ọzọ gboogboo, ebe ndị Igbo nọ n'ofesi bụ ndị mbịarammịara.

Dịka Ọkammuta Igbo na mahadum 'University of Lagos' bụ Gozie Nnabuife kwuru na "Ebe ndị Igbo nọ ugbua n'Ọdịda Anyanwụ Afrika bụ ebe ha nọwara kemgbe ụwa."

"Akụkọ na ha si na agbụrụ ndị Juu abụghị eziokwu."

1. Barbados

Barbados

Ebe foto si, Getty Images

Barbados bụ mba mmiri gbara gburugburu na Carbbean nke isi obodo ya bụ Bridgetown nke mba Briten chịburu.

Akụkọ kwuru na ọtụtụ ndị Igbo a gbatara n'ohu n'Afrịka, mechara nwere onwe ha, bịa gbasaa gaa Barbadọs.

Onye dịka Olaudah Equiano, bụ onye Igbo a ma ama a gbara n'ohu n'ala Igbo buga ya Virgina, soro na ndị Igbo weere ọnọdụ na mba ahụ.

A na-ekwu na ọtụtụ ndị Barbados bụ ndị a nwụchiri ree n'ohu site n'etiti '17th Century' n'ebe a kpọrọ Bight of Biafra, bụ ebe Igbo bi ugbua.

2. Jamaica

Jamaica

Ebe foto si, Getty Images

Ọtụtụ ndị Igbo nọ na Jamaica bụ ndị ọcha gbatara ha n'ohu site na ebe 1750 rue 1807.

Ọ bụ n'oge a ka mba Briten machiri ịtụ mgbere ohu, buruzie ndị ohu ahụ n'ụgbọmmiri buga ha n'ugbo ebe ha na-arụrụ ha ọrụ.

Na Jamaica, a na-akpọ ha ndị 'Ibo' maọbụ 'eboe' .

N'ihi na ọtụtụ na-acha ọcha, e nyere ha aha 'red eboe'.

Egwu, okpukperechi nakwa nri ndị Jamaica na-eri gosiri na ha na ndi Igbo nwere ihe jịkọrọ ha.

3. Haiti

Ndi Haiti

Ebe foto si, Getty Images

Ndị ọzọ sọrọ ṅụrụ mmiriara Igbo bụ ndị mba Haiti.

Mba a dị nso na Dominican Republic malitere site na ndị ohu si Afrịka.

Akụkọ ihe mere mgbe ochie na-ekwu na ọtụtụ ndị ohu ndị Igbo hụrụ onwe ha na mba Haiti dịka ha nweere onwe ha site n'aka ndị zụrụ ha n'ohu.

Otu okwu a na-ekwukarịị n'olu Haiti bụ "Nou se Igbo" nke pụtara, anyị bụ Igbo.

Ọzọ, ndị Haiti nwere ọtụtụ chị ha na-ekpere dịka ndị Igbo n'okpukperechi ha nke a kpọrọ 'vodou' bụ ihe yiri nke Igbo.

Egwu ndị Igbo Haiti na-adakwa ka nke Igbo.

4. USA

Aha onyonyo, Obi dị m ụtọ na abụ m onye Igbo - Bishop T.D Jakes

Ọtụtụ ndị isi ojii bụ ndị Amerika, ndị Bekee kpọrọ 'African-Americans', ọkachasị ndị nọ Virginia na Maryland, bụ ụmụafọ Igbo bụ nne na nna ha ochie.

E nwere ọtụtụ ndị isi ojii ndị America mere nnyocha mmiri ahụ (DNA) nke gbara ama na ndị mụrụ ha bụ ndị Igbo.

Ndị dị otu a gụnyere: TD Jakes (onye oziọma a ma ama), Quincy Jones (otiegwu a ma ama), Forest Steven Whitaker (ome ihe ejije a ma ama), na ndị ọzọ

Akụkọ kwuru na ọ bụ ndị Igbo tinyere 'okra' (ọkwụrụ) n'okwu Bekee ndị Amerịka.

5. Equitorial Guinea

Ndị na-eme mmemme omenala

Ebe foto si, Getty Images

Ndị Igbo nọkwa na mgbago Ugwu mba Equitorial Guinea dị n'Ọdịọ̄a Anyanwụ Afrịka n' obodo Bioko bụ ala mmiri gbara gburugburu ebe a mabu dịka Fernando Po.

Ụfọdụ ha bụ ndị ahịa si ỌDịọ̄a Anyanwụ Afrịca bịa, ebe ụfọọ̄ụ bụ ndị agbara n'ohu nwwere onwe ha ma bịa gwunye na 'ebe ahụ.

Igbo bụ pasent asaa n'ọnụọgụgụ ndị mba Equitorial Guinea.

Akụkọ kwuru na ọ bụ ụfọdụ ndị Igbo si Arochukwu( di n'Abịa steeti taa) na-azụ ahịa gara ebe ahụ oge gboo oge Igbo na ndị Potụgiz na-azụkọ ahịa ga biri, ha anataghịzị.

Cheta na n'oge Agha Biagra, ụlọọrụ ndị otu ọrụ ebere nyere ndị Bịafra aka si Equitorial Guinea f mere ebe ha si efebata nkwari nri na ọgwụ ha ji gbatar ndị Biafra ọsọ enye maka oge ọgụ.

Akụkọ ga-amasị: