Chinmark Group: Etu ndị ego tọrọ na Chinmark si degara onyeisi uweojii Naijiria akwụkwọ mkpesa

Ebe foto si, Marksman Chinechu Ijioma
Ndị ego ha tọrọ n'aka ụlọọrụ Chinmark Group nke Marksman Chinedu Ijiomah hiwere edegarala onyeisi uweojii Naijiria bụ Usman Alkali Baba akwụkwọ mkpesa.
Nke a na-abịa dịka akụkọ na-efegharị na soshal midia na-ebo ebubo na Marksman Chinedu Ijiomah ji ụlọọrụ ya bụ Chinmark Group napụ ọtụtụ ụmụ Naijiria ego n'ụzọ aghụghọ, gbalaga.
Ọ bụ ụlọ ọkaiwu 'Relief Law Chambers' dị na Pọtakọt zigaara onyeisi ndị uweojii akwụkwọ mkpesa a n'ụbọchị 25 nke ọnwa Maachị afọ 2022, n'aha ndị tinyere ego ha n'ụlọọrụ Chinmark Chinmark Group.
N'akwụkwọ mkpesa a, ha na-ebo Ijioma na ndị ọzọ ebubo igwu ha chadum ego dị ijeri Nairia iri abụọ.
Onyeisi ụlọọrụ 'Relief Law Chambers' bụ Ọkaiwu Clinton Biragbara gwara BBc Igbo n'ekwenti na ha degara onyeisi ndị uweojii akwụkwọ mkpesa ahụ n'eziokwu.
Mana o kweghị enye anyị nkọwa miri emi gbasara ya n'ihi na "anyị achọghị ịgba n'anwụ ụzọ anyị chọrọ iji nweta ikpe nkwụmọtọ".
BBC Igbo nwetara akwụkwọ mkpesa ahụ nke kwuru na Marksman Chnedu Ijioma na ndị otu ya ji aha ụlọọrụ dị icheiche wee napụ ha akatamkpo ego.
Aha ụlọọrụ ndị a gụnyere: Chinmark Homes And Shelters, na Chinmark Suites and Resident Ltd.
Ndị ha kpọrọ aha so tinye aka napụ ha ego n'aghụghọ n'aha Chinmark Group bụ Amanda Chisom, Harrison Gwamnishu, Ezinne Azu, Chima Fortune nakwa Sharon Ubani.
Ndị ọzọ gụnyere; Madu MaryJane-Ogechi, Loveth Nwizu,Adaobi Okorie, Eby Amada Pius Urum bụ ndị Chinmark ji were dọta ọtụtụ ndị mmadụ.
Ha boro ebubo na Ijiomah na ndị otu ya ji ire ụtọ napụta ha ego ndị a ma kwe ha nkwa iwu ogige ụlọ obibi (Estate) ha ga-enwekọrịta, tinye ndị mmadụ ma na-anakọta ụgwọ ụlọ.
Akwụkwọ mkpesa ahụ sị, "Ndị sị ka anyị nọchite ha kwunyere ego dị iche iche n'aka ndị a a na-enyo enyo, chee na ha na-akwụ ụgwọ ụlọ dịka ndị nwetara oke na Chinmark Estate."
"Chinmark jụrụ imejupụta nkwa ha kwere inye ndị anyị na-anọchite bụ ndị ha duhiechara, ghọrịa sị na ha bụ ụlọọrụ na-ewu ụlọ, dịka ha kwunyechara ego n'ọbaego ha."
Ha gara n'ihu bekuo onyeisi Uweojii ka ụlọọrụ nchekwa ndị ọzọ gbatara ha ọsọ enyemaka site na inyọcha Ijiomah na ndị otu ya bụ ndị ha boro ebubo ịchọ ịgabapụ na Naijiria.
Cheta na BBC Igbo na Chinedu Marksman Ijiomah nwere mkparịtaụka n'ọdị nso a ebe ọ nọrọ kwuo na ọ bụghị eziokwu na ya na-achọ ịgba ọsọ pụọ na Naịjirịa.
O kwuru na ya ga-akwụ ndị mmadụ ụgwọ ha ma ha nye ya ohere ọnwa asaa.
N' aka nke ọzọ Amanda Chisom, onye e ji ihu ya reere 'Chinmark Investment' ahịa gwara BBC Igbo na ya chere na ihe ọ na-eme kwụ ọtọ nke mere ya ji gwa ndị mmadụ ka ha tinye ego ha.
Ọ gara n'ihu kwuọ na ebe ọ kwụ ugbua bụ ịhụ na ọ gbara mbọ etu ike ya ruru, ịhụ na ndị mmadụ nwetara ego ha..
Harrison Gwamnishu n'onwe ya kwuru na "O nweghị onye ọbụla m kpụrụ n'aka ka o tinye ego ya n'ụlọọrụ Chinmark," kama ha hụrụ "ihe Chinmark nwere n'ebe dị icheiche ga-enwe mmasị itinye ego ya n'ụlọọrụ ahụ."

Ebe foto si, Clinton Biragha

Ebe foto si, Clinton Biragha

Ebe foto si, Clinton Biragha
Chinmark Group: Ihe ise mere ụwa ji kpụrụ 'Chinmark Group' n'ọnụ ugbua

Ebe foto si, Marksman Chinedu Ijiomah Facebook/SEC WEBSITE
Otu onye ọrụ na-arụrụ Marksman Chinedu Ijiomah bụ onyeisi Chinmark Group , na-achọghị ka-akpọ aha ya ekwuola ihe ha na-agabiga ugbua n'aka nwa amadi ya ugbua.
Chinmark na-ewu kamgbe na soshal midia maka etu ndị mmadụ si pụta na-ekwu na o kweghị akwụ ha ụgwọ o ji ha dịka ụfọdụ n'ime ha tinyere ego ha n'ụọahịa ya iji nweta isi ego na ọmụrụ nwa.
Onye ahụ kwuru na kamgbe mbido afọ 2022 ka ya na ndị ọzọ na-arụrụ Chinmark ọrụ bidoro hụwa mgbanwe agwa n'ebe Ijiomah nọ.
N'ọnụ, onyeisi anyị kwụsịrị iza ekwenti ya ma anyị kpọọ ya, anaghị ekwe ka anyị bata n'ime ogige ụlọọrụ Chinmark kamgbe mbido afọ 2022.
O kwuru na nya bụ ihe gbagojuru ha anya makana o gosila anyị ọtụtụ ihunanya tupu ugbua.
Onye ọrụ ya ọzọ kwuru na o bidoro rụwara Chinmark Group ọrụ n'afọ 2020, mana eruru nq mbido afọ 2022, ndị isi ụlọọrụ ahụ kpọọ ya na ụfọdụ ndị otu ya, si ha kwụsị ọrụ.
Ọ gwara BBC Igbo na ihe ụlọọrụ Chinmark gwara ha bụ na ha na-aga obere ezumike nakwa ha ga-akpọghachite ha n'oge na-adịghị anya.-
Ọtụtụ mmadụ pụtara n'elu soshal midia na-ekwu etu Ijiomah si gwuo ha chandum site na ịnakọrọ ha ego ha ma jụụ ikwụ ha ụgwọ mgbe o kwere nkwa ịkwụ ya bụ ụgwọ.
Ihe ndị mere ụwa ji kpụrụ Chinmark Group n'ọnụ ugbua
Cheta na Marksman Chinedu Ijiomah eji Chinmark wee mara pụtara n'onyonyo o tinyere n'akara Facebook rịọ ndị oji ego achụ ego dọnyere ụloahịa ya ukwu ka ha nwee ndịdị nwa mgbe nta.
Arịrịọ Chinmark na-abịa n'elu okwu pụtara na social media ebe ọtụtụ mmadụ kwuru na o ji ha ụgwọ dịka ha tinyere ego ha n'ụlọahịa ya, iji chụta uru n'elu ego ha.
Chinmark Group bụ aha e ji mara ngalaba nwa amadi Ijomah nke o hibere iji nye ndị mmadụ ohere ka ha wete ego ka o jiri ya na-azụ ahịa ma na-enye ha ọmụrụ nwa n'elu ego ha, dịka Ijomah si depụta n'akara Faecbook ya.
Kedụ ka mmiri si gbaruọ?
Marksman Chinedu Ijomah depụtara n'akara facebook ya, na ngalaba Securities & Exchange Commission (SEC) machiri ọba ego Chinmarks Group kamgbe ụbọchị December 21, 2021.
O kwuru na kamgbe ahụ, na ọ bụ sọ mmadụ narị ise n'ime mmadụ pụku anọ na ụma (4966) ka ọ kwụnwụrụ ụgwọ ha tinyere na nwulite ụlọahịa Chinmark iji rite ọmụrụ nwa ego malite na March 16, 2022.
Mana ụfọdụ ndị mmadụ tinyere ego na Chinmark na-ekwusike na Ijomah egwuola ha chandum site na ịji ndị otimkpu ya lafuo ha ma nakọrọ ha ego ha.
Otimkpu Chinmark ụwa kpụ n'ọnụ ugbua bụ Amanda Chisom bụ onye na-ahụ maka mmekọrịta mmadụ na ọha nakwa Harrison Gwamnishu bụkwa onye ọnụ na-eru n'okwu.
Naanị Amanda ka anyị hurụ ihe gbasara Chinmark n'akara Facebook ya mana onwebeghị ihe anyị hụrụ Gwamnishu depụtara maka Chinmark n'akara Facebook ya.
Lee ihe ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu maka Amanda Chisom bụ otimkpu Chinmark:
Ngalaba Securities & Exchange Commission (SEC) nke Naịjirịa depụtara n'ọba ozi webụsaiti ha akwụkwọ ozi katọrọ atụmaatụ oji ego achụ ego nke ụlọahịa Chinmark Group.
Akwụkwọ ozi ahụ bu deeti December 25, 2021 dọrọ ndị mmadụ aka na nti ka ha mata na Chinmark group nke nọ n'okpuru aha Fin Africa Investment Limited edenyeghị aha azụmahia ya n'akwụkwọ SEC ma na-ekwu na onye ọbụla ya na ha na-emekọ ihe , ihe ọ hụru ya jiri isi ya buru.

Ebe foto si, Sec website
Akwụkwọ ozi ahụ kwukwara na SEC akwadoghị udiri atụmaatụ azụmahia Chinmark na-eme.
Agbanyeghị mmiri ọkụ a niile na-asụ maka okwu a, Ijiomah apụtala na-ekwusi ike na onweghị ihe mere ego niile o ji ndị mmadụ nakwa ọ na-agba mbọ ihu na onye ọbụla nwetere ego ha.















