Buhari's Visit: Ihe atọ Onyeisiala Muhammadu Buharị na-abịa ịme na Legọs

Ebe foto si, Presidency
A na-atụ anya na Onyeisiala Muhammadụ Buharị ga-agba ọkpa na Legọs ta bụ Tuzde ịbịa mepee ihe ndị ụfọdụ gọọmentị na ndị nkịtị rụrụ ebe ahụ bụ nke ga-enyeaka na mepe obodo.
Otu n'ime ihe ndị ọ ga-achabi ụdọ ya taa bụ ụlọorụ nke Dagote Fertilizer Plant nke Dangote ruru ọhụrụ na steeti ahụ.

Ebe foto si, Presidency
Ọzọ bụ mpaghara ọhụrụ nke ọdọụgbụelu Murtala Muhammedi e si efepụ mba ofesi nke.

Ya bụ ebe a na-arụpụta ihe e ji akọ ugbu Bekee "Fertilizer" bụ Dangote Groups Fertilizer Plant bụ ya kacharị n'ụwa niile dị na Lekii, dị na Steeti Legọs.
Ụlọọrụ ahụ ga-arụpụta ihe dịka Fetilaịza nde atọ kwa afọ ma ọ malite ọrụ.

Ebe foto si, Presidency
N'otu aka ahụ, Buharị ga-eji otu okwute gbagbuo nnunu abụọ na njem a site n'ịga mepe Lekki Deep Sea Port.
Ọ ga-abụ ọdọụgbọmmiri kacha mie emi na Naịjirịa mgbe a ruchara ya,
A sịkwa na ọ ga-abụkwa ọdọgbọmmiri kacha mma n'Afrịca.

Ebe foto si, Presidency

Ebe foto si, Presidency
Mgbe ịkpeazụ Buharị bịara Legọs bụ Tọzde, ọnwa Disemba afọ 2021 mgbe ọ bịara mepee ọrụ ndụ Nigerian Navy gụnyere ụgbọmmiri ndị agha.
Gọomentị steeti Legọs sị na ga-emechị ụfọdụ ụzọ maka ndị njem iji benata kpachịchị n'ụzọ Buharị ga-esi gafee.
N'ọnwa Juun nke 2021, Buhari bịara mepee ụzọ ụgbọoloko na Ebute Meta nke siri Legọs gawa Ibadan nke ndị Nigerian Railway Corporation.
Ihe ndị a ka ụfọdụ kwenyere na ọ bụ mmezu nkwa Buhari kwere mgbe ọ na-achụ nta vootu ya.
Njem onyeisiala na Legọs - Gọọmentị ekwuola na ha ga-emechi ụzọ ụfọdị ebe o ga-esi agafe
Njem onyeisiala na-abịa na Legọs malite n'elekere asatọ nke ụtụtụ Tuzde. ruo elekere iri na abụọ nke ehihie.
Kọmishọna njem na steeti Legọs ekwụọla na ha ga-emechị ụzọ ụfọdụ maka ebe onyeisiala Muhammadụ Buhar ga-esi agafe.
Frederic Oladeinde sị na nke ga-eme ka ụgbọala kwesiri isi ụzọ ndị ahụ gbaa ụzọ ọzọ.
Oladeinde sị na ụgbụọala is Apapa/Oshodi ga-esizi Agege Motor Road banye PWD na Works Road maọbụ General Adeyinka Adebayo Road were abanye Oba Akinjobi gawafia Ikeja General Hospital were gawa ụzọ gara ọdọụgbọelu nke ime obodo Naịjirịa.
Ụgbọala sikwanụ Agege Motor Road nwereike ịgba Charity akụkụakụkụ nke si Armed Resettlement Centre, gbugharịzịa n'ime banye Shogunle pụta PWD, gawazia.
Ọ sị na ndị ọrụ trafliki ga-anọ n'ụzọ ndị a nille ịgbaziri ndị mmadụ ụzọ.
Ndi na-eji ọgba tum tum eziga ozi emeela ngaghariwe na Port Hacourt

Ndị na-eji ọgba tum tum ezigara ozi na-eme ngahariwe iwe maka mmachi gọvanọ Rivers steeti bụ Nyesom Wike machiri ha.
A machiri ndị a n'ụbọchị Jenụwarị 10, 2022.
Onye akpọrọ Rivers steeti Camp Commandant , S.P Irikefe Owen kwuru na a chọpụtara ụfọdụ ndị ọgba tum tum a ji ya eme mpụ mere e ji machie ha mana a ga-eleba ya anya.
Ndị a na-eji ọgba tum tum kwukwara na gọọmenti na-ebvo ha ebubo na ha esoghị usoro eji edebanye aha maka iji ọgbatum tum ha, mana ha na-ekwusi ike na ha mere ihe niile iwu kwadoro maka ọrụ ha.
Amuche Author Chijioke bụ onyeisi ndị ọgbatum tum na-eziga ozi na Rivers steeti kwuru na gọọmenti steeti ahụ ekwela nkwa igwa ya na ndị otu ya okwu n'ihe erughị otu izu ụka.
Gịnị bu orụ ndị na-eji ogbatum tum eziga ozi bekee kpọrọ Logistics?
Ọ bụghi taa ka anụwara na ndị mmadụ na-eji ọgba tum tum eziga, bụgharịa maọbụ kesaa ngwa ahịa ha maọbụ ngwo ngwo ha ji arụ ọrụ.
Ụfọdụ na-eji ụgbọala, ụgbọelu, gwongwolo maọbụ ọgbatum tum eme nziga ngwa ahịa maọbụ mbụgharị ya.
Nke kacha ewu ugbua bụ ọgba tum tum makana ndị na-azụ ahịa na teknụzụ jizi ya eziga ozi ihe ndị mmadụ tụmadị ndị ntoroọbịa goro na ọba ahịa teknụzụ ha.









