Real Estate Investment in South-East Nigeria: Etu ị ga-esi zụta ala n'ala Igbo ma rite uru

Real Estate Investment in South-East Nigeria: Uru dị n'ịzụ na ire ala na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ
    • Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist Igbo
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

N'izuụka ole na ole gara aga ka NwadaIgbo Uche Jumbo kwuru okwu sị na itinye ego n'azụmaahịa ala (Real Estate Investment) na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naijirịa (in South-East Nigeria) na-aghọ ahịa.

Ọ sị na oke ala atọ ọ zụrụ n'Aba afọ asatọ gara aga, na o ji ego dị nde naịra atọ (N3.8m) na ụme ree ya ugbua mana nke ọ zụrụ na Legọs n'otu oge ahụ na o rere ya nde naịra iri anọ na ise (N45m).

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Nke a mere ka ọtụtụ ndị mmadụ ji na-akatọ ya ebe ndị ọzọ sị na ọ bụ eziokwu ka o kwuru.

Mana BBC Igbo gbara ụfọdụ ndị na-ere ala nakwa ụlọ na mpaghara Ọwụwanya Anyanwụ ka tinye ọnụ n'okwu a.

Kedụ ihe ndị na-ere ala n'Ọwụwa Anyanwụ kwuru?

Awka

Real Estate Investment in South-East Nigeria: Uru dị n'ịzụ na ire ala na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ

Ebe foto si, Iwaria

Ọzọ Okwudiri Nwude bụ onye na-ahụ maka ire ala nke bụ in Real Estate Investment nakwa ụlọ n'Awka dị n'Anambra Steetị sị na o nweghi ọghọm dị n'ire nakwa ịzụ ala n'Ọwụwa Anyanwụ.

Ọ sị na ịzụ ala dị mma karịa itinye ego n'ụlọakụ maka na ụlọakụ agaghị enye gị ọmụrụ nwa mana ị zụọ ala taa ọ ga-amụtara gị nnukwu nwa echi ma ị chọrọ ire ya.

Ọ sị na onye zụrụ ala n'ebe dịka Mgbakwu maọbụ Ebenebe dị n'Awka North n'ọnụego dịka pụkụ naịra 200, na ọ chọrọ ire ya n'afọ atọ na o nwereike ire ya puku naịra 350.

Real Estate Investment in South-East Nigeria: Uru dị n'ịzụ na ire ala na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ

Ebe foto si, Getty Images

Mana ọ bụrụ ebe dịka Awka South zụọla n'ọnụego puku naịra 300 na o nwereike ire ya ihe ruru otu nde (N1m) n'ime afọ abụọ.

Nwude sị na ihe mere ala ji adala ọnụ bụ n'ihi mmepe ebe ala ahụ dị, na ọ bụrụ na a malite ịrụ ụlọ maọbụ ụzọ, na ala niile dị na gburugburu ebe ahụ ga-adala ọnụ.

N'iji maa atụ, ọ sị na ọ zụrụ ala n'ebe 'Road Safety' dị n'Awka n'ọnụego nde naịra atọ na ụma (3.5m) n'afọ 2016 mana ugbua na ihe a na-ere ala ebe ahụ ugbua bụ nde naịra iri na abụọ (N12m).

Nwude sị na etu ka ire na ịzụ ala dị na mpaghara dị iche iche n'Ọwụwa Anyanwụ.

Enugwu

Real Estate Investment in South-East Nigeria: Uru dị n'ịzụ na ire ala na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ

Ebe foto si, Chibuike Wogu/Facebook

N'otu aka ahụ Chuma Ezealigo na-ahụ maka ịzụ nakwa ire ala n'Enugwu sị na ihe dị mkpa bụ inwete ndị maara anya ala tupu mmadụ azụọ ala.

Na onye kwuru na azụmaahịa ire na ịzụ ala adịghị eme nke ọma, nwere na onye ahụ anaghị erute nso maara ihe a na-akọ.

Ezealigo sị na ọnụego iji ree maọbụ ịzụ na-ada bụ site na etu mpaghara ala ahụ dị jiri mepee emepe.

Real Estate Investment in South-East Nigeria: Uru dị n'ịzụ na ire ala na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ

Ebe foto si, Chibuike Wogu/Facebook

N'iji maa atụ, ọ sị ndị zụrụ na 'zoo estate' dị n'Enugwu n'afọ ise gara aga zụrụ ya nde naịra iri anọ (N40m) mana ihe a na-ere ya ugbua bụ otu nde narị naịra (100m) ma ọ bụrụ na ị hụ ahụ.

Ọ sị na ego ole a zụrụ ala na 'golf estate' n'afọ ise gara aga bụ nde naịra atọ na ụma (N3.5m) mana ugbua ala na-adazi ihe dịka nde naịra iri atọ (N30m).

Ọ sị na o nweghi onye zụrụ ala n'Enugwu ugbua na-agaghị ere ya ugboro abụọ karịai ihe ọ zụrụ ya n'afọ ise na-abịa abịa.

Ezealigo dọrọ aka na ntị sị na onye chọrọ ịzụ ala ekwesighi ịzụ ala obodo nwe ma ọ bụrụ na ọ gaghị arụ ya ozugbo, na ha nwereike iresi ya onye ọzọ.

Ihe mmụta

Real Estate Investment in South-East Nigeria: Uru dị n'ịzụ na ire ala na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ

Ebe foto si, Chibuike Wogu/Facebook

Na nchịkọta, ndị ọkachamara n'ire ala abụọ a mere ka a amata na ego ole a na-ere maọbụ na-azụ ala bụ site n'ebe ala ahụ dị.

Na ọ bụrụ ala dị n'ebe mepere emepe, na ọnụego ya ga-adị elu karịa nke dị n'ebe ka na-emepe emepe.

Nwude sị na o nweghi iwu na-achịkwa ego ole mmadụ ga-ere ala ọ zụrụ, na ọ bụ ego ole maasịrị onye nwe ala ka ọ na-ere ya.

Ihe ọzọ bụ na o nweghi ọghọm dị na mmadụ ịzụ ala maka na ala na-amụta nnukwu ego n'oge na-adịghị anya.