Ebele Obiano and Bianca Ojukwu: Ihe mere Bianca Ojukwu jiri 'maa mụ ụra' - Ebele Obiano

Bianca Ojukwu na Ebele Obiano

Ebe foto si, Bianca/Osodieme/Facebook

Ebelechukwu Obiano bụ nwunye Willie Obiano nke bụbu gọvanọ Anambra steeti, ekwuola na ọ bụ ekele ka ọ gara ikele Bianca Ojukwu mere O ji 'maa ya ụra'.

Obiano kwuru na o riri ya ọnụ ihe mere Ojukwu ga-eji 'maa ya ụra', nke na-efegharị n'ihe onyonyo mgbe a na-edu Charles Soludo n'iyi ọrụ dịka Gọvanọ ọhụrụ Anambra Steeti n'ụbọchị 17 nke ọnwa Maachị afọ 2022.

Ọ bụ n'akwụkwọ ozi o si n'aka Chidiebele Obika bụ otu ọnụ na-ekwuru ya depụta n'ụbọchị 19 nke ọnwa Maachị, ka o kwuru nke a wee sị, "Agara m ikele Bianca Ojukwu dịka mụ na ya na-ekele na mbụ, o jiri 'maa mụ ụra' ma kwaa m aka", na-enweghi ihe m mere ya iji kpasuo ya iwe."

O kwuru sị, "Aghọtaghị m ihe mere onye bụbu onnye nnọchiteanya anya Naijirịa ga-eji nwee ụdịrị iwe na ekworo dị etu a n'obi ya".

Obiano kwuru na ọ baghị ya n'obi ịzaghachi Ojukwu, kama na o si ebe ahụ pụọ dịka ihe merenu gbara ya gharịị.

Gịnị na-esere ha?

Okwu a kpụ n'ọnụ kemgbe Tọzde 17 Maachị, 2022 bụ esemokwu dapụtara n'etiti Ebele Obiano na Bianca Ojukwu n'oge a na-edu gọvanọ Charles Soludo n'iyi ọrụ n'Awka, Anambra Steetị.

E nweghi onye maara kpọmkwem ihe butere esemokwu n'etịtị ụmụada Igbo abụọ a.

Aha onyonyo, Bianca Ojukwu and Ebele Obiano: E nwere onye agbara aka ntị n'ịṅụ iyi Soludo?

Ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia ụbọchị Monde gosiri ka Ebele Obiano biliri n'oche ya gakwuru Bianca n'ebe ọ nọ, mana a maghị kpọmkwem ihe Ebele gwara Bianca.

Bianca kwụrụ n'ozi o nyere Ụlọntaakụkọ Arise Ụbọchị Tuzde na ọ bụ Ebele Obiano bịara ebe ọ nọ ala ịkwa ya emo, jụọ ya, "Gịnị ka ị bịara ime ebe a, ọ kwa ị sị na ịgaghị abịa emume ndị pati APGA ọzọ"

O kwuru na ya gbara ya nkịtị dịka ndị nọ nso dụrụ ya ọdụ ya gba ya nkịtị mana o bidoro dụwa ya aka n'ubu.

" Agwara m ya ya emetụzịla m aka mana ọ gara n'ihu dụkwa m aka ma chọọ iwepụ ịchafụ m, were kunie nye ya ụra chara ọkụ iji kwụsị ya."

Kedụ mgbe esemokwu a malitere?

Mana tupu ụbọchị idu Soludo n'iyi ọrụ eruo, e nweela esemokwu dị n'etiti Bianca Ojukwu na ụfọdụ ndị ndu pati APGA, ọkachasị oge Willie Obiano na-achị Anambra Steetị.

Otu onye ọnụ na-eru n'okwu ndọrọ ndọrọ n'Anambra na-achọghị ka a kpọọ aha ya sị na ọ malitere n'afọ 2018/2019.

Na ọ bụ mgbe Bianca Ojukwu chọrọ ịzọ ọkwa sịnetọ ga-anọchiteanya Anambra South na nwunye Ebele Obiano kpọpụtara onye a kpọrọ Prince Nicholas Ukachukwu ka ọ zọsị Bianca ọkwa ahụ.

Na oge a na-eme ntuliaka ime ụlọ n'Ekwulobia, na ọ gbaghara dapụtara nke mere APGA jiri nye Nicholas Ukachukwu ọkọlọtọ.

"Kamgbe ahụ ka esemokwu dị n'etiti Ebele na Bianca biri ọkụ nke mere ha jiri na-akatọ onwe ha, tinyekwuoro ndị nkwado ha.

N'otu ihe onyonyo wepụtara n'afọ 2018, Bianca Ojukwu katọrọ ndị ndu APGA maka etu ha sị akpa agwa bụ nke ọ sị na ọ jọgburu onwe ya.

Ọ sị na "ndị APGA kparịrị ndị Igbo. A ga-ekwe nwata aka maka ịgbahapụ nne ya na ụmụnne ya mgbe nna ha nwụrụ?"

A ka na-ekwu ya "APGA anara ụmụnne ha ego n'Imo Steeti n'aha ime ntuliaka ime ụlọ mana ha emechaghị mee ya kama ha tinyere ndị masịrị ha n'ọkwa."

Aha onyonyo, APGA kpara agwa ọjọọ - Bianca

Nke a butere esemokwu n'etiti ya na ndị ndu APGA bụ nke Gọvanọ Willie Obiano na-achị Anambra n'oge ahụ bụ otu n'ime ha.

Akụkọ kwuru na ọ bụ n'ihi esemokwu ahụ mere APGA enyeghi Bianca Ojukwu ọkọlọtọ ịzọ ọkwa Sịnetọ n'afọ 2019.

N'isi ụtụtụ ụbọchị 17 Maachị, 2022 bụ mgbe Obiano ga-arịtu n'ọkwa, Bianca dere ọtụtụ ihe n'akara Facebook ya nke gosiri na obi dị ya mma na onye ọzọ na-abanye n'ọchịchị Anambra Steeti nakwa APGA.

Bianca sị "Ụbọchị ọhụrụ abịala, ụbọchị nwereonwe, anyị ga-abụ abụ mgbapụta. Anambra ga-aka mma".

Ọ sị na ọ dịka ụbọchị ndị Izrelụ nwereonwe ha site n'aka ndị Ijiptu ka e dere ya n'akwụkwọ nsọ.

Bianca sị na ụbọchị a gosiri na o nweghi onye ga-anọ n'ọgbọ ruo ebighi ebi.

O doghi anya ma ọ bụ ihe ndị ahụ ka nwunye Willie Obiano bụ Ebele hụrụ mere o jiri gakwuru Bianca n'oge emume idu n'iyi ọrụ ahụ.

Bianca Ojukwu bụ nwunye Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu ebidola na-akwado ịzọ ọkwa ọchịchị dịka sinetọ n'ime Anambara steeti.
Nkọwa foto, Bianca Ojukwu bụ nwunye Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu ebidola na-akwado ịzọ ọkwa ọchịchị dịka sinetọ n'ime Anambara steeti.
  • Bianca Ojukwu bụ nwunye Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu ebidola na-akwado ịzọ ọkwa ọchịchị dịka sinetọ n'ime Anambara steeti.
  • Ya na Odumegwu Ojukwu mụtara ụmụ atọ tupu di ya anwụọ n'afọ 2011.
  • Bianca na-azabụ Bianca Ono tupu ọ lụọ Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu.
  • Ọ bụ nwa CC Ono, aka chiburu Anambra Steeti.
  • Bianca kwuputere ebumnuche ya ịzọ ọkwa a n'ọgbọ egwuregwu dị n'Ekwulọbịa n'Agụata n'ime Anambara steeti.
  • Ọ nwetere nnturugo n'asọmpị e lelebe e jeghi ọrụ nke ụmụnwaanyị Naịjrịa n'afọ 1988 nakwa nke Afrịka
  • Amụrụ ya n'ụbọchị ise nke ọnwa Ọgọstụ, 1968
  • Ọ bụ onye ọkaiwu bụrụkwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị
  • Ọ rụrụ ọrụ dịka onye nnọchịte anya Naịjriịa na mba Spain n'afọ 2012

Onye bụ Ebelechukwu Veronica Obiano?

Ebere Obiano

Ebe foto si, Ebere Obiano

  • Ebelechukwu Obiano bụ nwunye Willie Obiano bụ aka chiburu Anambra Steeti
  • A mụrụ ya n'Ọnịcha, Anambra steeti
  • Ọ bụ onye obodo Ifite, Ogbunike dị n'okpuruọchịchị Oyi dị n'Anambra steeti, ma lụọ Obiano bụ onye Aguleri nke Anambra North
  • Ha mụrụ ụmụ abụọ, otu nwaanyị na otu nwoke
  • Ọ gụrụ akwụkwọ sekọndịrị na Legọs nakwa Okija ma gụọ mahadum na mahadum Legọs
  • Ọ gụkwara akwụkwọ na Houston, Texas dị na mba Amerịka
  • Ọ rụọla ọrụ n'ọtụtụ ebe gụnyere ngalaba NNPC a kpọrọ NAPIMS
  • O hiwere ụlọọrụ na-ahụ maka inyere ndị mmadụ aka a kpọrọ 'Caring Family Enhancement Initiative' (CAFE) n'afọ 2014