Ebelechukwu Obiano: Onye bụ nwaanyị ụwa kpụ n'ọnụ?

Ebe foto si, Osodieme Obiano Facebook
Nwunye Willie Obiano, aka chịchapụrụ Anambra steeti bụ Ebelechukwu Obiano bụ onye a kpụ n'ọnụ ugbua a na Naịjiria.
Nke a bụ n'ihi agwa ọ kpara mgbe o bu nsogbu gakwuru n'emume nnyefe ọchịchị na idu n'iyi ọrụ nke Gọvanọ Chukwuma Soludo, e mere n'ụbọchị 17 nke ọnwa Maachị 2022.
Mana e wepụ ya bụ esemokwu mere ka o wuo na Naịjiria nakwa na soshal midia n'ụbọchị ahụ, e nwere ihe ndị kwesịrị ka a mara maka nwaanyị a bụbu Nwaanyị Mbụ n'Anambra steeti site n'ụbọchị 17 nke ọnwa Maachị afọ 2014 ruo 17 nke ọnwa Maachị 2022.
Lee ihe ndị ị kwesịrị ịma maka ya:

Ebe foto si, Osodieme Obiano Facebook
- A mụrụ Ebelechukwu Veronica Obiano n'ụbọchị asaa nke ọnwa Ọktoba, n'Ọnịcha, Anambra steeti.
- Ọ bụ onye obodo Ifite, Ogbunike dị n'okpuruọchịchị Oyi dị n'Anambara steeti, a na-alụ ya n'Aguleri dị n'Okpuru Ọchịchị Anambara-East.

Ebe foto si, Chief Willie Obiano Facebook
- Ha mụrụ ụmụ abụọ, otu nwaanyị na otu nwoke (mana e nwere ụmụaka atọ ha na-akpọkwa ụmụ ha, nke a na-ekwu na ọ dị ka ha na-azụ ka nke ha.
- Aha otutu ya bụ "Osodieme"
- Ọ gụrụ akwụkwọ praịmarị na Lagos Premier Day School dị na Legọs, Okija Community Secondary School dị n'Okija dị n'Anambra steeti, ma gụọ maka Mgbasaozi (Mass Communication) na mahadum 'University of Lagos'
- Ọ gụkwara ma nweta asambodo n'ihe gbasara akụkọ mgbe gboo na ihe na-eme na mba ofesi nke Bekee kpọrọ 'History and International Studies', na mahadum 'Lagos State University' (LASU)
- Ọ gụkwara akwụkwọ na Houston, Texas dị na mba Amerịka, ebe ọ nọ nweta asambodo n'ihe gbasara orire na ọzụzụ ala na ụlọ, nke Bekee kpọrọ 'Real Estate'
- Ọ rụrụ ọrụ dịka onye nlekọta (welfare officer) n'ụlọọrụ a kpọrọ 'National Petroleum Investment and Management Services' (NAPIMS), bụ otu mgbakwunye nke ụlọọrụ 'Nigerian National Petroleum Corporation' (NNPC)
- O hiwere ụlọọrụ na-ahụ maka inyere ndị mmadụ ọ kachasị ụmụnwaanyị aka a kpọrọ 'Caring Family Enhancement Initiative' (CAFE) n'afọ 2014
- O wuru ewu n'afọ 2019, maka ụdịrị ugegbe anya o kpu gaa akwamozu Ichie Michael Chukwuka Onyema bụ nna onye nwe ụlọọrụ ugboelu Air Peace bụ Maazị Allen Onyema
- O metara ihe e ji kpụrụ ya n'ọnụ n'afọ 2021, mgbe o kwuputere na ọ gbaala ọgwụ mgbochi ọrịa Covid-19 ya na mba Amerịka. Ndị mmadụ katọrọ ya maka ịhapụ ọdịmma steeti ya ma gawa nlekọta nke onwe ya n'obodo oyibo
- N'afọ 2022 ka o kwuputere mmasị ya iso zọọ oche omeiwu na-anọchite anya Anambra North n'Ụlọomeiwu Ukwu Naịjiria, n'afọ 2023.





