BBC Igbo Townhall: Etu ndị mmadụ si achọ udo n'ala Igbo ugbua

Town Hall meeting

Dịka ọnọdụ ọwụwa anyanwụ na-echu ọtụtụ ụmụafọ Igbo Ura, BBC Igbo ka enwe nrụrịtaụka pụrụ iche taa nke a kpọrọ nzụkọ 'BBC Igbo Townhall' taa.

Ọ bụghịzị akụkọ ọhụrụ gbasara mwakpo ụlọọrụ ndị uweojii na ogbugbu ndị mmadụ na mpaghara ọwụwa anyanwụ, nke a mere na ọ dị mkpa ka ndị Igbo gbakọọ ma kwuo uche obi ha maka etu ihe siri dị.

Nrụrịta ụka apụrụiche ma dịkwa oke mkpa ga ebido n'elkere asaa nke abalị Wenesde, ụbọchị itolu nke ọnwa mee afọ 2021.

Ya bụ ụbọchị taa!

Aha onyonyo, Ebonyi herdmen attack: 'Etu ndị ọchiehi si wakpo anyị gbụọ otụtụ ndị be anyị'

Ndị ọnụ na-eru n'okwu maka ihe gbasara ọwụwa anyanwụ na ndị Igbo ji eje mba ga-eso na ya bụ mkparịta ụka.

Mmadụ niile ihe gbasara ala Igbo na-anụ ọkụ n'obi nwere ohere i so na ya bụ mkparịtaụka.

Onye ahụ pịa BBCIgbo Townhall ka ọ debanye aha ya ma soro na ya bụ ọgbakọ.

Ntụharị Uche

Mpaghara ọwụwa anyanwụ abụrụla ebe akụkọ na-ebute akwa arịrị si apụta nsonso a.

Akụkọ maka mwakpo ụlọọrụ ndị uweojii na ogbugbu ndị mmadụ abụrụla ihe ndị ọwụwa anyanwụ na-anụ kwa mgbe kwa mgbe.

Aha onyonyo, Onions traders: 'Anyị ahụbeghị ego Nnamdi Kanu kwuru ọ ga-akwụ anyị maka ịyabasi ha n'Imo'

Iji maa atụ, lee ụfọdụ ihe mere n'ọwụwa anyanwụ nanị n'izuụka a;

Dịka o siri dị, n'abalị Moọnde ka ndị bi n'Ọjịị gwara BBC na ha enweghị ike ihi ụra n'ihi ụda egbe.

Ka nke a na-eme ka ndị Oraifite na-ekwu etu ndị ha na-eche na ha bụ ndị agha Naịjirịa nakwa ndị uweojii si wakpoo ụlọ onye bụbu ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ onye ndu Indigenous People of Biafra bụ Ifeanyi Ejiofor n'Oraifite dị n'okpuruọchịchị Ekwusigo , Anambra steeti.

Ifeanyi Ejiofor

Ebe foto si, Ifeanyi Ejiofor/BBC/ Getty Images

N'otu aka ahụ, ndị oji egbe a na-amaghị ndị ha bụ agbara ụlọ kọmishọna mgbasaozi n'Imo Steetị bụ Declan Emelumba ọkụ.

Emelumba sị na o nweghi onye nwụrụ n'ọkụ ahụ gbara ụlọ ya dị na n'obodo Ubulu-Ihejiofor nke okpuruọchịchị Oru West, n'ụbọchị ụka Juun 6, 2021.