Soludo Inauguration: Ebele Obiano arịọla mgbaghara ma kwupụta ebumnobi ya ịzọ ọkwa sịnetọ

Ebe foto si, Osodieme Obiano/Facebook
Ebelechukwu Obiano bụ nwunye gọvanọ chiburu Anambra Steeti bụ Willie Obiano arịọla mgbaghara maka esemokwu dapụtara n'etiti ya na Bianca Ojukwu na 17 Maachị, 2022 mgbe a na-edu gọvanọ Chukwuma Soludo n'iyi ọrụ n'Awka.
Obiano rịọrọ mgbaghara ahụ mgbe ọ na-ekwupụta ebumnobi ya ịzọ ọkwa Sịnetọ ga-anọchi anya Anambra North n'Ụlọomeiwu Ukwu n'Ọka n'ụbọchị Wenezde.
Ọkwa sịnetọ mpaghara Anambra- North ọ na-akwadọ ịzọ dị n'aka onye bụbu minista njem ụgbọelu. bụ Seịnetọ Stella Oduah nke pati PDP ugbua.
Otu n'ime ndị enyemaka aka ya bụ Obika Chidiebere gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na nne ya ukwu kwupụtara uche n'ịzọ ọkwa ahụ.
Ihe Ebele Obiano rịọrọ n'arịrịọ
Obiano sị na ọ rịọla gọvanọ Chukwuma Soludo na-achị Anambra ugbua mgbaghara maka esemokwu ahụ mere n'ụbọchị a na-edu ya n'iyi ọrụ.
Ọ sị na o mere nke a site n'idegara Soludo akwụkwọ ozi.
O kwuru "Dịka onye udo nke e ji maara m, ọgbaghara abụghị akwa m,"
"Ekelere m ndị okenye, ndịisi ọchịchị, ndị enyi na ndị Anambra niile ndị kpọrọ m ma gosi nwute ha n'ihe ahụ mere ma nye ma ndụmọdụ."
"Ndị maara nke ọma ma na kemgbe afọ asatọ m bụ nwunye gọvanọ, na agbasoro m ụzọ udo na inyere ndị mmadụ aka."
"O nweghi ihe m ga-eji kụnye aka maka mmechu ihu ahụ, na-agbanyeghi ihe ọbụla e mere m."
"N'otu aka ahụ, ana m arịọ ndị gbapụtara ihe niile, ndị Anambra nakwa ndị Igbo mgbaghara maka imechu ha ihu n'emume ahụ."
Ihe mere Ebere Obiano ji pụta ịzọ ọkwa Sịneti

Ebe foto si, Osodieme Obiano/Facebook
Mgbe Ebele Obiano na-ekwupụta ihe mere o jiri chọrọ ịzọ ọkwa Sịnetọ n'afọ 2023 n'Ọka, ọ sị na ọ bụ uche Chineke na ọ ga-azọ ọkwa ahụ.
N'okwu ya "Ebumnobi m ịzọ ọkwa a si n'ọkpụkpọ oku ndị obodo m kpọrọ m ka m nọchiteanya ha n'Ụlọomeiwu Etiti.
"Ndị Anambara anwaala ma ma chọpụta na e nwere m mmasị n'ijere ndị mmadụ ozi, igosi ịhụnanya nakwa itinye ọchị n'ihu ndị obi na-adịghị m, a maara m na ọ bụ uche Chineke."
"Ọ bụ ihe ndị a mere ndị nke m jiri kpebie ma sị ka m bịa jeere ha ozi n'ebe ọ dị ukwuu".
Obiano bụ onye pati APGA bụ pati di ya jiri zọọ ọkwa ma merie dịka gọvanọ Anambara Steetị n'afọ 2014 ruo afọ 2022 ọ rịturu n'ọchịchị.
O dobeghi anya ma ọ gbatala akwụkwọ ikike igosi mmasị ya n'ọkwa ahụ nke a kpọrọ 'normination form'.
Ị maara onye bụ Ebele Obiano?

Ebe foto si, Ebere Obiano
- Ebelechukwu Obiano bụ nwunye Willie Obiano bụ aka chiburu Anambra Steeti
- A mụrụ ya n'Ọnịcha, Anambra steeti
- Ọ bụ onye obodo Ifite, Ogbunike dị n'okpuruọchịchị Oyi dị n'Anambra steeti, ma lụọ Obiano bụ onye Aguleri nke Anambra North
- Ha mụrụ ụmụ abụọ, otu nwaanyị na otu nwoke
- Ọ gụrụ akwụkwọ sekọndịrị na Legọs nakwa Okija ma gụọ mahadum na mahadum Legọs
- Ọ gụkwara akwụkwọ na Houston, Texas dị na mba Amerịka
- Ọ rụọla ọrụ n'ọtụtụ ebe gụnyere ngalaba NNPC a kpọrọ NAPIMS
- O hiwere ụlọọrụ na-ahụ maka inyere ndị mmadụ aka a kpọrọ 'Caring Family Enhancement Initiative' (CAFE) n'afọ 2014













