Onye bụ Nze Fidelis Ozichukwu Chukwu onyeisi ọhụrụ nke Ohanaeze Ndigbo?

Ebe foto si, FC Jones Onwuasonanya/Facebook
Otu jikọtara ndị Igbo n'ụwa bụ Ohanaeze Ndigbo ahọpụtala Nze Fidelis Ozichukwu Chukwu dịka onyeisi ọhụru nke otu ha.
Nke a dị n'akwụkwọ ozi odeakwụkwọ mbasaozi otu a bụ Chiedozie Alex Ogbonnia wepụtara ma kwuo na ọ bụ ndị imeobi Ohanaeze họpụtara Ozichukwu site n'ọgbakọ ha mere n'ụbọchị Satọde 14 Disemba, 2024.
Ozichukwu ga-anọchi anya Emmanuel Iwuanyanwu jibu ọkwa ahụ ruo oge ọnwụ ya na 25 Julaị, 2024 mgbe ọ rịachara ọrịa.
Ozichukwu ọ ga-anọ n'ọchịchị ruo oge ole?

Ebe foto si, Ohanaeze Ndigbo
Maazị Ogbonnia kwuru na ọ bụ naanị otu ọnwa (ụbọchị iri abụọ na asaa) ka Nze Ozichukwu ga-anọ n'ọkwa ahụ rue na 10 Jenụwar 2025 iji mezuo oge ọchịchị ndị Imo Steeti.
Nhopụta ya a na-abịa dị dịka mmadụ abụọ si Imo Steeti jibu ọkwa ndịisi Ohanaeze Ndigbo nwụrụ anwụ - Ọkammụta George Obiozor nwụrụ n'afọ 2022 na Emmanuela Iwuanyanwụ nwụrụ n'afọ 2024.
Mgbe Obiozor nwụrụ, e duru Iwuanyanwụ n'iyi ọrụ n'ọnwa Eprelụ 2023 iji mezie oge ọchịchị ndị Imo steeti mana Iwunanyanwu mechara nwụọ na Julaị 2024 nke mere e jiri họpụta Ozichukwu ka o mezuo ụbọchị ole fọrọ afọ.
Otu Ohanaeze ngalaba Imo Steeti mere nzukọ ma họpụta Nze Chukwu nke mere ndị Imeobi Ohanaeze Ndigbo jiri kwadoo ya.
Onye bụ Nze Fidelis Ozichukwu Chukwu?

Ebe foto si, Ohanaeze Ndigbo
- Nze Ozichukwu Chukwu bụ nwafọ Imo Steeti, ọkachamaara n'ihe banyere nchịkọta ụlọọrụ nakwa nwulite azụmaahịa.
- Ọ gụrụ akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ ndị dịka Templeton College, Mahadu Oxford, mahadum Havard. Mahadum Cambridge, mahadum Lagọs na ọtụtụ ndị ọzo.
- Ọ rụọla ọrụ dịka direktọ ụlọakụ Inland Bank PLC nakwa nke Merchant Bank.
- O so n'otu n'ime ndị hiwere kọmitii na-ahụ maka ire ụlọọrụ ndị gọọmentị nwe a a kpọro 'Technical Committee for Privatization and Commercialization (TCPC) and the Bureau of Public Enterprises (BPE).'
- Ọ rụkwara ọrụ dịka onyeisi kọmitii na-ahụ maka nhazigharị nwulite River Basin na Naịjirịa.
- O jiburu ọkwa osote onyeisioche otu Peoples Democratic Party (PDP) na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ruo afọ asatọ.
- Ọ so hiwe ọtụtụ atụmatụ mmepe nke gụnyere mmepe Ọwụwa Anyanwụ a kpọro 'South East Development Initiative (SEDI).
- Nze Chukwu bụ onye ụka Katọlik e chiri echichi dịka Knight nke St. Mulumba (KSM) na Knight nke St. Sylvester (KSS).
- O ritere ntuurugo udo site n'aka otu United Nations n'afọ 2002.





