Ụmụaka atọ n'ime otu ezinaụlọ mere okenye n'ihu karịa afọ ha atụgharịala ihe ịkọ ọnụ ka ọ bụrụ ihe agbamuume

Ebe foto si, BBC/Kelechi Anozia
- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
- Onye dere ya, Kelechi Anozia
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
BBC bụ ndị mbụ na-ewepụta akukọ nke na-ekwu na otu ezinaụlọ n'Anambra steeti nwere ọnọdụ ahụike a kpọrọ 'Cutis laxa' na Bekee.
Nke a bụ ọnọdụ so na ọnọdụ onye nwere ya na-aka nka na- erughị eru.
Ọ bụ otu onye n'ime mmadụ ijeri ọbụla nwere ọnọdụ a n'ụwa gbaa gburugburuỤmụaka atọ pụrụ iche n'ime ụmụ asaa nne na nna ha mụrụ.
Ụmụaka atọ n'ime ụmụ asaa otu nwoke na nwunye ya mụrụ nwere ọnọdụ a.
Nke a kpalitere ndọrịtaụka banyere ihe kpatara ọnọdụ ha.
Uche Akolisa nke BBC zutere ezinaụlọ ahụ bụ ndị ekweghị ha e jiri ọnọdụ a ama atụ ha.
"Ha na-asị na ahụ adịghị m mana ahụ dị m, o nweghị ihe na-arịa m," bụ ihe Chizaram kwuru.
Nwata ahụ dị afọ asatọ nọ n'oche dị n'ụloakwụkwọ praịmarị, hulatara ala na-ede ihe n'ọkụ n'okụ.
Oge o welitere isi, anya ya na-eke vam vam gara n'ọnụụzọ ma gaghazi n'ebe onye nkụzi kwụ n'ihu klasị akụziri ụmụaka ihe n'ụtụtụ ụbọchị ahụ n'ọnwa Septemba.
Akwụkwọ na-amasị Chizaram Akwuo. Na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ebe ya na ndị mụrụ ya bi, ụmụaka anaghị agakebe akwukwọ n'ụbọchị mbụ ụlọakwụkwọ na-amalite ma e nwechaa ezumike dịka a na-ewe ya dịka ụbọchị egwu nakwa mkpocha na nzacha.
Mana ịga ụlọakwụkwọ ebe ha na-enwe ohere mesapụ ahụ na-atọ Chizaram na nwanne ya nwoke bụ Chiadi, gbara afọ isii, rịkpọọ.
Ebe ahụ ha na-enwe ohere ha na ụmụakwụkwọ ndị ọzọ igwukọ egwu ma gụkọọ akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ 'New High International school', Nteje, Anambara Steeti, n'Ọwụwa Anyanwụ, Naịjirịa, ebe ndị abanaanya no n'obodo ahụ agaghi eji anya elegbu ha.
Ya mere na ọ bụghị ihe ịtụnanya ha gara akwụkwọ n'abalị mbụ ka a nọchara ogologo ezumike.

Ebe foto si, BBC/Kelechi Anozia
Malite oge a mụrụ ha, etu ha dị bụ ihe ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu ihe dị iche iche sị na o bụ ya kpatara ya, dịka nne ha bụ Ngozi Akwuo gbara afọ iri anọ (40) si kọwaa.
O kwuru sị, "Oge a mụrụ ha, ha dị iche n'ahu nakwa n'ihu oge a mụru ha n'ụlọọgwụ."
"Mgbe m mụrụ Chizaram, ụfọdụ ndị omenala gwara m na ọ bụ nne di m lọrọ ụwa".
"Oge m mụrụ Chiadi, ụfọdụ sịrị na ọ bụ nna di m lọrọ ụwa."
Chiadi na Chizaram na-eme ọfụma n'ụlọakwụkwọ.
Ogbonna Oluchi bụ onyenkụzi ha gbara ama sị, "Oge m bidoro na tem mbụ, Chiadi na-agba onye nke asatọ, ugbua ọ na-agba onye nke atọ. Nwanne ya nwaanyị na-agba onye nke mbụ maọbụ nke abụọ."
Ndị ọkachamara a kpọrọ 'geneticists' gwara BBC na ezinaụlọ ahụ nwere ọnọdụ a kpọrọ 'Cutis Laxa.' na Bekee.
Ọkammụta Khalid Adekoya nke ngalaba "Cell Biology and Genetics" na mahadum "Univefrsity of Lagos".
"Ọ bụ ọnọdụ nke ihe e jiri mara ya bụ na ahụ ndị nwere ya na-afịkọ afịkọ ka nke onye kara nka oge onye ahụ akabeghị nka.
Ngalaba "American national library of medicine' kọwara ya dịka nsogbu metụtara nhazi ime ahụ na-enye anụ ahụ, nkeji ahụ, akpụkpọ ahụ nakwa akụkụ ahụ dị iche iche ike.
Ọtụtụ ọnọdụ na-esi n'aka nne na nna fee na ụmụ ha dịka ụdị a hụrụ n'ezinaụlọ a si Naịjirịa.
Mana ụfọdụ na-eme ndapụta, nke pụtara na ọ bụghi mgbanwe 'gene' butere ha.
Ndị ọkachamara seyensị kwuru na ọnọdụ ha enweghị ihe o gbochiri ha, na o gboghị ha ịma akwụkwọ.
Dr Utom-Obong Akpan nke ngalaba, "Anatomy" na mahadum, "Bowen University."
Ụfọdụ ndị nwere ọnọdụ a, anaghị enwe agịrị isi. Mana oge anyị nyochara ezinaụlọ a, anyị chọpụtara na o nweghị ihe mere ụbụrụ ha."
Chizaram kwuru na "Ihe uche m ji dị n'akwụkwọ bụ na ọ na-amasị m ịgba onye nke mbụ na klasị."
Ụmụaka a esonyela n'ihe ejije soshal midia nke mere ka a mara ha amara na mpaghara ha.
Ọkịka obi ha nwere na-enyekwara ha aka ịnagide ndị na-akparị ha.
Chizaram kwuru sị, "Ihe m na-agwa ha (ndị na-akwa ha emo) bụ na m too, ihu m agbanwee, agaa m n'ihu na-eme ihe ejije m na-eme."
"Ha chọọ ime ihe anyị na-eme, ha mee ihu ha ka ọ fọtọọ afọtọọ ka ha were nwee ike na-eme ihe ejije dịka anyị si eme."
Mana ha nwekwara ihe ha na-atụ anya ime ma ha too.
Chiadi kwuru sị,"Ihe m chọrọ ịrụ ma m too, achọrọ m ị na-arụ amị. O nwere onyeagha m ma, m zute ya, kelee ya, o zụtara m ihe."






