Mgbọ egbe tụtara mmadụ anọ - Onyeisioche Onitsha Main Market

Aha onyonyo, Mgbọ egbe tụtara mmadụ anọ - Onyeisioche Onitsha Main Market
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5
Maazị Okpalaugo kwuru nke a oge ọ na-agwa onye ntaakụkọ BBC News okwu oge a gara kpọtụrụ ya.

Onyeisioche Onitsha Main Market bụ Chijioke Okpalaugo akọwaala ọdachi mere n'ime ahịa n'ụbọchị Tuzde dịka ihe na-agba anyammiri.

Maazị Okpalaugo kwuru nke a oge ọ na-agwa onye ntaakụkọ BBC News okwu oge a gara kpọtụrụ ya.

O kwuru na ya garuru na mpaghara ahịa njinji ahụ jiri oge ọ nụrụ gbasara ya ma mechaa gaa n'ụlọọgwụ e bugara ndị o metụtara iji mara etu ha dị.

"Anyị gara nye mkpesa n'ụlọọrụ ndị uweojii Area Command, ma Area Commander bịara gwa ndị ahịa okwu n'olu dị nwayọ," ka Okpalaugo kwuru.

Dịka Onyeisioche ahụ siri kwuo, ha nwetara ozi na mgbọ egbe tụtara mmadụ anọ, ma gbuo otu nwaanyị.

Ọ sịrị na mmadụ ndị merụrụ ahụ na-anara ọgwụwgọ ugbua n'ụlọọgwụ dị iche iche, ma kpee ekpere ka mkpụrụobi ndị nke nwụrụ anwụ zuru ike n'udo.

Otu onye hụrụ ka o si mee na-achọghị ka a kpọọ aha ya kọrọ na ndị Ocha Brigade banyere n'otu ụlọahịa ma malite iburu ngwaahịa.

Ọ kọrọ na ndị mmadụ malitere igbochi ha ozugbo n'ihi na ha chere na ọ bụ ihe na-ekwesịghị ekwesị.

"Caban na onye nchekwa ya mipụtara 'daga' na-asụ ndị mmadụ, mana oge ọgbaaghara karịrị, ha buuru ụgbọala ha pụwa. Ọ bụ oge ha pụrụ ka onye nchekwa ahụ gbapurụ mgbọ, gbuo nwata nwaanyị na-erere mmadụ nri ma merụọkwa ụfọdụ ahụ," ka nwoke ahụ kwuru.

O kọwara na Caban bụ onye na-arụrụ ndị Ocha Brigade ọrụngo, maka na ndị "Ocha Brigade anaghị abanye n'ime ụlọahịa mmadụ dịka Caban si eme".

Ocha Brigade: Ihe Soludo kwuru gbasara ọdachi mere n'Onitsha Main Market

Ocha Brigade: Ihe Soludo kwuru gbasara ọdachi mere n’Onitsha Main Market

Ebe foto si, Anambra State Government

Nkọwa foto, Gọvanọ Chukwuma Soludo na-eleta onye merụrụ ahụ n'ụlọọgwụ
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Gọvanọ Anambra steeti bụ Chukwuma Soludo akasiela ezinaụlọ Chinwe Igwe obi maka ọnwụ ya n'ahịa Main Market Onitsha.

Nke a dị n'ozi Odeakwụkwọ Mgbasaozi Soludo bụ Christian Aburime wepụtara n'ụbọchị Wenezde 11 Septemba, 2025.

Ozi ahụ kwuru na Soludo zutere ndị nnọchiteanya ezinaụlọ nwata nwaanyị ahụ si Ebonyi steeti n'isi ụlọọrụ okpuru ọchịchị Onitsha North, bụ ebe ọ nọọrọ kasie ha obi ma tiekwa ha aka n'obi.

"Soludo kwere nkwa ime nnyocha miri emi gbasara ihe butere ọnwụ Chinwe Igwe ma kwuo na onye ọbụla aka ya dị n'ọnwụ ahụ ga-anata ntaramaahụhụ kwesịrị ekwesị," ka Aburime kwuru.

Soludo kwuru na a tọrọ ntọala Anambra steeti n'iwu na ime ihe n'ezi usoro ma kelee ndị ọrụ nchekwa maka ịgbata ọsọ enyemaka n'oge gbasara okwu ahụ.

Ozi ahụ gara n'ihu kwuo na Soludo gara n'ụlọọgwụ New Hope dị n'Ọnịcha iji leta ndị nke merụrụ ahụ ma sị ha ndo.

O gosikwara enyemaka na nkwado ya maka ndị nke na-anara ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ Nnamdi Azikiwe Teaching Hospital dị na Nnewi.

Cheta na mgbọ egbe tụtara mmadụ anọ, ma gbuo otu nwata nwaanyị na-erere mmadụ nri aha ya bụ Chinwe Igwe n'ụbọchị Tuzde 9 Septemba, 2025, oge ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị na-ahụ maka ogbe ịdị ọcha n'Anambra Steeti a kpọrọ 'Ocha Brigade' na ndị na-azụ ahịa n'Onitsha Main Market.

Etu ndị Ocha Brigade si gbagbuo otu nwagbọghọ ma merụọ ndị ọzọ ahụ n'ahịa Onitsha, Anambra Steeti

Njirimaara ndị ọrụ Ocha Brigade na onye ọrụ ndị ha ụmụnwoke abụọ na-akutu ngwaahịa ndị na-ere ihe n'okporoụzọ.

Ebe foto si, Ocha brigade/Facebook

Ndị uweojii Anambra Steeti ekwuola n'ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị na-ahụ maka ogbe ịdị ọcha n'Anambra Steeti a kpọrọ 'Ocha Brigade na ndị na-azụ ahịa n'ahịa Ukwu Onitsha ataala isi otu nwagbọghọ ma merụọ mmadụ isii ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra Steeti bụ Tochukwu Ikenga kwuru na nsogbu ahụ dapụtara n'ụtụtụ Tuzde 9 Sepụtemba, 2025, mgbe ndị Ocha Brigade gara n'ahịa Onitsha ahụ ịrụ ọrụ ha mana esemokwu dapụtara n'etiti ha na ụfọdụ ndị na-azụ ahịa.

O kwuru na ndị Ocha Brigade malitere ịgba egbe aghara aghara ma gbata ndị na-azụ ahịa mmadụ asaa, nke a mere nnukwu ọgbaghara jiri dapụta n'ahịa ahụ.

Ikenga kwuru na ngwa ngwa ndị uweojii nwetere ozi banyere nke a, na ha wuchiri n'ahịa Onitsha ma kụjụọ ọgbaghara ahụ ma mee ka ndịagha laghachị n'ime ụlọahịa ha.

Ọ gara n'ihu kwuo na otu nwagbọghọ aha ya bụ nwada Chinwe Igwe dị afọ iri abuọ na abụọ nwụrụ site n'egbe a gbara ya.

Ndị ọzọ merụrụ ahụ gụnyere Maazị Ebuka Orakwe, Orum Oluebube, Anthony Kosisochukwu, Ifeoma Ezema na mmadụ abụọ ndị ọzọ a na-amatabeghi aha ha.

O kwuru na ndị a na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ ugbua, ebe e bugala ozu nwada Chinwe Igwe n'ụlọ ebe a na-achekwa ozu.

Ikenga kwuru na ndị uweojii akpọkuola ndịisi otu Ocha Brigade ka ha bịa n'ụlọọrụ ha ma kpọpụta ndị ọrụ kpara arụ a ka e kpee ha ikpe.

Ndị kpara arụ a abụchaghị ndị ọrụ anyị - Onyeisi Ocha Brigade

Celestine Anere yi uwe ndị ọrụ Ocha Brigade nọrọ n'okpuru ihe mkpuchi anwụ n'emume a na-eme.

Ebe foto si, Operation Clean And Healthy Anambra, OCHA Brigade/Facebook

Kọmishọna mgbasaozi n'Anambra Steeti bụ Law Mefor kwuru na gọọmenti anụla maka ihe mere n'ahịa Onitsha ma katọọ agwa dị etu a.

O kwuru na Gọvanọ Chukwuma Soludo enyela iwu ka e mee nnyocha ma jide ndị ọrụ Ocha Brigade kpara arụ a.

N'aka nke ọzọ, Onyeisi ndị Ocha Brigade bụ Celestine Anere kwuru na ndị kpara arụ a bụ ndị ọrụ ngo nke Ocha Brigade a kpọrọ 'ad-hoc staff'.

O kwuru na ihe a ha gara mee n'ahịa Onitsha bụ ọrụ adịgboroja nke ndịisi ụlọọrụ ahụ na-edunyeghi ya.

Ọ gbakwụnyere na ụdịrị agwa ahụ megidere iwu na-achịkwa usoro ụlọọrụ Ocha Brigade si arụ ọrụ, ma kwuo na a nwụchiela ndị aka ha dị na ya, na a ga-enyefe ha n'aka ndị uweojii maka ime ezigbo nnyocha.