Chiwetalu Agu - Adị m ndụ

Chiwetalu Agu

Ebe foto si, Chiwetalu Agu /Facebook

Nkọwa foto, Chiwetalu Agu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Chiwetalu Agu ekwuola na ya ka dị ndụ ma katọọ ndị na-ebuharị akụkọ na-ekwu na ya anwụọala.

Chiwetalu Agu ji ihe onyonyo ọ wepụtara n'ọba ozi Fecebook ya nwere kwuo okwu ma jiri ohere ahụ kwuo na ya ga-adị ndụ ruo na ndị niile na-echere ya echiche ajọọ anwụọ.

N'okwu ya "e tetere m ụra taa nwere hụ ajọ akụkọ a. Onye na-ede akụkọ na soshal midia ji foto m dee 'RIP' naanị ka ọ nweta ndị ga-abịa kwunyere ya n'akara soshal midia ya".

"Mana ka m gwa unu, Chiwetalu Agu agaghị anwụ nso nso. Ọ bụ m ga eli ndị iro m".

"A ga m eleta ụmụ ụmụ m anya. ije ka teleaka, mana o nwere onye na-achọ ka m nwụọ".

"Ọ bụrụ na ọ bụ ndị a maama dere na m anwụọla, a ka m akpụpụ ha ụlọikpe mara na ihe ga-apụta n'ime ya mana onye dere ihe a bụ onye agụọ, onye ahụ ejilo ego".

Chiwetalu Agu ji ohere ahụ kwuo na onye ọbụla so na ndị chọrọ ka ya nwụọ ga-eso na ndị ya ga-eli n'ala.

Ọ gwara ndị enyi ya na ndị ezinaụlọ ya ka ha hara ige ndị na-ekwu na ya anwụọla ntị ma kwuo na ya ga-ebi ogologo ndụ.

Chiwetalu Agu: Kedụ ihe na-eme ya?

Chiwetalu Agu

Ebe foto si, Chiwetalu Agu / Facebook

Nkọwa foto, Chiwetalu Agu

Akụkọ na-efegharị na soshal mịdịa gbasara ọnọdụ ahụike onye na-eme ejije Noliwood a maama aha ya bụ Chiwetalu Agu.

N'ima ihe nke bụ eziokwu, onye ntaakụkọ BBC Igbo gara n'ụlọ Chiwetalu Agu dị n'Amokwe n'okpuru ọchịchị Udi, n'Enugwu steeti ime nchọpụta etu ọnọdụ si dị ebe ahụ.

N'oge anyị rutere anyị chọpụtara na ndị obodo Chiwetalu Agu enweghị ihe ha ma banyere asịrị na-efegharị na soshal midia.

Ebe anyị gara, ọ nweghị onye ma ihe na maka akụkọ ọdịnamma Chiwetalu Agu.

Mana n'aka nke ọzọ onye isi ndị na-eme ejiji n'Enugwu steeti bụ Brown Ene gwara BBC Igbo na enweghị ihe mere Chiwetalu Agu.

Ene zara ajụjụ banyere akụkọ na-ekwu na Chiwetalu Agu anwụọla ma kwuo na akụkọ ahụ "bụ okwu asị".

Ene gara n'ihu kwuo na "ọ kpa ahụ" nke pụtara na ọ dị ndụ nakwa akụkọ banyere ọnwụ ya bụ okwu asị.

Chiwetalu Agu bụ onye na-eme ejije Nollywood a ma ama
Nkọwa foto, Chinwetala Agu

Ihe ị ga-amara maka Chiwetalu Agu

Lee ihe ụfọdụ ị ga-ama maka omee ejije Naịjirịa bụ Chiwetalu Agu:

  • Ọ bụ onye na-eme ejije na Nollywood nke Naịjirịa a maama maka okwu ịkpa ọchị.
  • Chiwetalu Agu bụ onye Amokwe dị n'okpuru ọchịchị Udi, n'Enugwu steeti.
  • O sonyela n'ọtụtụ Ihe ejije gụnyere: Things Fall Apart, Taboo, Wedding Party 2, The Catechist wdg.
  • O ritala nturuugo dị iche iche gụnyere nzere ọkaibe na ejije ọdinala n'afọ 2012 ('best actor in indigenous movie').
  • N'afọ 2022 ndị ọrụ nchekwa nwuchiri Chiwetalu Agu n'Anambra steeti maka iyi uwe e ji echeta Bịafra. Ha sị na ha na-amaghị na ọ bụ onye ọgaranya dị etu ahụ.