Christmas: Lee ụfọdụ ndị ụka Kraịstị anaghị eme emume Ekeresimesi na nkwenye ha

Ebe foto si, Deeper Life/BBC/Daniel Odukoya
- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
Taa bụ abalị 25 nke ọnwa Disemba ka ndị otu Kraistị na ụwa gbaa gburugburu na-eme emume Ekeresimesi n' ụwa gbaa gburu gburu.
Ekeresimesi bụ mmemme ndị Ụka Kraisti ji echeta ọmụmụ Jisọs Kraịst bụ onye ha kwenyere na ọ bụ onye nzopụta a mụrụ na Bethlehem ihe karịrị puku afọ abụọ gara aga.
Mana ị ma na e nwere ụfọdụ ndị ụka Kraịst ekwenyeghị n'emume a?
Ha anọghị n'ihe ndị pụrụ iche a na-eme dịka a na-agba Ekeresimesi ụbọchị ahụ dịka ịka ụka, oriri na ọṅụnụ maọbụ nzụkọ ụmụnna maọbụ nke ụmụada e ji emerube emume a.
Lee ụfọdụ n'ime ha :
1. Ndị Ama Jehova (Jehova Witness)

Ebe foto si, Uche Akolisa/BBC
Ewezuga ị ma ha dịka ndị na-aga n'ụlọ ezi ndị ụjọ ụka oziọma kwa ụbọchịụka, ihe ọzọ e jiri mara ndị Ama Jehova (Jehovah Witness) bụ na ha anaghị eme emume Ekeresimesi.
Ụfọdụ ndị mmadụ na-eche na nke a bụ n'ihi na ndị Ama Jehova ekweghịghị na Jizọs Kraiisti.
Mana ndị ndu ụka Ama Jehova na -ekwu na ọ dịghị n'Akwụkwọ nso, na o nweghị ihe akaebe gosiriri na a mụrụ Jisọs n'abali 25 nke ọnwa Disemba.
"Anyị kweneyere na Chukwu akwadoghị Ekeresimesi n'ihi na ọ gbanyere mgbọrọgwụ n'mmemme ndị ọgọ mmụọ" bụ nkọwa ha nyere na websaitị ha bụ JW.org.
2. Ndị ụka 'United Church of Christ'

Ebe foto si, United Church of Christ/facebook
Dịka ndị Ama Jehova, ndị ụka 'United Church of Christ' na-ekwu na Ekeresimesi adịghị n'Akwụkw Nso.
Pastọ Scott Ashley nke ụka United Church of God n'Amerịka kwụrụ sị, "Akwụkwọ Nsọ Agba Ọhụrụ (New Testaments) kwuru maka ndụ Kraịst n'afọ 30 na ụma o biri n'ụwa nakwa afọ 30 nke mbido ụka Kraistị dịka ọ nwụchara ma bilite n'ọnwụ mana o nweghị ebe anyị hụrụ e kwutere maka Ekeresimesi maọbụ ihe yiri ya."
3. Ndị ụka 'Deeper Life'

Ebe foto si, Mountain of Fire Church/Facebook
Ndị ụka Deeper Life' so na ndị anaghị eme ncheta ọmụmụ Kraịsti.
Oge Ekeresimesi bụ oge ndị ezinaụlọ, ikwu na ibe ji ezukọ, rịkọọ ma nụọọ dịka ha na-enwe anụrị, mana ndị ụka 'Deeper Life' ji oge ahụ ehiwe ọgbakọ ekpere kwa afọ.
Dịka onyeisi ụka ahụ bụ Pastọ William Folorunso Kumuiyi sị kwuo, "Anyị anaghị emerube Ekeresimesi, o si n'okpukpere arụsị."
4. Ndị ụka 'Seventh Day Adventist'
Ndị ụka 'Seventh Day Adventist ekweghi na a mụrụ Jizọs Kraịstị ụbọchị 25 nke ọnwa Disemba.
"Anyị na-ewe ya dịka ụbọchị ezumike iji tụgharịa uche maka ọmụmụ ya."
"Anyị anaghị edobe ya dịka ụbọchị pụrụ iche e ji aga n'ụlọụka nanị ma ọ danye ụbọchị Satọde(bụ ụbọchịụka ndị Seventh Day Adventist") bụ ozi ndị ndụ ụka hapụrụ na websait ha.
5. Ndị ụka 'Mountain of Fire'

Ebe foto si, Daniel Olukoya/Facebook
Ndị ụka Mountain of fire & Miracle (MFM) so n'ụka ndị anaghị eme emume Ekeresimesi dịka ha na-ahụta ya dịka mmemme ndị ọgọmmụọ.
Onyeisi ụka 'Mountain of Fire'(MFM) bụ Daniel Olukoya, kwuru sị,"Ọ bụrụ na i lee Akwụkwọ Nso malite na Jenesisi rue na Mkpughe, o nweghị ihe dIka Ekeresimesi."
6. Ụka 'Watchman'
Ụka a a ma ya dịka Ụka 'Watchman Catholic Charismatic Movement' anaghị eme emume Ekeresimesi n'ihi nwenye na ọ bụ onenala ndị ọgọ mmụọ
Otu ụkọchukwu bụ Pastọ Bede Ogu kwuru n'otu oziọma ya sị, "Ụbọchị Ekeresimesi na emume a na-eme n'ụwa nile maka Ekeresimesi enweghị ihe jịkọrọ ya na Jizọs Kraisti, Nwa Chineke,kama ọ bụ emume ndị ọgọ mmụọ a kpọrọ 'Satururnalia, emume e ji akwanyere chi Anyanwụ ugwu."












