Peller: Ndị uweojii anwụchiela onye ihe nkiri soshal midia maka ebubo ịgbalị igbu onwe ya

Ebe foto si, Peller/Instagram
Ndị uweojii Legọs steeti ekwuola na ha anwụchiela onye ọkpaọchị na soshal midia bụ Habeeb Hamzat a ma ama dịka 'Peller' maka ihe ha kpọrọ 'ịgbali ịkwụ ụdọ' site na ị ji ụgbọala ya nwe ihe mgbere okporoụzọ nwere ike ibute ọnwụ ya maọbụ bute ọgbaghara na steeti ahụ.
N'ozi mgbasaozi nke ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Abimbola Adebisi, onye kwuru na ha na-eme nnyocha sịrị , na.
"Ihe o mere bụ ị ma ama gbalịa igbu onwe ya nakwa itinye ndị nọọrọ onwe ha n'ihe egwu."
Adebisi kwuru na agwa ahụ 'tinyere nwaamadị ahụ na ndị ọzọ nọ n'okporoụzọ n'ihe egwu."

Ebe foto si, Jarvis/Instagram
Ebe ka okwu si bido?
Ihe onyonyo gbara n' intanet Ụbọchịụka abalị 14 nke ọnwa Disembaafọ 2025, gosiri ebe Peller kpọkasịrị ụgbọala Mercede Benz ọ zụrụ ọhụrụ dịka ọ na-anya ya etu ekwesịghị ma na-egosi ihe na-eme n'intanet dịka ọ na-eme .
Ihe onyonyo ahụ gosiri ebe Peller na-ekwu sị, " Aga m eji ụgbọala nwee ihe mberede ugbua."
O kwukwara sị, " Obi na-amapụ m, ị sị m na m na gị agaghị atọzị, ndị mmadụ ga-akwa m emo. ha ga-akwa m emo. Daalụ m ga-egbu onwe m."
Peller na onye ọ chọrọ ịlụ bụ Amadou Elizabeth Aminata a ma ama dịka 'Jarvis' na-enwe nsogbu kwa mgbe kwa mgbe na soshal midia.
Onye bụdị 'Peller'?
Habeeb Hamzat a ma dịka Peller bụ onye na-emepụta ihe nkiri na social midia .
A mụrụ ya n'afọ 2005 ma bụụ onye a kachasị ekiri ihe o mere n'Afrịka ugbua. O sonyela n'ihe onyonyo egwu nke Otiegwu ama ma bụ Olumide .
O nwetala ọtụtụ nturuugo nke gụnyere"Best Content Creator" n'emume Trace Award nke afọ 2024









