Merry Christmas: Lee emume eji eme 'Christmas' tupu a mụọ Jizọs

Ejije emume ndị Rome

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Chigozie Ohaka
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo service

Ekeresimesi bụ emume ndị okpukperechi Kraịst ji echeta ụbọchị a mụrụ Jesus Christ, bụ onyeisi nakwa onye hibere ya bụ bụ okpukperechi.

Nke a pụtara na ụfọdụ kwenyere na tupu a mụọ Jesus Christ, enweghị ihe ọbụla dịka emume Ekeresimesi.

Mana ndị ọkammụta na ndị nchọcha na-ekwu na e nwere ọtụtụ ihe ama na-egosi na ndị mmadụ emebuola ememe 'Christmas' ihe dị ka puku afọ asaa tupu amụọ Kraịst.

N'akwụkwọ 'Religions of Rome', ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ Mary Beard na John North dere ka ha na-echeta na oge a bụ oge emume 'solstice' chi a na-akpọ Mithra ka eji ya echeta.

Ndị Mba Bolivia na-eme emume yiri nke 'Sol Solstice'
Nkọwa foto, Ndị Mba Bolivia na-eme emume yiri nke 'Sol Solstice'

Akwụkwọ ha kọwara na ọ bụ otu izu ka eji emume a nke na-adị n'etiti ezinụlọ, ọ bụkwa oge eji enye onyinye dị cihe iche n'etiti ndị mmadụ.

Ya mere, ọ dịghị ihe dị iche na enmume a na ekeresimesi nke oge a.

Site na akụkọ ifo ndị Peshia, Mithra bụ chi amamihe, na-anọchi anya ihe ya na ịdị mma karịa ihe ọjọọ.

Mithra
Nkọwa foto, Chi Anyanwụ Mithra

Mithra bụkwa chi nke ya na anyawnụ na emekọ, akụkọ na emeghịe eme na ekwu na ọ na-anya ụgbọ ịnyịnya ya aga njem kwa ụbọchị na mbara igwe iji weta ihema yie ike ochịchị egwu.

Ihe kpatara ya bụ na Eze Ukwu Rom Lucius Domitius Aurelian (214-275), kpebiri ịhazi mmeme dịka etu ndị agha mba Rom si emebu.

Mara na oge ochie, ọ bụ ọtụtụ emume ha na-eme bụ chi ndị dị iche iche ka eji ha echeta.

Ụfọdụ mmemme ndị a ka eji echeta oge udu mmiri maọbụ oge ọkọchị.

Eziokwu bụ na enweghị onye ma ụbọchị amụrụ Kraịst kpomkwem.

Dịka ọkammuta ihe mere eme bụ Gerson Leite de Moraes siri kwuo, " Anyị amaghị ụbọchị maọbụ afọ amụrụ karaịst. ihe edere n'akwukwọ bịara dịka afọ iri anọ kamgbe kraịst nwụrụ".

Ndị Ọchichị Rome na emume Ekeresimesi.

Flavio Valerio Constantina

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Flavio Valerio Constantina e ji 'Constantine the Great' mara ya.

Eze mba Rome abụọ bụ Flavio Valerio Constantina (@72 - 337) na Flavio Teodosio (346-395) bụ ndị nyereaka hụ na ehiwere emume Ekeresimesi.

Gerson Leite de Moraes kwuru sị, " Ofufe Kraịst sitere na ofufe ndị a na-achọ ka egbuo were bụrụ ofufe ndị mba Rom niile".

Aha onyonyo, Christmas Carol: Lee etu ndị dara ogbi si a bụ abụ ekeresimesi

Ọ gara n'ihu kọwaa, " Dịka a na-ahụ Jesu dịka ihe nke ụwa, e jiri emume eji ncheta ọmụmụ Kraịst were dochie emume ncheta chị Anyanwụ bụ emume a na-akpọ Sol Invictus ( Nke pụtara ọmụmụ anyanwụ) na mba Rom.

Sol Invictus

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Chi Anynwụ bụ Sol Invictus

Nke apụtara na emume ncheta Kraịst nke ụbọchị 25 ọnwa Disemba niile bụ abụghị ihe achọpụtara achọpụta, kama ọ bụ site na nkwekọrịta ka ya bụ emume jiri bido.

Gerson Leite de Moraes kwukwara sị, " Mgbe ụka nke Kraịst na-ebido, ha ji ụfọdụ emume arụsị efe ofufe iji gosi na ụfọdụ omenala ka dịkwa ire.

Kama kedụ mgbe a mụrụ Jịsọs Kraịst n'eziokwu?

Ndị kammụta kwetara na-enweghị etu a ga-esi chọpụta mgbe a mụrụ Kraịst.

Ọkammụta ihe mere eme bụ André Leonardo Chevitarese kwuru sị, " Anyị amaghị mgbe a mụrụ Jesu Kristi. kama a na-eche na ọ ga-abụ mgbe ọchịchị Eze Herod nke Ukwu na-abịa na njedebe.Ihe dịka afọ nke anọ maọbụ nke isii tupu oge 'Common Era'".

Morase kwuru sị, " iji emume ofufe ọhụrụ dochie nke omenala bụ ihe a na-eme karị oge ochie".

Ọ bụ Pope Julius nke mbụ hiwere emume Ekeresimesi, dịka o ji ya dochie emume ncheta ụbọchị eji efe anyanwụ dịka iwu n'afọ 350. O ji atụmatụ mekpaa ofufe anyanwụ ahụ."

Chevitarese kwuru sị, " Dịka ọ dị ugbua, Kraịst na emume Sol Invictus bụ otu make emume a a na-eme n'ụbọchị 25 nke ọnwa Disemba afọ ọbụla.