Afcon 2025: Osimhen, Iwobi, Ndidi na ndị 'Super Eagles' ọzọ ga-agbara Naịjirịa bọọlụ

Ebe foto si, Super Eagles/X
Aha ndị ga-anọchiteanya Naịjirịa n'asọmpi Iko Afrịka (Afcon) nke afọ 2025 nke ga-ebiri ọkụ na Moroko n'abalị 21 nke ọnwa Disemba agbaala.
Ndị so na ya gụnyere:
- Ndịdi Wilfred
- Francis Uzoho
- Alex Iwobi (Ọgbaaetiti)
- Stanley Nwabali (ocheegoolu)
- Victor Osimhen (Ọgbaaihu)
- Amas Obasogie
- Calvin Bassey
- Semi Ajayi
- Bright Osayi-Samuel
- Bruno Onyemaechi
- Chidozie Awaziem
- Zaidu Sanusi
- Igoh Ogbu
- Ryan Alebiosu.

Ebe foto si, NFF/Facebook
Ndị ọzọ bụ
- Frank Onyeka (Brentford FC, England)
- Raphael Onyedika
- Tochukwu Nnadi
- Fisayo Dele-Bashiru
- Ebenezer Akinsanmiroc
- Usman Muhammed.
- Ademola Lookman
- Samuel Chukwueze
- Simon Moses
- Chidera Ejuke
- Akor Adams
- Paul Onuachu
- Cyriel Dessers
- Salim Fago Lawal.
Ihe ndị i kwesịrị ịma maka ndị ọgbabọọlụ a

Ebe foto si, Super Eagles/X
Victor Osimhen na-agbara otu egwu bọọlụ 'Galatasaray' nke mba Tọki ga-eso na ndị ga-agbara Naijiria ihu n'asọmpị a.
Alex Iwobi bụ onye ụfọdụ ma dịka nwa nwanne ọgbaabọọlụ a ma ama bụ Jay Jay Okocha mana nwaamadi a na-agbara otu egwu bọọlụ Fulham nke Ingland akajala nke na ọ na-azazị aha onwe ya dịka onye na-agba etiti.
Francis Odinaka Uzoho bụ ocheegoolu na-agbara otu egwu bọọlụ Omonia nke mba Cyrus bọọlụ.
Ụzoho abụghị ya mbụ ọ na-agbara Naijiria n'asọmpi Afcon dịka o sonyere nke a gbara n'Afcon afọ 2019.

Ebe foto si, Super Eagles/X
Calvin Bassey na-akwụ gidigbaa ka okwute n' ịgba azụ na-agbara otu egwubọọlu Fulham nke Ịngland kemgbe afọ 2023.
Ndidi Winifred na-agbara otu egwu bọọlụ ' Beşiktaş' nke mba Tọkị bụ ndị o sonyere n'ọnwa Ọgụstụ afọ 2025 bụ aka ochie n'ịgbara Naijiria bọọlụ.
O sonyere n'asọmpị Afcon nke afọ 2019, 2021 nakwa 2023.
Bruno Onyemaechi na-agbara otu egwu bọọlụ Olympiacos nke mba Greece bọọlụ.
Nke abụghị ya mbụ ọ na-agbara Naijiria bọọlụ n'asọmpi Afcon dịka o sonyere n'Afcon nke afọ 2023









