Odira Nwobu na-akwado ịkwaba n'ụlọ ọhụrụ ya n'ọnwa Disemba tupu ọ nwụọ- Arthur Scott, enyi ya
- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Onye dere ya, Marvelous Obomanu
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ebe foto si, Arthur Scott/Odira Nwobu/Facebook
Onye nhazi Odira Nwobu, onye Nọllywood a ma ama bụ Arthur Scott agbaala ama gbasara atụmatụ ụfọdụ Nwobu nwere tupu ọ laa mmụọ nke gụnyere ikwaba n'ụlọ ọhụrụ ya.
Odira Nwobu nwụrụ n'ụbọchị Mọnde 24 Nọvemba 2025, na Saụt Afrịka ebe ọ gara ezumike ka ọ gbachara afọ 43.
Na mkparịtaụka Scott na BBC Igbo nwere n'ụlọ ya dị na Legọs, o kwuru na Odira na-akwado ịkwaba n'ụlọ ọ na-ewu n'Ọwụwa Anyanwụ n'ọnwa Disemba ma bie na mpaghara ahụ ọbụladi otu afọ tupu ọ laghachikwa Legọs.
"Tupu ọ gawa Saụt Afrika, ọ gwara m na ọ bata, ọ rụchaa ihe niile fọrọ n'ụlọ ọ na-arụ n'Ọka ma kwaba na ya. Iwe m bụ na ụlọ ahụ o mefuru ego rụọ, ọ baghịzi n'ime ya tupu ọ nwụọ."

N'okwu akụkọ na-efegharị banyere etu Odira si nwụọ, Scott gbarụrụ ihu banyere ọtụtụ ebubo na-efegharị gụnyere akụkọ na e nyere ya nsi nakwa ọ ṅụrụ ọgwụ ike ma nwụọ n'elu nwanyị sị na akụkọ ndị ahụ nile bụ akụkọ ụgha.
'Ihe ndị mmadụ amaghị bụ na Odira na-enwe ọbara mgbalielu(HBP) kemgbe m ji mata ya., ọbụladi tupu ọ gawa Filipins, Odira na-enwe ọbaramgbalielu. Ọ na-ebugarị ogwụ ọbara mgbalielu agagharị. "
Scott gara n'ihu kọwara n'ozi o nwetara tupu enyi nwoke anwụọ na-arụtụ aka na ọbara ya gbaliri rue 200 n'ụbọchị foror ụbọchị ọ nwụrụ, ma kwupụta olile anya na ndị uweojii mee nnyocha zuru oke maka ihe gburu Nwobu. Kirie ihe o kwuru na uju.





