Burkina Faso: Gịnị mere Ọchịagha Ibrahim Traore ji ewu ewu n'etiti ndị ntorobịa Afrịka?

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Ousmane Badiane
- Ndị mere akụkọ a, Digital Journalist BBC Afrique
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
Ọtụtụ puku mmadụ gbakọrọ ụbọchị Wenezde Eprel 30, 2025 n'ogige Revolution Square dị n'Ouagadougou iji gosi nkwado ha nye ọchịchị Onyeisiala Ọchịagha Ibrahim Traoré.
Ngagharịiwe a na-abịa ka ọchịagha ndịagha AFRICOM mba Amerịka bụ Ọchịagha Michael Langley gwara Kọmitii na-ahụ maka ndịagha ụlọomeiwu Sịneti Amerịka na mbido ọnwa Eprel na ndịagha nwere ọchịchị na Bọkịna Faso na-eji ihe ọnatarachi nakwa ihe ọlaedo ha echekwa naanị onwe ma ghara ịchekwa ndị obodo.
Okwu Ọchịagha Langley kpalitere mmụọ ọtụtụ mmadụ na Bọkịna Faso nakwa mba ESA ndị ọzọ.
Gọọmenti mba Bọkịna Faso katoro okwu a Ọchịagha ndịagha Amerịka ma kwuo na ebumnobi ha bu imebi aha obodo ha.
Ọtụtụ mmadụ wepụtara ozi nkwado nye Ọchịagha Traoré n'akara Soshal Midịa ha dị iche iche.
Na X, ndị na-eti egwu, ndị na-ekwuru ndị enweghị enyemaka, ndị ndụ nakwa ndị Amerịka si agbụrụ Afrịka akatọọla okwu Ọchịagha Langley.
Nkwado a Ọchịagha Ibrahim Traoré na-enweta na-abịa dịka a na-enwe esemokwu nke ndị ọchịchị ọdịda anyanwụ kpatara na-aga n'ihu.
Ebubo nrụrụaka nke Ọchịagha Langley boro Traoré bụ nke e chere na ọ ga-emetụta ọchịchị n'ụzọ ọjọọ mana o meela ka ọchịchị ya nweta nkwado ọtụtụ ndị ntorobịa n'ụwa niile.
Kemgbe ọtụtụ afọ, Bọkịna Faso na-enwe nsogbu ndịagha nnupụisi nke kpatara ọnwụ ọtụtụ mmadụ ma chụọ ihe ruru nde mmadụ abụọ.
Kemgbe o banyere nọkwa ọchịchị n'ọnwa Septemba 2022, Ọchịagha Traoré kwere nkwa ibuso ndị omekome na-eyi ọha egwu agha. Ọ malitere atụmatụ inye ndị mmadụ ọrụ na ngalaba ụlọọrụ nchekwa (VDP), wulite ọrụ ndịagha ma nye ha nkwado.
Mbọ ndị a megide ndị omekome, emeela ka ọtụtụ ndị obodo ahụ malite ikwado ma na-eto ya.
Ọ bụghị naanị ihe gbasara ndịagha ka o mere. O wepụtara atụmatụ dị iche iche iji gbanwee ọnọdụ ndụ ndị Bọkịna Faso.

Ebe foto si, Getty Images
Okwu nwereonwe na okwu kwuru ọtọ
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Traoré nabatara okwu mmegide nye mkpagbu ma katọọ anya mba Fransi na-etinye n'ihe gbasara ha.
Atụmatụ ya ịhapụ otu G5, Sahel na Ecowas ma nabata mmekọ ha na mba Roshịa na Ịran, bụ nke gosiri nkwenye ya na nwereonwe.
Atụmatụ a bụ nke ọtụtụ ndị ntorobịa na-achọ nwereonwe ọchịchị na ezi akụnaụba obodo kwadoro.
Odeakwụkwọ ntaakụkọ na onyeisi ụlọọrụ International Centre for Studies and Reflection on the Sahel (CIRES) bụ Seidik Abba kwuru na ihe mere Ọchịagha Traoré ji ewu ewu n'etiti ndị ntorobịa bụ maka na ọ chọrọ nwereonwe.
Abba kwuru na nke mbụ bụ na ọ bụ onye chọrọ nwereonwe mba Bọkịna Faso. Ọ bụ onye na-achọghị mmekọ mba ofesi n'ihe gbasara Bọkịna Faso, nke a bụ ihe ndị ntorobịa chọrọ. Ọ bụ nke a mere ka ọ na-ewu ewu n'ebe ndị ntorobịa nọ.
N'okwu o wepụtara n'oge gara aga, o mere ka o doo anya na ọ chọrọ inweghachita nwereonwe ndị mba Bọkịna Faso.
Na Eprel 1, o kwuru na gọọmenti ya ga-ebu agha megide onye ọbụla chọrọ igbochi ọganihu mba Bọkịna Faso.
Ihe ọzọ bụ etu o si ekwu okwu. Ọ bụ o wezugara onwe site n'ihe ọbụla jikọrọ mba Fransi. O kwuru na ụlọọrụ mgbasaozi na-enye mba Fransi na ndị ọzọ nkwado. Etu o si ekwu eziokwu bụ ihe ndị ntorobịa chọrọ.
Ọ dị mkpa ka e lebanye anya na mmekọ Ọchịagha Traoré na ndị nkịtị obodo maka na ọ bụ onye chọrọ ọchịchị onyekwuouche ya n'agbanyeghị na ụfọdụ ihe na-echere ha aka mgba ka Daniel Eizenga bụ onye nnyochaa n'ụlọọrụ Centre for Strategic Studies for Africa bi na Washington DC kwuru.
Oge o nwere ọchịchị n'ike n'afọ 2022, Ọchịagha Traoré ji okwu nwereonwe nweta nkwado. Ọ kachasị n'ebe ndị ntorobịa nọ bụ ndị nọ na soshal midịa.

Ebe foto si, AFP
Ọ bụ Sankara ọhụrụ?
Ọchịagha Traoré bụ onye a maara dịka onye na-emegide mmakpa ahụ mba ofesi, ọkachasị mba Fransi nke ọtụtụ ndị ntorobịa na-akwado.
Atụmatụ ya inweta ịdị n'otu mba niile dị n'Afrịka bụ ihe ndị ntorobịa hụrụ n'anya.
Ọchịchị ndịagha jị ọchịchị na Bọkịna Faso na ndị ntorobịa na-enwe mkparịtaụka iji chepụta etu e ga-esi wulite ọnọdụ mba Bọkịna Faso. Ndị ntorobịa hụrụ ya na'anya maka na ọ hapụrụ ịnara ụgwọ ọnwa ya dịka onyeisiala ma kwuo ka a kwụọ ya ụgwọọnwa a na-akwụ dịka onyeisi ndịagha.
Daniel Eizenga kwuru nke a.









