George Moghalụ: Ihe m ji azọ ọkwa Gọvanọ Anambara Steeti bụ na nwata anyị tụrụ ahịa azụtaghị ihe a tụrụ ya

Aha onyonyo, George Moghalụ: Ihe m ji azọ ọkwa Gọvanọ Anambara Steeti bụ na nwata anyị tụrụ ahịa azụtaghị ihe a tụrụ ya
George Moghalụ: Ihe m ji azọ ọkwa Gọvanọ Anambara Steeti bụ na nwata anyị tụrụ ahịa azụtaghị ihe a tụrụ ya
    • Onye dere ya, Uche Akolisa & Donald wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist & Video journalist

Onye na-azọ ọkwa Gọvanọ Anambara steeti n'aha otu Labour Party na ntuliaka 2025 bụ George Moghalu agbarụọla ihu maka ọnọdụ ndakpọ nchekwa n'Anambara steeti.

Na mkparịtaka Moghalu na BBC Igbo nwere na nsonso a, o kwuru na oke ntọ, ogbugbu mmadụ na mpụ ndị ọzọ na-ebe na steeti ahụ emeela ka ndị si steeti ahụ na-agba ọsọ ịla ụlọ n'ihi egwu.

Ọ sịrị, "Nchekwa obodo anyị na-eme m ihere. Ndị ntọ atọghị mmadụ taa, ndị na-agbagbu mmadụ agbagbuo mmadụ. Ndị na-aga ohi a na-aga ohi.

"Ugbua, anyị na-agbazi nkwụ nwaanyị na mba. Ịgba nkwụ nwaanyị bụbụ ihe anyị ji akpa nganga mana ugbua ndị mmadụ na-atu egwu na i nwere ike ịbịa ime ya, a tọọrọ gị. Ugbua, ndị ọgaranya gawa ụlọ, ha kpọrọ ndị uweojii."

Moghalu kwere nkwa imezi nke a, ma tinye anya n' ime ka nri sụọ bịambịam n'Anambara.

O kwukwara na ya ga-ahazikwaa ọnọdụ ahụike na agụmakwụkwọ, ma gboo nsogbu mbuze na idemmiri na-akpa mkpamkpa na steeti ahụ.

Ihe ndị ị maghị maka George Muoghalu

George Muoghalu

Ebe foto si, George Muoghalu

I nwere ike ịma na George Moghalu bụ onye ndọrọndọrọ Ọchịchị a ma ama ma bụrụkwa onye ga-efere 'Labour Party' ọkọlọtọ na Ntuliaka Ọkwa Gọvanọ Anambara steeti a ga-eme n'abalị asatọ nke ọnwa Novemba, afọ 2025.

Onye Nnewi dị n'Okpuru Ọchịchị Nnewi n'Anambara steeti, a mụrụ Moghalu n'Aba n'afọ 1962.

Nne na nna ya bụ Ichie Gabriel Moghalu na Patricia Ifeyinwa Moghalu.

Nna ya bụ nnukwu ọgaranya na-azụ ahịa ma bụrụ onye nwe ụlọọrụ

Ọ gụrụ akwụkwọ praimarị n'ụlọakwụkwọ' Santa Maria Primary School, Aba nke a na-akpọzi 'Constitution Primary School,Aba.

Ọ gara 'Ngwa High School' Aba maka agụmakwụkwọ sekọndrị.

Mughalu gụkwara akwụkwọ na nnukwu ụlọakwụkwọ ' Institute of Management and Technology, (IMT) Enugwu nakwa Mahadum 'University of 'Abuja'.

Ọ rụọla ọrụ n'ọtụtụ ụlọọrụ gụnyere the 'National Inland Waterways Authority'(NIWA) bụ ebe ọ bụbụ onyeisi.

Ọ rụrụ ọrụ n'ọtụtụ ụlọọrụ gọọmentị A bụ ebe ọ nwere ọkwa welitere elu na-agbanyeghị na ọ bụ onye Anambara Steeti.

Mọghalụ kọwara ihe butere nke a: "Ọ bụ na Abia steeti ka m malitere ndọrọndọrọ ọchịchị. Anyị sonyere na otu Pati 'NRC' ,Chineke mee Ebere , onye anyị kwadoro oge e kere steeti bụrụ gọvanọ, late Dr Ogbonnaya Onu.

" Ya mere oge ọ na-ahọ ndị ọrụ ya, ọ gụnye m na ndị ọ chọrọ ka ha rụọra ya ọrụ, tinyekwuo na a gbara m mbọ oge ọ na-azọ ọkwa, Chineke tinye kwuo aka zaa m ekpere."