Etu iwu ịbata mba Briten ọhụrụ a ga-esi metụta ụmụakwụkwọ, ndị ọrụ ahụike na ndị ọzọ chọrọ ịga mba ahụ

Akwụkwọ ikike ime njem nke Naịjirịa na Briten

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Mba Briten ewepụtala usoro na iwu ọhụrụ nke metụtara usoro ndị chọrọ isi mba ọzọ abata na nke ha ga-eso.

Iwu ọhụrụ ahụ gbanwere ma hazịgharịa usoro ndị na-aga mba Briten maka agụmakwụkwọ, ọrụ ahụike nakwa ọrụ ndị ọzọ ga-esi abanye.

Nke a dị n'akwụkwọ iwu a kpọrọ 'white paper' nke ụlọọrụ na-ahụ maka ọpụpụ na mbata na mba Briten wepụtara n'ụbọchị Mọnde 12 Mee, 2025.

Ha kwuru na mmachi ndị dị n'akwụkwọ ga-enye aka belata igwe mmadụ na-abata na mba ha ruo ihe dịka mmadụ otu narị puku kwa afọ(100,000 per annum).

N'akụkọ a, anyị lebara anya n'ụfọdụ iwu ọhụrụ ndị a na ụzọ dị iche iche o nwereike isi emetụta ndị chọrọ ịga mba Briten maka ọrụ, ọkachasị ọrụ ahụike.

Etu ọ ga-esi metụta ndị ọrụ nlekọta mmadụ si mba ọzọ

Ụlọọrụ Gọọmenti, UK

Ebe foto si, website/Gov.Uk

Nkọwa foto, Ụlọọrụ Gọọmenti, UK

Usoro ọhụrụ e wepụtara maka ndị chọrọ ọrụ na ngalaba nlekọta mmadụ kwuru na ọ bụ ụmụafọ Briten bi na mba ha ka a ga-ebu ụzọ nye ọrụ nlekọta mmadụ tupu e lebara ndị si mba ọzọ anya.

E mere ya n'ụdị ka a ghara ịna-atụkwasị naanị ndị ọrụ nlekọta si mba ndị ọzọ obi karịa.

Mịnịsta na-ahụ maka ịbata na mba ahụ nakwa ihe gbasara ndị obodo bụ Seema Malhotra kwuru na "ndị bịara na UK maka ịkwado ọrụ nlekọta ndị kara nka kwesiri ịnwe ohere ịrụ ọrụ ahụ na-enweghị mkpagbu maọbụ mmegbu".

"Anyị ga-eme ka a ghara ịmetọ usoro ọhụrụ a. Onye dara iwu ya ga-ata ahụhụ dị na ya maọbụ ndị na-akpagbu ndị ọrụ nlekọta ndị nka si mba ofesi na-akwụ ha obere oge bụ nke ekwesịghị".

Etu mgbanwe ọhụrụ ahụ si metụta ngalaba ahụike

N'usoro ọhụrụ ahụ ga-ebuli ego ụgwọ a na-akwụ ndị ọrụ dịka dọkịnta, nọosụ, ndị nkuzi na ndị ọrụ ahụike dị iche iche.

Stephen Kinnock bụ Minista nke State maka ahụike kwuru na "ndị ọrụ na ngalaba ahụike so na ndị kachasị mkpa ma na-akwado ndị nwere nsogbu ahụike na mba anyị n'ụbọchị niile".

Ọ gara n'ihu kwuo na dịka ha na-achọ ị kwụsị ndị omekome na-akpagbu ndị ọrụ ahụike si mba ofesi bata na UK, ha ga-emekwa ka ndị ọrụ ahụike si mba ofesi nwete ihe ruuru ha.

Iwu ọhụrụ ndị a niile na-abịa dịka gọọment Briten na-achọ ị kwụsịtụ etu ndị mmadụ si abata na mba ahụ site n'ụzọ aghụghọ na ha bịara ịgụ akwụkwọ.

Ihe ndị Naịjirịa na-ekwu maka iwu ịbata UK ọhụrụ a

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Dịka iwu ịbata UK ahụ e nwepụtara ọhụrụ gbadoro ụkwụ n'ịbeneta mmadụ ole na-abanye na mba ahụ, ụmụ amaala Nịajirịa tinyere ọnụ n'etu o si metụta ha.

Iwu ọhụrụ ahụ mere ya ọ dị nnukwu ahụhụ mmadụ ịbanye n'UK ugbua ọkachasị ndị bụ ndị mba Naịjirịa nakwa mba ndị ọzọ nyiri ha.

Ụlọ ọrụ na-ahụ maka ịbata UK nwepụtara atụmatụ ga-eme ka e nwetuo usoro ịnweta ndị ọrụ na mba ndị ọzọ, mee ka ndị gụchara akwụkwọ na mba ahụ nwee ikike ịnọrọ naanị otu afọ na ọkara na mba ahụ na ha gụchaa akwụkwọ.

Ọ mekwara ka mmadụ nọrọ afọ iri tupuu onye ahụ nwee ikike ịnweta akwụkwọ ikike ịbụ nwa amaala mba UK.

Otu onye Naịjirịa gara ịgụ akwụkwọ n'UK kwuru na ya nwere naanị afọ atọ ka ya tinye akwụkwọ ị bụ nwa amaala Briten mana ya chọrọ "nkọwa ka ya mara na atụmatụ ọhụrụ ahụ a ga-emetụta ndị nọ na mba ahụ ugbua maọbụ sọ naanị ndị ọhụrụ na-abịa".

Onye ọzọ kwuru okwu bụ onye ọrụ aka. Ọ sị na"ebere nwanne m chọrọ ịbịa nọnyere m na-emere m ugbua maka na anyị na-achọ ịgbanwe mba ọzọ ọ ga-eje".

Nwoke ọzọ aha ya bụ Oludayo dere n'akara X soshal mịdịa ya sị "atụmatụ ọhụrụ ahụ UK nwepụtara ga-emetụta igwe mmadụ na Naịjirịa ọkachasị ndị gara ịgụ akwụkwọ nlekọta mmadụ nakwa ngaraba ahụike".