Jamb 2025: Ụmụakwụkwọ amalitela idegharị ule UTME n'ogige ule dị iche iche

- Onye dere ya, Marvelous Obomanu
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Onye dere ya, Michael Onyedikachi Ngene
- Ndị mere akụkọ a, Ntaakụkọ
- Ebeg o si, Abuja
- Onye dere ya, Donald Chika Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Ntaakụkọ Vidio
- Ebeg o si, Legọọs
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 7
Ụfọdụ ụmụakwụkwọ nwere ihe mkpọbi ụkwụ n'ule UTME afọ 2025, amalitela idegharị ule ahụ n'ogige dị iche iche na Naịjịrịa.
Cheta na ụlọọrụ Jamb kwuru na ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ụmụakwụkwọ dara ule ahụ maka na ha nwere ihe mkpọbi ụkwụ dịka igwe kọmputa arụghị ọrụ ọfụma nakwa ihe ndị ọzọ.
N'ihi nke a, onyeisi ụlọọrụ Jamb bụ Ọkammụta Ishaq Olarewaju Oloyede nyere iwu ka enye ụmụakwụkwọ dị etu a ohere idegahrị ule ahụ malite ụbọchị Fraịde 16 Mee, 2025.

Oge BBC Igbo gara n'ogige ule dị na mahadum Ebonyi State University, anyị hụrụ ọtụtụ ụmụakwụkwọ kwụrụ n'ahịrị ma na-eche ka oge ha ruo ide ule ahụ.
Ụmụakwụkwọ bịara ide ule, gwara BBC Igbo na e kewara ha n'agba dị iche iche iji hụ na ha nwere ohere ide ule ahụ.
N'ogige ule CBT dị n'okporoụzọ Olokoro Timber, Umuahia, ụmụakwụkwọ jupụtara ide ule ahụ kwụrụ n'ahịrị na-eche oge agba nke ha ga-edegharị ule ha.
Onye ọrụ Jamb anyị jụrụ ajụjụ etu ule ahụ si aga, ekwughị ihe ọbụla. Ọ gwara anyị na ọ bụ isi ụlọọrụ ha dị n'Abuja nwere ikike ikwu okwu banyere etu ule ahụ si aga.

Ebe foto si, Chidi Asonye
UTME 2025: Anyị enwetala akwụkwọ maka idegharị ule Jamb - Ụmụakwụkwọ

Ebe foto si, JAMB/Getty Images
Ụfọdụ ụmụakwụkwọ zutere ihe mkpọbi ụkwụ dị iche iche n'ule UTME 2025 ekwuola na ha enwetala akwụkwọ maka idegahrị ule alu ahụ.
Nke a na-abịa dịka ụlọọrụ Joint Admissions and Matriculation Board (JAMB) kwuru na ha ga-enye ụmụakwụkwọ dị etu a ohere idegharị ule ha.
Onyeisi ụlọọrụ Jamb bụ Ọkammụta Ishaq Oloyede, nọrọ ụbọchị Wenezde 14 Mee, 2025 oge ndị ntaakụkọ gbara ya ajụjụ ọnụ, kwuo na nnyocha ha mere, gosiri na ụmụakwụkwọ dị 379,997 bụ ndị nwere nsogbu n'ule ahụ.
Ọkammụta Oloyede gara n'ihu kwuo na ụmụakwụkwọ dị 206,610 dere ule ahụ n'ogige 65 na Legọs steeti dara, ebe ụmụakwụkwọ dị 173,387 dere ule UTME n'ogige 92 dị n'ọwụwa anyanwụ Naịjirịa dara ule ha.
Otu nwata akwụkwọ aha ya bụ Anion Mmesoma dere ule ya na Legọs steeti gwara BBC Igbo na o nwetala akwụkwọ idegahrị ule ahụ.
Mmesoma kwuru na o ji akara ule Jamb nyere oge mbụ o dere ule ahụ bipụta akwụkwọ ọ ga-eji degharịa ule ya ụbọchị Mọnde, Mee 19, 2025 na Legọs.
Nwataakwụkwọ ọzọ bụ Chidera Anagor kọwaara anyị na o nwetala akwụkwọ idegahrị ule nke ya. O kwuru na ọ bụ ụbọchị Satọde, 17 Mee, 2025 ka ọ ga-ede ya.
Cheta na Jamb wepụtara steeti ebe ụfọdụ ụmụakwụkwọ nwere nsogbu n'ule ahụ. Steeti ndị ahụ gụnyere Legọs, Enugwu, Imo, Abia, Anambra na Ebonyi.
N'aka nke ọzọ, e nwekwara ụmụakwụkwọ nọ na steeti ndị ọzọ kwuru na ha nwere ihe mkpọbi ụkwụ n'ule ha.
Ụmụakwụkwọ abụọ BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ, kwuru na ha gara na webụsaịti Jamb https://slipsprinting.jamb.gov.ng/printexaminationslip, ma soro ndụmọdụ dị n'ime ya.
Lee ihe Jamb kwuru
Maka okwu banyere ụmụakwụkwọ nọ na steeti ndị ọzọ na-ekwu na ha nwere ihe mkpọbi ụkwụ n'ule ha, BBC Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ Jamb bụ Fabian Benjamin iji chọpụta nke bụ eziokwu.
Ọ gwara anyị na enweghị steeti ọzọ ha chọpụtara nwere nsogbu n'ule ahụ.
N'okwu ya "Anyị mere nnyocha ma chọpụta na ọ bụ naanị Legọs, Enugwu, Imo, Abịa, Ebonyi na Anambra bụ steeti ụmụakwụkwọ nwere nsogbu n'ule UTME 2025".
Fabian Benjamin mere ka o doo anya na ohere idegharị ule ahụ bụ n'efu. Ụmụakwụwkọ agaghị akwụ ụgwọ ọbụla maka ya.

Ebe foto si, Jamb Website
Jamb ekwuola na ha ga-enye ụmụakwụkwọ ohere idegharị ule UTME
Dịka ụlọọrụ BBC Igbo gbara n'anwu na ọtụtụ ụmụakwụkwọ zutere ihe mkpọbi ụkwụ dị iche iche n'ule UTME afọ 2025, ulọọrụ Joint Admissions and Matriculation Board (JAMB) ekwuola na ha ga-enye ụmụakwụkwọ dị etu a ohere idegharị ule ha.
N'ozi JAMB wepụtara n'akara X ha, kwuru na ha achụpụtala na ụfọdụ ụmụakwụkwọ nwere ọtụtụ ihe dị iche iche cheere ha aka mgba n'ogige 157 n'ime ogige 887 e dere ule ahụ na Naịjirịa.
Ha kwuru na ọ bụ nke a mere ọtụtụ ụmụakwụkwọ ahụ ji daa ule ahụ nke ukwuu.
Ka ọ dị ugbua, JAMB kwuru na ha ga-akpọtụrụ ụmụakwụkwụ ndị o metụtara ka ha bipụta akwụkwọ ule ha iji kwado maka idegharị ule ahụ nke a ga-amalite ụbọchị Fraịde, 16 Mee, 2025.
JAMB: Etu akụrụngwa jiri chere anyị aka mgba n'ule UTME afọ 2025

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ụlọọrụ na-ahụ maka ule e ji abanye ụlọakwụkwọ ndị dị elu na Naịjirịa bụ Joint Admissions and Matriculation Board (JAMB) ekwuola na ha ga-enyocha ule nke afọ 2025 n'ihi mkpesa ndị mmadụ na-enye gbasara ọtụtụ ndị dara ule ahụ.
Ọtụtụ ndị mmadụ dere ule ahụ ma ndị nke gwara BBC Igbo okwu sị na ihe anya ha hụrụ n'ụbọchị ule ahụ, ọnụ ha agaghị akọnwu ya.
Ha kwụrụ na ajụjụ ule ha ezughị ezu, ụfọdụ enweghị ajụjụ kama naanị nhọrọ dịka ịntaneti mere ka ụfọdụ ghara ilecha ule ha.
Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ JAMB bụ Fabian Benjamin sị na ọtụtụ ndị mmadụ na-ezitere ha ozi dị iche iche gbasara mkpesa ụmụ ntorobịa ndị dara ule.
Ka ọ dị ugbua, Fabian Benjamin si na e nyochaa nsogbu ndị a chọpụta na ihe nile mere si ha n'aka, JAMB agaghị ala azụ imezu usoro mmezi kwesịrị ekwesị
Cheta na mkpesa a bidoro kemgbe JAMB wepụtara ọnụọgụgụ ndị dara ule ha nke gosiri na nde 1.5 n'ime mmadụ rụrụ nde 1.9 lere ule ahụ n'afọ 2025 nwetara akara na-erughị 200 n'ime akara 400 e nwere.
Nsogbu netwọk na ihe ndị ọzọ chere anyị aka mgba na Jamb - ndị ntorobịa
Dịka ụlọọrụ Joint Admission and Matriculation Board (JAMB) na-ahụ maka ule ụmụ akwụkwọ ji abanye mahadum na Naịjirịa kwupụtara n'ọtụtụ ụmụakwụkwọ dere ule n'afọ emeghị nke ọma, ụfọdụ n'ime ha ekwupụtala nsogbu dị iche iche ha gabigara mgbe ha na-ede ule ahụ.
Cheta na ụlọọrụ Jamb wepụtara ozi gosiri na n'ime mmadụ nde abụọ dere ule ha, naanị ihe dịka 420,000 nwetara akara ruru 200 nke na-egosi na 78% irughị akara 200.
Ajụjụ ụfọdụ apụtaghị na kọmputa m jiri dee ule JAMB mana ndị ọzọ nwere nsogbu ịntanetị - Ekeh Favour
Mgbe BBC gbara otu n'ime ndị dere ule JAMB bụ Ekeh Favour ajụjụ ọnụ ka o kwuru na ule Jamb afọ a bụ nke ugboro atọ ọ na-ede. O kwuru na ya dere ule ya n'otu n'ime CBT centa dị na Maitama nke isi obodo Abuja.
Ọ gara n'ihu kwuo na ụbọchi ule ahụ, na ndị Jamb gbụrụ oge nke ukwu tupu ha amalite ule mana ọ chọpụtara mgbe ọ na-ede ule Jamb na ajụjụ ezughị ezu ebe ụfọdọ ebughị ajụjụ kama o bu naanị azịza ya.
"Mgbe ule malitere, a chọpụtara m na abịa n'ajụjụ asụsụ bekee "English" ezughị ezu, dịka ajụjụ dịka ajụjụ nri apụtaghị. Nke a mere m ji kpọọ ndi na-elekọta ule ka ha bịa hụrụ ihe na-eme mana ha gwara m ka m hapụ ajụjụ ndị ahụ ma gaa n'ihu ịza ihe masịrị m."
"Ọzọ bụ na mgbe m malitere ịza ajụjụ, a hụrụ m na ajụjụ niile kwesịrị ịdị ọnụ ọgụgụ 165 mana ajụjụ kọpụta bupụtere m dị 145," Ekeh kwuru.
Ọ kọwaara na ọ bụ naanị ajụjụ na ezughị ezu bu nsogbu ya nwere mana ụmụ akwụkwọ ndi ọzọ nwere nsogbu dịka ịntanetị adịghị nke balatara oge ha kwesịrị iji aza ajụjụ ha.
Netwọk ebupụtaghị ule Bekee na Physics

Ebe foto si, Anion Mmesoma
Nwata akwụkwọ ọzọ tinyekwara ọnụ n'okwu a bụ Anion Mmesoma, onye nke ule Jamb afọ a na-eme ya nke ugboro abụọ.
Mmesoma kwuru na o dere ule nke ya n'ebe akpọrọ Ijegun na Legos steeti.
Mmesoma kwuru na nsogbu ya nwere mgbe ọ na-ede ule jamb afọ a bụ na ajụjụ asụsụ bekee ya "English" na "Physics" ezughị ezu mana ndị na-ahụ maka ule n'ụbochi ahụ gwara ya na o nwereike ịhapụ ajụjụ ndị ahụ maọbụ zaa ihe ọbụla masịrị ya maka na nsogbu ahụ si ụlọọrụ jamb na-aka.
"Ihe mere bụ na m gara n'ihu itinye ihe ọbụla masịrị m na ajụjụ ndị enweghị ajụjụ," Mmesoma gbakwunyere.
Kedụ ihe ụlọọrụ JAMB kwuru maka ebubo ndị a?
Mgbe anyị kpọtụrụ ndị Jamb ka ha tinye ọnụ na nsogbu a ụmụ akwụkwọ dere ule n'afọ 2025 kwụrụ, onye na ekwuchitere ha ọnụ bụ Fabian Benjamin si: "Anyị anaghị eji netwọk ele ule anyị, kama ọ bụ netwọk mpaghara ebe e dere ule. Otu o si na-adị, ọ bụrụ na nhọrọ dị n'isiokwu ajụjụ apụtaghị, a ga-enyocha isiokwu nke ahụ site na nke a hụrụ na ndị dịnụ."









