Ihe anyị ma mere EFCC ji nwụchie E-money

Foto Emeka Okonkwo bụ onye ji ego

Ebe foto si, Emeka Okonkwo/Instagram

Nkọwa foto, Foto Emeka Okonkwo bụ onye ji ego
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụlọọrụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) anwụchiela o ji ego achụ ego Emeka Okonkwo e ji E-money mara.

Ọnụ na-ekwuru ụlọorụ EFCC bụ Dele Oyewole gwara BBC na ọ bụ eziokwu na ha nwụchiri nwaamadị ahụ ụbọchị Mọnde 28 Eprel, 2025 maka ebubo imetọ egọ naịra nakwa ego mba ofesi oge ọ gara mmemme na Legọs.

Ebubo EFCC boro Emeka Okonkwo gụnyere imetọ ego dọla nke megidere iwu Foreign Exchange Act.

Ọ bụ n'ụlọ E-money dị mpaghara n'Omole Legọs ka a bịara nwụchie ya ma buru ya gaa Abuja.

EFCC mere ka o doo any ana ha ga-akpụpụ E-money ụlọikpe ngwa ngwa ha mechara nnyocha ha.

Onye bụ E-money?

E-money bụ onyeisi Five Star music.

Ebe foto si, Emeka Okonkwo/Instagram

Nkọwa foto, E-money bụ onyeisi Five Star music.

Emeka Okonkwo e ji E-money mara bụ onye Uli dị n'okpuru ọchịchị Ihiala, Anambra Steeti. A mụrụ ya n'Ajegunle Legọs steeti n'afọ 1981.

Ọ bụ onye ji ego achụ ego na-atụbata ma na-atụpụ ngwaahịa, azụahịa mmanụ ụgbọala na mkporindụ. Ụlọọrụ ya Emy Cargo and Shipping Service Nigeria Ltd na-ahụ maka ntụbata na-ntụpụ ngwaahịa na Naịjirịa nakwa mba ofesi.

A malitere ịkpọ ya E-money maka na ọ bụ onye na-enyere ndị mmadụ aka. Nwanne ya nwoke bụ otiegwu Kingsley Okonkwo onye e ji Kcee mara.

E-money bụ onyeisi Five Star music. N'oge gara aga, Five Star Music emepụtala ọtụtụ ndị egwu dịka Kcee, Skiibii, Harrysong na ndị ọzọ.

E-money gbara afọ 44 lụrụ nwunye ya Juliet Okonkwo onye mụtaara ya ụmụ nwoke atọ.