Ikpeazu, Etiaba, ndị ọzọ esonyela ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu - Ejimakor

Ebe foto si, Aloy Ejimakor/facebook
Otu n'ime ndị ọkaiwu Mazi Nnamdi bụ Aloy Ejimakor ekwuola na ndị ọkaiwu nwere agba mmadụ anọ ọhụrụ esonyela n'otu ndị ọkaiwu ga na-ekwuchitere onye ndu otu Indigenous People of Biafra (IPOB) n'ụlọikpe.
Ozi ọkaiwu Ejimakor wepụtara n'akara soshịa media ya X kwuru na ndị ọkaiwu ahụ gụnyere Ọkammụta Onyechi Ikpeazu (SAN), Emeka Etiaba (SAN), Mela Audu Nunghe(SAN) na dọkịta Joseph Akubo (SAN).
Ejimakor kọwaara na ndị ọkaiwu ahụ ga-esonyere ndị ọkaiwu ya mbụ nke gụnyere Kanu Agabi(SAN) na Uchenna Njoku(SAN) n'ọrụ ịgbachitere Nnamdi Kanu n'ụlọikpe.
Ọ gara n'ihu kwuo na ndị ọkaiwu ọhụrụ a ga-abịa n'ụlọikpe na 29 Eprel, abalị abụọ nke ọnwa Mee nakwa 6 Mee nke afọ 2025 bụ ụbọchị ụlọikpe tinyere ikpe Nnamdi Kanu.
Ndị ọkaiwu ole ga-anọchiteanya Nnamdi Kanu?
Dịka Ejimakor si were kwuo, ọ bụ ndị ọkaiwu mmadụ iri na itoolu ga-anọchiteanya Nnamdi Kanu n'ụlọikpe ugbua.
Ha gụnyere Kanu Agabi (SAN), Ikpeazu (SAN), Etiaba (SAN), Mela Audu Nunghe( SAN), Akubo(SAN, Njoku (SAN), Aloy Ejimakor, P.A.N Ejiofor, Maxwell Opara na Patrick Agazie.
Ndị ọzọ bụ Emmanuel Ezeugwu, Jude Ugwuanyi, Mandela Umegborogu, Maryfrances Orji, Ikenna Nwangwu, Emmanuel Agabi, Elom Christian, Charles Ude na Innocent Nwuche.

Ebe foto si, Aloy Ejimakor/X
Ka ikpe Nnamdi Kanu siri gaa n'Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abuja
Anyị ga-agbapụ ikpe Nnamdi Kanu ọsọ maka na ọ nọteela aka - Ọkaikpe Omotosho

Ebe foto si, Judges of the Federal High Court, Getty
Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abuja e kwuola na ha ga-agbapụ ya ọsọ iji hụ na e kpere Nnamdi Kanu ikpe ngwangwa maka na ikpe ahụ anọteela aka.
Ọkaikpe ọhụrụ e nyefere okwu ahụ bụ Ọkaikpe James Kolawole Omotosho kwupụtara nke a oge a na-ekpe onye ndu otu Indigenous People of Biafra ikpe n'ụbọchị Fraịde 21 Maachị 2025.
Ọkaikpe Omotosho kwuru na ọ bụ ihe na-agbawa obi na okwu ahụ anọọla afọ iri n'Ụlọikpe, ọ dịkwa ka e nweghị ihe na-eme.
Cheta na nke a bụ otu n'ime arịrịọ dị n'akwụkwọ ndị Ọkaiwu Nnamdi Kanu degaara nnukwu onye Ọkaikpe Naịjirịa bụ Kekere Ekun ihe dịka izu ole na ole gara aga.
Ka o sinadị, Kanu gọrọ agụgọ n'ebubo iyi ndụ egwu asaa gọọmenti Naịjirịa boro ya dịka e tinyeziri ikpe ya n'ụbọchị 29 Eprel, 2 Mee na 6 Mee, 2025.
Aka m dị ọcha n'ebubo niile e boro m - Nnamdi Kanu

Onye ndu otu Indigenous People of Biafra bụ Nnamdi Kanu ekwuola na aka ya dị ọcha n'ebubo asaa ndị gbakwasara ụkwụ n'iyi ndụ egwu gọọmenti Naịjirịa boro ya.
O kwuputara nke a dịka a malitegharịrị ikpe ya n'ihu Ọkaikpe James Kolawole Omotosho n'Ụlọikpe ukwu etiti dị n'Abuja.
Ka o sinadị, ụlọikpe kwuru na ha anabatala arịrịọ ka a gbapụ ikpe ahụ ọsọ n'ihi na ọ nọteela aka.
E kwuputara ụbọchị 29 Eprel, 2 Mee na 6 Mee, 2025 dịka ụbọchị ọhụrụ a ga-aga n'ihu ịnụrụ ikpe ahụ.
Ikpe Nnamdi kanu amalitela n'Abuja

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
A malitela ịnụrụ ikpe Nnamdi Kanu n'Ụlọikpe ukwu etiti dị n'Abuja.
Onye ntaakụkọ BBC News Igbo kọọrọ anyị na onyendu otu Indigenous People of Biafra na ndị Ọkaiwu ya wụchiri n'ụlọikpe ahụ maka mmalitegharị okwu ya ugbua e tinyere ya n'aka Ọkaikpe ọhụrụ.
Ọ kọọrọ anyị na Ọkaiwu na-anọchite anya Nnamdi Kanu bụ Kanu Agabi (SAN) tọgbọọrọ ụlọikpe ahụ akwụkwọ o ji rịọ mgbaghara n'aha Nnamdi Kanu.
Ọ sịrị na Nnamdi Kanu na-arịọ mgbaghara maka ikwu okwu n'olu ike dịka ọ kọwara na nke ahụ bụ n'ihi iwe dị ya n'obi.
Ndị o degaara akwụkwọ arịrịọ ahụ bụ Ọkaikpe Binta Nyako, Ọkaiwu na-anọchite anya gọọmenti bụ Adegboyega Awomolo na ndị Ọkaiwu na-ekwuchitere ya onwe ya.
Na nzaghachi, Ọkaiwu Gọọmenti Etiti bụ Adegboyega kwuru na ya agbagharala Nnamdi Kanu dịka ya bụ "onye na-ekpe mmadụ ikpe" na-abụghị "onye mkpagbu".
Ọkaikpe ọhụrụ na-elebara okwu ahụ anya bụ Omotosho jikwa aka ya rịọ mgbaghara n'aha Nnamdi Kanu.
O kwuru na dịka ya na-agụ ihe dị n'ime akwụkwọ ikpe Nnamdi Kanu, ọ chọpụtara na ụbọchị mbụ a kpụpụrụ nwaamadị ahụ n'ụlọikpe bụ n'afọ 2015 bụ oge ọ dị afọ iri anọ na asaa (47) mana ugbua ọ dịzi afọ iri ise na asaa (57).
O kọwara iwe dị Nnamdi Kanu n'obi dịka nke kwesịrị ekwesị ma kwuo na ọ bụ ihe na-agbawa obi na mmadụ gara ụlọikpe afọ iri mana ọ dị ka enweghị ebe ọ na-aga.
N'ihi nke ahụ, ọ rịọrọ ka a gbaghara ya.
Kedụ ihe a ga-ekpe n'ikpe Nnamdi Kanu dị n'Abuja taa?

Ebe foto si, Aloy Ejimakor/X
Nnamdi Kanu bụ onyendu otu chọrọ nnwereonwe ha na Naịjirịa bụ Indigenous People of Biafra (IPOB) ga-awuchi n'ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja taa bụ Fraịde 21 Maachị, 2025 maka ikpe dị n'etiti ya na gọọmentị Naịjirịa.
Nke a na-abịa dịka Ọkaikpe ukwu nke Naịjirịa bụ Kudirat Kekere-Ekunnyefere Ọkaikpe James Kolawole Omotosho ikike ileba anya n'ikpe ahụ dịka Kanu kwuru na ọ chọghizi ka Ọkaikpe Binta Nyako kpee ikpe ya.
Ihe a na-atụ anya n'ikpe a
A na-atụ anya na ikpe ahụ ga-amalite n'elekere itoolu nke ụtụtụ ga-ebido n'isi ilebagharị anya n'ebubo asaa nke gọọmentị Naịjirịa boro Kanu, nke gbadoro ụkwụ n'iyi ndụ egwu.
Cheta na Ụlọikpe kachasị na Naịjirịa nọọrọ n'ụbọchị 15 Disemba, afọ 2023 nye iwu sị ka Nnamdi Kanu ga-agaghachi n'Ụlọikpe ukwu zara ọnụ ya n'ime ebubo asaa ahụ, dịka Ọkaikpe Nyako kụpụchara ebubo asatọ n'ime iri na ise e boro ya n'afọ 2021 a nwụchiri ya ma kpọlata ya site na mba Kenya.
Otu n'ime ndị Ọkaiwu Kanu bụ Nnaemeka Ejiofor kwuru na ihe Ọkaikpe Omotosho ga-eleba anya bụ ọnụ ebubo asaa ndị ahụ fọrọ afọ
O kwuru na ndị Ọkaiwu gọọmentị ga-achọ ịgụpụta ebubo ndị ahụ n'ụlọikpe, ebe Ọkaikpe ga-enye Kanu ohere ịzara ọnụ ya kama na ha agaghị ekwe ka e nye ha ohere ịgụpụta ebubo ndị a maka na ha achịtaghị aja.










