Islamic Movement of Nigeria: Anyị ka ga na-eme ngagharịiwe rue na a tọpụ El-Zakzaky- Nwa ya nwaanyị
Akụkọ dị mkpa 31/7/19:
Nwa El-Zakzaky agbajọọla ọkwa na ndị Shiite akwụsịla ngagharịiwe

Ebe foto si, Sayyida Suhaila
Nwa El-Zazaky, onyeisi ndị otu ndị na-ekpe ụka Alakụba a kpọrọ 'Islamic Movement of Nigeria' bụ Suhaila Ibraheem Zakzaky ekwuola na ngagharịiwe otu ahụ ka ga na-aga n'ihu rue na a tọhapụ onye ndu ha.
Nke a bụ n'agbanyeghị na ọnụ na-ekwuru otu ahụ ahụ Ibrahim Musa kwuru n'ozi o wepụtara na otu ahụ ga-achịsatụ ọwa na ngaghariiwe ha na-eme iji tie mkpu ka a tọhapụ onye ndụ ha bụ El-Zakzaky e ji eji kemgbe afọ 2015.
Musa kwuburu na ịkwụsị ngagharịiwe bụ iji nye ohere ka a kpezie nsogbu ha na gọọmenti etiti nwere.

Ebe foto si, Getty Images
Mana Sayyida Suhaila Zakzaky, onye kwuru nke ya n'ihe onyonyo o wepụtara n' igwe okwu Facebook ụbọchị Tọzde, kwuru na ngagharịiwe ahụ ga na-aga n'ihu rue oge a tọhapụrụ El-Zakzaky.
Gọọmentị machiri otu Shia dịka ndị otu ndị oyiegwu maka ngagharịiwe ha mere n'abali olemole gara aga nke tara isi ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere otu onye uweojii na otu onye ntaakụkọ.
Ndị ndụ ndị Shiite sị na ha ga-aga ụlọikpe ịgbagha mmachi ahụ gọọmentị machiri ha.

Ebe foto si, Facebook/Femi Adesina
Onyeisiala Buhari ekwuola na gọọmenti ga na-ezipụ ndị agha na ndị agha ụgbọelu n'okporoụzọ awara awara iji buo agha megide ndị ntọ na ndị ojiegbeezu.
O kwukwara na ha nwere ike ịtụ ogbunigwe ebe ndị omekome na-ezo.
Buhari kwuru nke a n' ọgbakọ nchekwa ya na ndị eze ọdịnala ndị si Ọdịda Anyanwụ Naijiria nwere n'Abuja ụbọchị Fraide.
3. Ọ sị na ọchịchị ya kpebiri itinye igwe na-ese foto n'okporoụzọ iji gbaa ihe zoro ezo n'anwụ.

Ebe foto si, Facebook/Femi Adesina
4. Buhari kwekwara nkwa iwe ndị uweojii n'ọrụ site na ọkpụrụ ọchịchị niile dị na Naijiria.
5. O kwukwara maka ihiwe ndị ọrụ nche. Ọ gara n'ihu kwuo na onye ọbụla dara iwu ga-ata ahụhụ ma kwe nkwa ichekwa onye ọbụla ebe ọ masịrị ya biri.
Nzụkọ Buhari na ndị eze ọdịnala na-abịa dịka mkpu maka ntọ, ori nakwa iwakpo ụmụnwanyị n'ike nke a na-ebo ndị Fulani Ochiehi na-arị elu na mpaghara Ọdịda-Anyanwụ.
Ihedioha akwanyerela ụmụakwụkwọ tuuru ugo ugwu

Ebe foto si, Imo State Govt.
Ụmụafọ Igbo abụọ, Stephany Ugboaja na Favor Alozie bụ ụmụakwụkwọ kacha mee ọfụma n'ule WAEC nke afọ 2019 n'Imo State enwetela ugwu ruuru ha dịka aka na-achị Imo steeti bụ Gọvanọ Emeka Ihedioha kwere ha nkwa agụmakwụkwọ n'efu na mahadum ọbụla ha chọrọ.
Ha abụọ nwere A1 na 'subject' itoolu ha lere n'ụle ahụ.
Ebola ka na-akpakwa ike

N'ofesi, a na-atụ egwu na ọria Ebola nwere ike igbasa karịa na mba Congo DR dịka ọrịa ahụ gburu onye nke abụọ n' obodo Goma.
Ihe ruru mmadụ nde abụọ bi na Goma nke mere ka otu ahụike mbaụwa kwuo na Ebola nwere ike isi mba Congo gafee mba ndị ọzọ n'Afrịka.
Ụmụ Afrịka abụọ so bụru ọkacha agba bọọlụ n'ụwa

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuregwu, otu FIFA ewepụtala aha mmadụ iri nke a ga-esi n'ime ha họpụta otu onye a ga-echi ọkaịbe n'egwuregwu bọọlụ ụmụnwoke n'afọ 2019.
Ụmụ Afrịka abụọ bụ Sadio Mane na Mohammed Salah so na ndị ewepụtara aha ha, tinyekwara ndị amabu ama dịka Cristiano Ronaldo, Lionel Messi, na Eden Hazard.
A bịa na nke ụmụnwanyị, Lucy Bronze na Ellen White nke mba England, nakwa Megan Rapinoe nke mba Amerika so na mmadụ iri a họpụtara.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:
Lee ihe nkiri ga-amasị gị:










