Kidnapped Turkish men: A zọpụtaala ndị mba Turkey mmadụ anọ a tọọrọ
Akụkọ ndị dị mkpa taa bụ Fraide (26/7/2019):
A zọpụtaala ndị mba Turkey mmadụ anọ a tọọrọ

Ebe foto si, Nigeria Police Force
Ndị uweojii na Kwara steeti kwuru na ha azọpụtala ndị mba Turkey mmadụ anọ ndị ntọ tọrọ na steeti ahụ.
Onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ bụ Kayode Egbetokun gwara BBC na azọpụtara ha n'ime ọhịa ụbọịchị Friade, abalị 26 nke ọnwa Julai afọ 2019.
A nwụchiburu otu onye n'ime ndị ntọ ahụ ụbọchị Tọzde, ma nwetakwa ndị ogbo ya abụọ ụbọchị Fraide., nke mere ka ndị otu ha tọghapụ ndị ha ji.
A tọrọ Senerapal dị afọ 40; Seyit Keklik dị afọ 25; Yasin Colak dị afọ 33 nakwa Ergun Yurdakul dị afọ 35 bụ ndị ọrụ ụlọọrụ na-ewu ewumewu n'ụbọchị Satode gara aga ebe ha na-aṅụ mmanya n'ime obodo Gbale dị n'okpuru ọchịchị Edu, na Kwara steeti.
Ndị ntọ ahụ kwuburu ka e nye ha nde narị naira anọ , mechaa, gbadata na otu narị nde naira. Mana onyeisi uweojii kwuru na o nweghị ego a kwụrụ ha.
Ị hụla mpụtara WAEC ị lere n'ọnwa Mee na Juun?

Ebe foto si, Getty Images
Igwe mmadụ amalitela nchọpụta mpụtara ule WAEC ha lere n'ọnwa Mee nakwa Juun n'afọ a.
WAEC kpọrọ oku ka ndị mmadụ gaa mee nchọpụta mpụtara ha site n'akara Twitter ha.
Ha gosikwara usoro ndị mmadụ ga-esi mee nchọpụta a n'ịntanetị.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Lee ihe ha kwuru n'ịchafụ ebe a
- Gaa na site ha bụ waecdirect.org
- Denye akara njirmara ule gị n'ebe a ga-egosi gị
- Họpụta afọ i lere ule gị
- Họpụta ụdịrị ule ị lere
- Depụta ọnụọgụgụ dị na kaadị (ị ga-azụta)
- Depụta ọnụọgụgụ nzuzo kaadị gị
- Ị tinye ihe niile a, ị zipu ya site n'ụzọ ha gosiri ebe ahụ.
NYSC agbarụọla ihu maka asambodo adịgboroja si mahadum dị n'Afrika

Ebe foto si, @nysc_ng
Ngalaba gọọmenti na-achịkọta ndị na-efe ala nna ha bụ NYSC agbarụọla ihu dịka ha na-ebo ebubo na ụfọdụ mahadum n'Afrịka na-eresi ndị Naịjirịa etozughi etozu asambodo.
Ha kwuru na n'ọdịnihu, sọsọ mahadum ndị ụlọọrụ Naịjirịa na mba Afrịika dị icheiche nyochara ka ha ga anabata.
Na mba ofesi,

Ebe foto si, Getty Images
Mba Kenya ekwetala na ha ga-agụkọ nwoke, nwaanyị na ndị abụghị nwoke maọbụ nwaanyị na mba ha dịka ha na-akwado ibido ngụkọ mmadụ n'ọnwa Ọgọst.
N'egwuregwu,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
FIFA amachiela otu onye ọrụ ngalaba bọọlụ na Sierra leone bụ Abu Bakarr Kabba ma daa ya nha dọla puku iri ise ebubo ịna aka azụ na nrụrụaka ndị ọzọ n'ihe gbasara bọọlụ.
Gee Nkeji ebe a
Ozil na Kolasinac agbalahụla ndị ohi

Ebe foto si, Press Association
N'egwuregwu, ndị egwu Arsenal abụọ agbalahụla ọnwụnwa ndị ekperima abụọ chọrọ ịwakpo ha na London.
Akụkọ na-ekwu na onweghị ihe mere Mesut Ozil na Sead Kolasinac ebe ndị uweojii London ka na-achọ ndị mere ihe ahụ.
Ozil ji ụgbọala ya bụ Mercedes G Class 4x4 na ebe akpọrọ Golders Green Road mgbe ndị ohi ji ọgbaatumtum wakporo ha.
Mgbe ihe mere, Ozil hapụrụ ụgbọala ya gbaba n'otu ụlọnkwarị ebe a na-ere nrị ndị mba Tọọkị akpọro Likya ebe Kolasinac majawara ndị ahụ.
Ndị na-ere nri ebe ahụ bịara nyere ha aka chuwa ndị ekperima ahụ.
Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-abata taa

Ebe foto si, Facebook/Femi Adesina
Onyeisiala Muhammadu Buhari nọ mba Liberia bụ ebe ọ ga-esonyere gọmenti mba ahụ n'emume ncheta mwere onwe ha.
Dika akwụkwọ ọkụekwe ya bụ Garba Shehu tinyere aka, Buhari ga adabatakwa Naịjirịa taa bụ Fraịde.
Ogbunmigwe agbala n'ogige IDP na Maiduguri

Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ na-eru anyị ntị bụ na ndị a na-eche na ha bụ Boko Haram gbara ogbunigwe n'ebe ndị gbara ọsọ ndụ na-anọ n'obodo Dalori dị nso na Mahadum Maịduguri.
Otu nwata akwụkwọ nọ na Mahadum Maịduguri kwuru na mgbọ tụrụ ụmụakwụkọ abụọ na- ekpe ekpere n'ime Mahadum ahụ.
EU achawala Boris Johnson ọkụ

Ebe foto si, @BorisJohnsonTwitter
Dịka Boris Johnson malitere ọru ka Praịm Minsita nke Mba Briten ndị EU agwala ya na ha aghịdị ege ya ntị maka atụmatụ o wepụtara maka Brexit
Maazi Johnson chọrọ ka ahazigharịa nkwekọrịta Briten na EU nwere maka ọpụpụ ha na otu ahụ.


































