Anyị na-enyocha ọnwụ nwaanyị e gburu n'ugbo n'Enugu - Ndị uweojii

Ndị uweojii
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ndị uweojii Enugwu steeti ekwuola na ha na-enyocha ọnwụ nwaanyị e nwetara ozu ya n'ugbo ya dị na Nchatancha dị n'Emene, Enugwu steeti.

Nke a na-eme dịka ndị ntọrọbịa mpaghara Nike na Nchatancha dị n'Emene mere ngagharịiwe maka ọnwụ Pat Ngwu nke ha na-ebo ndị ọchịehi ebubo igbu nwaanyị ahụ ma tọgbọ ozu ya nso ikpere mmiri.

Ụmụokorobịa ji osisi ma mụnye 'tyre' ochie wụjuru okporoụzọ mana ndị uweojii bịara chụsaa ha.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Ebere Amaraizu, gwara BBC n'ezie na e nwetara ozu otu nwaanyị nwụrụ n'ugbo ya, onye o kwuru na 'Anyị na-enyocha ihe gburu nwaanyị ahụ."

"E nwetara ozu nwaanyị n'ebe ọ gara ọrụ na Nchatanchata na mpaghara Emene Enugwu."

N'okwu ngagharịiwe e mere, Amaraizu kwuru na ndị uweojii gbalịrị mee ka ebe niile dajụọ ka ọ ghara ibute tigbuo-zogbuo.

"Ka ọ dị ugbua, anyị na-esi imi n'ala iji mata ihe mere ya."

Amaraizu kwuru na ya enweghị ike ikwu ụdị ọnwụ nwaanyị ahụ nwụrụ.

O kwuru na ya "enweghị ike ikwu na nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ ọ dị ime, ọ bụ onye dọkịta ga-agwa anyị ma ọ dị ime maọbụ na ọ dịghị ime".

Akụkọ ga-amasị gị: