Herdsmen clash: Ndị ochiehi abụọ emerụọla ahụ n'ọgụ ehi na-efu efu n'Owere

Ebe foto si, Getty Images
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Orlando Ikeokwu ekwuola na ndị Fulani ọchịehi merụrụ ahụ maka okwu ehi na-efu efu na-anata nleta n'ụlọọgwụ ugbua.
Ndị ochiehi abụọ enwetala onwe ha n'ụlọọgwụ 'Federal Medical Centre', Owere maka okwu gbasara ehi na-efu efu.
Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na otu onye Fulani ọchịehi gara n'ohịa ebe nwanna ya na ehi ya nọ were sụọ ya mma ka ọ na-arahụ ụra, kpọrọ ehi ndị o nwere gbalaga chee na onye ọ sụrụ mma anwụọla.
Mana onye Fulani ọchiehi ọzọ hụrụ ihe mere bekuru ndị ọchịehi ndị ọzọ were mma sụkasịa ya ma nata ya ehi ndị o zuru.
Ikeokwu kọwara na "Ọ bụ ndị obodo kpọrọ ndị uweojii si 'Agbala Police Division' oku ndị buru mmadụ abụọ ndị a buga ha ụlọọgwụ 'Federal Medical Centre', Owere n'ihi nghọtahie gbasara ehi na-efu efu."




