Ndigbo: Ọgbaehi bụ ịtụnye ego ọha n'ahịa onwe
Otu Ohanaeze na ndị Igbo ọnụ na-eru n'okwu akatọọla atụmatụ gọọmentị etiti mapụtara ịrụ ọgbaehi na steeti iri na Naijiria.
Ha kwuru na ọ bụ ihe jọgburu onwe ya gọọmentị iwere ego ọha were na-ahaziri ndị nọrọ onwe ha ihe ha ji achụ ego aka ha.
Ngalaba gọọmentị etiti na-ahụ maka ihazi akụnaụba ala anyị nke a kpọrọ,'National Economic Council (NEC)' na bekee nke osote onyeisiala bụ Yemi Osibanjo nọ n'isi ya, binyere aka n'akwụkwọ atụmatụ ịkpa anụmanụ n'afọ iri na-abịa nke a kpọrọ 'National Livestock Plan' na bekee.
N'ime atụmatụ ahụ nke ga-eri ijeri naira 179, gọọmenti etiti nwere ebumnobi ikewapụta ọgba ehi (ranches) iri itoolu na anọ na steeti iri.
N'okwu ya, onye bụbu onyeisi Aka-Ikenga bụ Goddy Uwazuruike sị: "Ịchị ehi (maọbụ nke Igbo maọbụ nke Awụsa) bụ ihe mmadụ na-emere onwe ya. Kedu ka ị ga-esi were ego ọha nwere were tinyere ndị ụfọdụ ka ihe ha na-eme na-aga ọfụma?"
Ọkaiwu Chima Nnaji kwukwara otu ihe ahụ. Ọ sị:
"Ihe gbasara ịchị anụmanụ bụ ahịa mmadụ na-azụrụ onwe ya, ọ bụghị gọọmentị. Ọ bụrụ na-emebe ya otu a, ụmụ Igbo na-anya ụgbọala."
Steeti ebe a ga-ebido atụmatụ 'National Livestock Plan' dịka gọọmenti siri kwuo, gụnyere Adamawa, Benue, Edo, Ebonyi, Kaduna, Nasarawa, Oyo, Plateau, Taraba, na Zamfara.
Mịnịsta na-ahụ maka ọrụugbo bụ Audu Ogbeh na onye nchịkọta atụmatụ ahụ bụ Andrew Kwasari nakwa gọvanọ na-achị Benue bụ Samuel Ortom bụ ndị nọchitere NEC oge ha na ndị isi ụlọọrụ akụkọ nwere ọgbakọ na'Abụja, gbara atụmatụ a n'anwụ.
Ogbeh kwuru na,"ịchị ehi akpagharị adabaghịzị,"
O kwụkwara na ndị ga-eritekarị erere atụmatụ ahụ bụ ndị ọchịehi.

Akụkọ ndị ozọ ga-amasị gị:










