Nigerian Kidnapping: Anwụchiela 'eze mmụọ' ndị ntọrị na mpaghara ugwu

Ndị uweoji Naịjiria

Ebe foto si, Getty/AFP

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onye na-arụ ọrụ dịka onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Abubakar Adamu kwuru site na mbọ ha na-agba ikpochapụ ohi na mpụ na Naịjirịa, ndị ọrụ ya anwụchiela papa ukwu ndị ntọrị.

Salisu Abubakar, bụ onye ndị uweojii sị na ọ bụ 'eze mmụọ' ndị ntọrị na ndị omekaome na mpaghara ukwu dabara n'aka ndi uweojii ka ha mechara nyocha site na ogige ha kpọrọ "Operation Puff Adder" na Bekee.

Ndị ọrụ nyocha uweojii kwukwara na ha nwụchịkọrọ mmadụ 18 ọzọ bụ ndị ntọrị na ndị oji egbe ezu ohi na mpaghara dị iche iche na Naịjirịa (Kaduna, Katsina, Niger na Kogi), dịka akwụkwọ ọnụ na-ekwuru uweojii bụ Frank Mba zipuru ụbọchị 28 nke Epreelu.

Ndi uweojii sị na ha natara egbe AK-47 dị 22, egbe ọka ise na ọtụtụ mgbọ egbe.

Ndi uweojii nwere mkpebi na ọ bu ndị ha ji na-akpa ụfọdụ n'ime ike a na-akpa na Kaduna steeti nakwa ebe ndị ọzọ dị nso na ya, dịka igbu otu eze akpọrọ Agom Adara n'ukpuru ọchịchị Kajuru n'ọnwa Ọktoba 2018.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ha sị na agbanyeghi na ndị a aka ha ji nọ na otu dị iche iche, ọ bụ "eze mmụọ ha bụ Salisu Abubakar jikọtara ha dum.

Ọ bụ ndị uweojii si IRT, TIU na mpaghara ndị ọzọ so mee nyocha a mịtara mkpụrụ.

Gịni bụ "Operation Puff Adder"

Ọ bu n'ọnwa Epreelu nke 2019 ka onye na-arụ ọrụ dịka onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Abubakar Adamu na ndị agha nakwa ndị DSS hibere atụmatụ a.

Atụmatụ a bụ ihe ha chọrọ iji memina ndị omekaome na ndị ntọrị na-enye Naịjirịa nsogbu, ọkachasị na mpaghara ugwu ahụ.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ọ bu na Oshogbo, isi obodo Osun steeti, ka emere emume malite atụmatụ a.