Atiku Abubakar na Saraki nọ Amerịka
Akụkọ dị mkpa:
Atiku azochiela na mba Amerika

Ebe foto si, @Atiku
Okwu banyere njem onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha PDP bụ Atiku Abubakar gara na mba Amerịka bụ ihe a kpụ n'ọnụ ugbua.
Atiku zochiri n'Amerika ụbọchị Tọzde, nke mere ya ihe karịrị afọ iri o jiri tụ ụkwụ na mba ahụ.
Atiku onye kwupụtara nkea n'igwe okwu Twitter ya kwuru na ya bịara maka mkparịtaụka ya na ndị ọrụ gọọmentị Amerika nakwa ụmụ Naijiria bi ala ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Nke a na-eme dịka ụfọdụ na-ekwu na o nweghị ike ị ga mba ahụ n'ihi ebubo nrụrụ aka na-eche ya na mba ahụ.
Ihe na-ewu na soshal midia
Akụkọ na Atiku abanyela Amerịka butere ọnụ n'etiti ndị ihe ya na-amasị n'elu igwe okwu soshal midia.
@bolanle_cole kwuru na ọ ga-ebutere ndị ihe Atiku na-asa afọ obi ịdamba.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
@ebuka_akara jụrụ ụfọdụ ụmụ Naijiria ndị kwuru na Atiku agaghị abali Amerịka kedụ ka eke si anya anwụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Mana ụfọdụ ndị ihe Atiku anaghị amasị kwuru na ihe o jiri nwe ike ganwuo bụ na ya na Bukola Saraki, onye ha kwuru nyere ya nchekwa ka ndị gọọmenti Amerika ghara ịnwụchi ya(diplomatic immunity).
@SviewLily kwuru na ọ bụ maka na a kpọchiri ọchịchị mba Amerika ka Atiku jiri nwelie ike ị ga- ebe ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Aka anyị adịghị na nsogbu APC- Gọọmentị Abia steeti

Ebe foto si, @okezieikpeazu
Gọọmenti Abia steeti agọọla aka na ụkwụ ha, na aka ha adịghị n'ọgbaghara dị na otu pati APC na steeti ahụ.
Kọmịshọna mgbasaozi steeti ahụ bụ John Okiyi kwupụtara nke a n'ọsịsa ebubo nke onyeisioche APC bụ Adams Oshiomole boro na ọ bụ gọọmenti PDP n'Abia na akwanyere Ikechi Emenike, onye na-azọsara uche Ogar ikike iji ọkọlọtọ APC na steeti ahụ.
Okiyi kọwara ebubo a dịka nke na-atọ ọchị, ma kwuo na nke a ""egbeọnụ ndị enweghị ihe ha chị na ndọrọndọrọ ọchịchị, ndị enweghị ike ịchịkọba onwe ha ọnụ maka usoro ọchịchị."
O kwukwara na otu pati PDP na steeti ahụ na-akwado gọvanọ Okezie Ikpeazụ, bụ onye ọ kọwara dịka ọkacha mma na Naijiria taa.
Agaghị m ada mba n'ibuso ndị na-eme nrụrụaka agha na Naijiria - Buhari

Ebe foto si, @bashirahmad
Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadụ Buhari ekwusiala ya ike na ọ ghaghị ibu agha megide ndị Naijiria bụ ndị e ji mpụ na nrụrụaka mara.
O kwuru nke a mgbe ọgara achụmnta vootu na Wọrị nke dị na steeti Delta.
Buhari kwusiri ya ike na ya agaghị ele anya na-azụ n'ịkwụsị ọgụ nke ọchịchị ya na-alụ megide mpụ, ma kwee nkwa na ya agaghị agharịpụ ntụkwasị obi nke ndị Naijiria nwere n'ebe ọchịchị ya nọ.
Ọ bụ ịhe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị butere mkpụpụ CJN n'ụlọikpe - Shehu Sani
Sinatọ Shehu Sani akọwaala atụmatụ a ọchịchị etiti ji chọọ ịkpụpụ okaikpe ukwu Naijiria n'ụlọikpe nke Code of Conduct dịka nke a chọrọ ime n'ihi ntụliaka nke Febụwarị.
O kwuru nke a mgbe a na-agba ya ajụjụ n'ihe omume Channelstv a kpọrọ 'politics today'.
Onye sinatọ a si steeti Kaduna, kwuru na ihe a na-eme ugbu a bụ atụmatụ gọọmenti etiti ji chọọ iwakpo ngalaba na-ahụ maka iwu na Naijiria, ka ha wee nweta mmeri.
Ọdụziri gọọmenti etiti ọdụ ka ọkwụsị ịga n'ihu na mbọ a ọ na-agba iji menye ọkaikpe Ọnnọghen ihe ihere.
A gbagbuola onye ntaakụkọ nzuzo mba Ghana

A gbagbuola Ahmed Hussein, onye ntaakụkọ mba Ghana soro wee kpughe nrụrụaka dị na otu egwu bọọlụ mba ahụ.
Nchọpụta Hussein soro mee mere e jiri chụọ onyeisi otu FA nke Ghana. Ka ọ dị ugbua ndị uweojii na-enyocha ihe merenụ.
Jose Mourihno: Ike agwụbeghị n'ọrụ nchịkọta

Ebe foto si, Reuters
N'egwuregwu, Jose Mourihno ekwuola na ya ka dị obere ịla ezumike nka n'egwuregwu bọọlụu, na ya ka chọrọ ịna-arụ ọrụ ịchịkọta bọọlụ.
Okwu ya na-apụta dịka a chụchara ya n'orụ dịka onye nchịkọta otu egwu Bọọlụ Man.United.
Atiku sị na mpụ ga-adi na ntuliaka 2019

Ebe foto si, Getty Images
Onye na-azọ ọchịchị n'okpuru pati na-anọghị n'ọchịchị bụ PDP bụ Atiku Abubakar ekwuola na obi esighi ya ike na mpu na aghụghọ aghaghị abanye ntuliaka na-abịa
Atiku kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC nwere.
O kwuru na okwu afọ ole ọ dị abụghị okwu dị mkpa na ndọrọ ndọrọ a na-eme.
O Kwukwara na ọ chọrọ ịgbanwe ndị isi ọrụ nchekwa ma rịọ ka ndị mba ofesi tinye anya hụ na aghụghọ abanyeghị na ha bụ ntuliaka.
Na mkparịtauka ọzọ Atiku mere ụnyaahụ, o kwuru na ya agaghị echegharị maka ire ngalaba na-ahụ maka manụ agbịdi bu NNPC.
Atiku si; "a ga m ere NNPC!", ma kwukwa na ya ga-eme ka ndị enye ya baa ọgalanya n'ọchịchị ya, "mana ọ bụghị n'ọzọ ezighi ezi".
Buhari sị na ọgaghị abụ mbụ ma ya daa

Ebe foto si, Getty Images
N'akụkọ yiri ibe ya, Onyeisiala Muhammadu Buhari sị na ya bụrụ na ọ daa na n tuliaka a nke a n'abịa, ọgaghị abụ ihe ọhụrụ.
Buhari kwuru nke a mgbe ya na osote ya bu Yemi Osinbajo na onye ntaakụkọ Kadaria Ahmed mere mkparịtaụka n'ogige nrụrụtaụka akpọrọ THE Candidates na NTA.
Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ na mwakpo Kenya arịara

Ebe foto si, Reuters
Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ na mwakpo ụloọrịrị na mba Kenya eruola iri abụọ n'otu dịka ụlọọgwụ ebe ndị mmadụ na-enye ọbara pụtara ịkwu na ọbara ha nwetara ezuola.
Onyeisiala mba Kenya bụ Uhuru Kenyatta kwekara nkwa na ndị kpara mkpamkpa a ga-ezute ntaramahụhụ n'aka ya.
Nrụrịtaụka BBC n'Imo ga-akpọtụ echi

Ọ ga-akpọtụ n'Owerri n'ụbọchị Fraịde bụ abalị iri na asatọ nke Jenụwarị a
A ga-enwe nrụrịtaụka n'etiti ndị na-azọ ọkwa gọvanọ n'Imo bụ nke BBC Igbo na-ahazi.
Ebe ha ga-akọwara ndị Imo Steeti ọrụ ha ga-arụ ma ha baa n'ọchịchị.










