David Lyon: Onye bụ nwoke a meriri ntụlịaka na Bayelsa?

Ebe foto si, @iamLyondavid
Ọ bụ n'ụbọchị Sunde ka INEC weliri aka David Lyon dịka onye ga-achị Bayelsa steeti n'ọkwa Gọvanọ.
David Lyon bụ onye otu All Progressive Congress APC ji vootu 352,552 merie Diri Duoye nke Peoples Democratic Party PDP nwetara 143,172.
Nke a bụ mbụ n'ime afọ iri abụọ onye si otu pati n'abụghị PDP zọtara ọkwa Gọvanọ na steeti ahụ site n'ọchịchị Diepreye Alamieyeseigha, Goodluck Jonathan, Timipre Sylva (nakwa Nestor Binabonọchịrị anya gọvanọ Bayelsa n'otu ọnwa n'afọ 2012) nakwa Seriake Dickson nọruru ugbua.
Dị ka ọ dị ugbua, onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ezigarala ya ụkpa ekele maka mmeri ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

End of X post, 2
Mana ajụjụ dị ọtụtụ mmadụ n'ọnụ ugbua bụ "onye bụ David Lyon?"
Ihe ndị ịmaghị maka David Lyon
- Davido Lyon Perewonrimi bụ onyeisi Darlon Security and Guard bụ ụlọọrụ nchekwa adịghị n'aka gọọmentị.
- Ọ bụghị aha a ma ama n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị na
- Ọ bụ onye ụmụnna 'Olodiana' nke dị n'okpuruọchịchị Southern Ijaw.
- Ọ gbara afọ iri anọ na itoolu bụ 49.
- Ọ zọbuola ọchịchị ụlọomeiwu ukwu n'okpuru otu PDP n'afọ 2011.
- Ọ gbahapụrụ otu PDP fere na APC n'afọ 2015.