FUTA: Anyị ga-ata ụmụakwkwọ wakporo ibe ha ahụhụ

Akụkọ maka ụlọakwụkwọ

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndị isi 'Federal University of Technology Akure(FUTA) ekwuola na ha ga-ata ụmụakwụkwọ Mahadum ahụ na-emegbu nwata akwụkwọ nwaanyị ibe ha n'onyonyo na-efegharị n'elu soshal midia ahụhụ.

Ọnụ na-ekwuchitere Mahadum ahụ bụ Adegbenro Adebanjo n'ime ozi o zitere BBC kwuru na ha ga-enyocha ka ha chọpụta ihe butere ya bụ mmegbu karị were ndụ nwata nwaanyị ahụ akụrụ ihe.

O kwuru na Mahadum FUTA na-ese ihu nye ya bụ agwa ma na-ekwu na ha ga-emeriri ihe niile iwu na-echekwa ụmụakwụkwọ kwuru gbasara ndị kpara agwa ọjọ a.

Adebanjo kwuru na Mahadum ahụ na-eleta ya bụ nwata akwụkwọ nwaanyị etikasịrị ihe n'ụlọọgwụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ondo steeti bụ Femi Joseph kwuru na otu nwata akwụkwọ ọ gaghị akpọpụta aha ya kpọrọ ya gwa ya maka mmegbu a mana ọ dụrụ ya ọdụ ya kpesara ụlọọrụ ndị uweojii ọbụla kachasị dị nso.

Joseph kwuru na nwata akwụkwọ ahụ akpọbeghị ya gwa ya ma ọ gazikwara kpesa nke ndị ọrụ ya.

Aha onyonyo, SexforGrade: Ihe ndị mmadụ na-ekwu banyere ya

O kwuru na ọ bụrụ na ya bụ ihe mere n'ụlọ obibi ụmụakwụkwọ dị na Mahadum, ha ga-esi n'aka ndị isi FUTA nwuchie ya mana ọ bụrụ na o bi n'ụlọ n'adịghị n'ogige Mahadum, ha ga-eji aka ha ga nwuchie ya.

O kwuru na etu o si na dị , ha ga-anwụchiriri onye kpara agwa ọjọ a.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia maka onyonyo a na-efegharị

Ohakwe Prince tinyere ọnụ n'okwu site n'ịkọwa ihe ọhụrụ n'onyonyo a.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Cindy Oluchi kwuru na e kweisiri ịnwụchị nwoke mere ihe a.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Blank kwuru na ọ bụrụ na anwụchịghị onye kpara agwa a na ọ ga-adị mma ka emechie FUTA.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Aeroplane House: Nwoke ji maka ịhụnanya rụọ ụlọ ụgbọelu