Zachary Maduka: Ihe Govanọ Otti kwuru maka ọnwụ ya

Alex Otti, aka na-achị Abia steeti

Ebe foto si, Alex Otti/ Facebook

Nkọwa foto, Alex Otti, aka na-achị Abia steeti

Aka na-achị Abia steeti akatọọla ogbugbu e gburu otu onye Labour Party na steeti ahụ aha ya bụ Maduka Zakari.

Nke a pụtara ihe n'ozi onye ndụmọdụ ya pụrụiche bụ Ferdinand Ekeoma wepụtara.

Otti ji ohere ahụ kpọọ ndị ọrụ nchekwa niile oku ha gbaa mbọ chọpụta ndị kpara arụ a ma kpee ha ikpe ziri ezi.

"E kwere m nkwa na anyị ga-akwudoro ezinaụlọ ya ma nye ha nkwado ọbụla ha chọrọ" ka ozi ahụ kwuru.

Otti chetakwara Zakari a ma dịka 'Power Zac' dịka onye dopuru onwe ya iche n'obodo site n'ọrụ ọ na-arụ megide ntọ ndị mmadụ.

Ihe anyị ma maka Maduka Zakari ndị 'unknown gunmen' gbupụrụ isi n'Abia

Ndi bu egbe

Ndị uweojii Abia steeti ekwuola na ha na-ama imi n'ala ịchọpụta ndị gburu otu nwoke welitere isi n'otu Labour party n' Okpuru Ọchịchị Isikwuatọ ụbọchị Wenezde.

Ndị amabeghị ndị ha bụ wakporo Zachary Maduka gbara afọ 70 gbagbuo ya ma gbupu isi ya dịka ọ nọ ebe a na-aṅụ mmanya n' Amelechi Akpukpa dị na Isikwuato , Abia steeti.

Maduka a ma ama dịka 'Power Zack' bụ onyeisi otu achụmtavootu Amobi Godwin Ogah bụ omeiwu na-anọchite mpaghara Isuikwauto/umunneochi nke Abịa steeti n'Ụlọnnochiteanya Naijiria.

Maduka bụkwa onye ndu otu Uturu Development Association búkwa otu nche obodo ya.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abia steeti bụ Maureen Chinaka kwuru n'ozi mgbasaozi o binyere aka ma wepụta n'ụbọchị Tọzde kwuru sị,

"N'ebe Elekere Asatọ na ọkara nke abalị nke ụbọchị 13 nke ọnwa Septemba afọ 2023, onyeisi ogige ndị uweojii nwetara ozi banyere ogbugbu Zachary Maduka, ama dịka "Power Zack', gbara afọ 70, onye Ezieke Akpukpa Uturu."

" A wakporo Maduka, gbagbuo ya ma bepụ ya isi oge ọ nọ ebe a na-anụ mmanya n' obodo Amelechi Akpukpa."

Chinaka gara n'ihu kwuo na ndị uweojii na ndịagha gara ebe ihe mere ngwangwa ha natara ozi, buru ozu Maduka buga n'ụlọozu 'Marist Mortuary Uturu' dịka ha setachara foto ọnọdụ ya oge ha rutere.