Gịnị mere na mwakpo a sị 'Unknown Gunmen' wakporo CID nke Abia Steeti n'abalị Wenezde?

Dịka akụkọ na-efegharị na ndị omekome wakporo ụlkọọrụ CID nke dị n'ụzọ Uzuakoli, Ibeku dị n'isi obodo Naijirịa, BBC garụrụ ebe ahụ iji mara ihe mere.
Nchọpụta BBC Igbo na-egosi na-awakporo ndị uweojii abụọ na-arụ ọrụ n'okporoụzọ dị n'ihu ụlọọrụ CID ma nara ha egbe ha n'ụbọchị wenezde.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Abia Steeti bụ Geoffrey Ogbonna kwuru na ya bụ ihe mere n'ezie ma sị na ndị uweojii abụọ ahụ dị ndụ ma na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ ugbua.
Ogbonna kwuru sị, "Ọ bụghị isi ụlọọrụ CID nke Abia Steeti ka awakporo n'ihe dịka elekere asaa na ụma nke abalị, kama ọ bụ ndị uweojii na-arụ ọrụ 'Operation Stop and Search' ka awakporo".
O kwuru sị, "Enweghị onye nwụrụ, ebe niile nọ mma ugbua".
Ihe onye ntakụkọ BBC igbo ji anya ya hụ mgbe ọ ga ruru ebe ahụ

Onye ntaakụkọ BBC Igbo garuru ebe ahụ chọpụtara na a gbachiri ụzọ esi abanye ogige CID agbachi.
O kwuru na ndị nwere mkpesa maọbụ mkpa ọzọ na-anọkarị n'ụzọ a ma onweghị onye ọ hụrụ ebe ahụ taa.
BBC Igbo chọpụtara na ndị na-ere ihe n'ogige ahụ pụtakwara na-ere ahịa ha n'enweghị ụjọ ọbụla.
Ụgbọala sịkwa ebe ahụ agafe na-enweghị mgbochi ọbụla.
BBC Igbo pụtara na ndị uweojii na-apụtakarị ma kwuru n'ihi ụlọọrụ CID a arụ ọrụ ịnyocha ndị na-eme njem.











