A banyere m n'ọrụ ịgbakọta igwe ọkụ iji chekwaa ihe nketa nna m - Ada De Welder

Aha onyonyo, A banyere n'ọrụ ịgba igwe ọkụ iji chekwaa ihe nketa nna m - Ada De Wielder
A banyere m n'ọrụ ịgbakọta igwe ọkụ iji chekwaa ihe nketa nna m - Ada De Welder
    • Onye dere ya, Ikechukwu Kalu & Kelechi Anozia
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist & Video Journalist

Otu nwada na-agbakọta igwe ọkụ bụ Rachel Anyanwụ e ji 'Ada De welder' maara akọwaala etu na ihe mere o jiri banye n'orụ ịgba igwe ọkụ.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Anyanwu kwuru na ọ banyere n'ọrụ a iji chekwaa ihe nketa nna ya.

O kọwara na nna ya bụ onye ọrụ na-agba igwe ọkụ a kpọro 'wielder', na mgba ha ka bụ ụmụaka na ọ na-aga n'ụlọọrụ nna ya ilegharị anya ma na-enyere ya aka n'ụfọdụ ihe.

O kwuru na mgbe nna ya nwụrụ, na ọ bịara na-enwe nwute n'obi ma na-achọ ịhụ nna ya anya ọzọ, nke a mere na ojiri kpebie ịbanye n'ọrụ ahụ nke e ji maara nna ya.

Ada na-akpụ ụzụ igwe
Nkọwa foto, Ada na-akpụ ụzụ igwe
Ada De Welder kwuru na ụfọdụ ihe ndị ọ na-arụpụta bụ 'igwe e ji echekwa ụzọ, ụzọ igwe, akwa ndịna ụmụakwụkwọ na nke ndị ụlọọgwụ, mpio igwe dgz.
Nkọwa foto, Ada De Welder kwuru na ụfọdụ ihe ndị ọ na-arụpụta bụ 'igwe e ji echekwa ụzọ, ụzọ igwe, akwa ndịna ụmụakwụkwọ na nke ndị ụlọọgwụ, mpio igwe dgz.

"Nna m bụ onye ọrụ ịgba igwe ọkụ, mgbe m bụ nwata, anyị na-aga n'ụlọọrụ ya ilegharị anya ma nyekwara ya aka.

"Mana mgbe ọ nwụrụ, ịhụ nna m anya ọzọ na-agụ agụụ, m na-enwe nwute na obi ọjọọ.

"M sị, ọ bụrụ na m banye n'ọrụ e jiri maara nna m, ọ ga-eme ka obi ọjọọ na-eme kwụsị.

"Ọ bụ etu ahụ ka m jiri malite ịmụ ọrụ ịgba igwe ọkụ, kamgbe ahụ obi ọjọọ m a-eme akwụsịla."

Mgbe 'Ada De Welder' na-agba igwe ọkụ

Anyanwu kwuru na ọ na e nwere ụfọdụ ihe ndị cheere ya aka mgba n'ọrụ ahụ nke gụnyere ibufgharị igwe ndị a ma ọ na-arụ ọrụ kama na ndị nwoke nọ ya nso na-enyere ya aka.

Ọzọkwa bụ na ụfọdụ ndị mmadụ katọrọ ya mgbe ọ na-eme ọrụ a ma sị na ọ bụ ọrụ ụmụnwoke.

Kirie ihe ndị o kwuru n'uju;

Mgbe nwada na-arụ ọrụ