A banyere m n'ọrụ ịgbakọta igwe ọkụ iji chekwaa ihe nketa nna m - Ada De Welder
- Onye dere ya, Ikechukwu Kalu & Kelechi Anozia
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist & Video Journalist
Otu nwada na-agbakọta igwe ọkụ bụ Rachel Anyanwụ e ji 'Ada De welder' maara akọwaala etu na ihe mere o jiri banye n'orụ ịgba igwe ọkụ.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Anyanwu kwuru na ọ banyere n'ọrụ a iji chekwaa ihe nketa nna ya.
O kọwara na nna ya bụ onye ọrụ na-agba igwe ọkụ a kpọro 'wielder', na mgba ha ka bụ ụmụaka na ọ na-aga n'ụlọọrụ nna ya ilegharị anya ma na-enyere ya aka n'ụfọdụ ihe.
O kwuru na mgbe nna ya nwụrụ, na ọ bịara na-enwe nwute n'obi ma na-achọ ịhụ nna ya anya ọzọ, nke a mere na ojiri kpebie ịbanye n'ọrụ ahụ nke e ji maara nna ya.


"Nna m bụ onye ọrụ ịgba igwe ọkụ, mgbe m bụ nwata, anyị na-aga n'ụlọọrụ ya ilegharị anya ma nyekwara ya aka.
"Mana mgbe ọ nwụrụ, ịhụ nna m anya ọzọ na-agụ agụụ, m na-enwe nwute na obi ọjọọ.
"M sị, ọ bụrụ na m banye n'ọrụ e jiri maara nna m, ọ ga-eme ka obi ọjọọ na-eme kwụsị.
"Ọ bụ etu ahụ ka m jiri malite ịmụ ọrụ ịgba igwe ọkụ, kamgbe ahụ obi ọjọọ m a-eme akwụsịla."

Anyanwu kwuru na ọ na e nwere ụfọdụ ihe ndị cheere ya aka mgba n'ọrụ ahụ nke gụnyere ibufgharị igwe ndị a ma ọ na-arụ ọrụ kama na ndị nwoke nọ ya nso na-enyere ya aka.
Ọzọkwa bụ na ụfọdụ ndị mmadụ katọrọ ya mgbe ọ na-eme ọrụ a ma sị na ọ bụ ọrụ ụmụnwoke.
Kirie ihe ndị o kwuru n'uju;




