Jonet Makeover: Nwaada ji ntecha jikọọ Buhari, Tiwa Savage na Pete Edochie ọnụ
Ebube Jane Richard dị naanị afọ iri abụọ na atọ (23) mana o sebala aha ya n'obi ndị mmadụ.
Ebube sere foto Chadwick Boseman bụ ome ejije na Hollywood ọrịa kansa gburu, tinye ya n'ịntanetị na-amaghị na ọ ga-enwuru ọkụ.
Nke a butere anya ndị mmadụ n'ihe ọ na-eme, nke bụ iji ihe ntecha Bekee kpọrọ Makeup agbanwe ihu nke ya ka ọ dị ka ihu ndị a ma ama.
O seela ndị gụnyere Onyeisiala Muhammadu Buhari, ome ejije Pete Edochie, otiegwu Tiwa Savage nakwa Phyno.
Kedụ etu o si mụta ya?
Ebube kwuru na ọ bụ oge e mechiri obodo iji gbochie mkpamkpa ọrịa coronavirus na-akpa ka o jiri malite iji ntecha agbanwe ihu ya etu a, na ọ naghị emebu ya mbụ.
Ọ kọwara ebe ga-amasị ha ịhụ onwe ya n'ọdịnihu.
Gee ihe o kwuru n'uju ebe a:
Onye mere akụkọ a bụ Nnamdi Agbanelo.