Frank Nweke Jnr: Nye m otu afọ, mmiri ga-agba n’Enugu
Frank Nweke Jnr: Nye m otu afọ, mmiri ga-agba n’Enugu
Onye na-azọ ọkwa gọvanọ n’aha otu All Progressive Grand Alliance bụ Frank Nweke jnr, ekwuola na ọ ga-eweghachi mmiri ọgbụgba n’Enugwu ma ya banye n’ọchịchị dịka gọvano.
Nweke kwuru nke na mkparịytaụka ya na BBC nwere banyere ebunobi ya nye ndị Enugwu ma ọ bụrụ na o nweta ọkwa dịka Gọvanọ ha na ntuliaka na-abịa.

O kwukwara na ya ga-ebo mkpa ime ka Enugwu na gbburugburu ya dị ọcha dịka atịtị wegharala ọtụtụ ebe n’Enugwu, o kwukwara na ya na ndị ọrụ nchekwa ga-ejikọ aka weta na njedebe nsogbu ndị ọchị ehi na-awakpo ndị mmadụ na ugbo ha n’ime ezi dịcha na steeti ahụ.






