Charles Soludo viral video: 'Ndị anọghị na pati anyị kpụgharịrị ihe onyonyo m'-Soludo

Ebe foto si, Charles Soludo/Facebook
Gọvanọ Anambara steeti bụ Ọkammuta Charles Soludo ekwuola na ihe onyonyo ahụ fegharịri ebe a sị na Soludo kwuru na ya na ndị omeiwu abụghị ndị Apga agaghị arụkọ bụ aka ọrụ ndị abụghị pati nọ na gọọmentị bụ o boro ebubo ịkpụgharị ihe onyonyo ya iji mechuo ya ihu.
Ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia na nsonso a gosiri ebe Soludo na-agwa igwe ndị mmadụ gbakọrọ n'ọgbakọ n'Ọka ,isiobodo Anambara steeti ka ha tụnyere ndị ji aha otu APGA azọ ọkwa ụlọomeiwu steeti ahụ, sị na ọ bụ naanị ndị nọ na pati ya nwere ohere ịgwa ya ihe mmepe obodo ọ ga-etinye na mpaghara ndị ha na-anọchite
Soludo , onye kwuru nke a site n'olu ọnụ na-ekwuru ya bụ Christain Aburime sịrị, " A kpara ihe onyonyo ahụ aka gwogwo."
"Ọ bụ aka ọrụ ndị otu pati anọghị n'ọnịchị bụ ndị chọọ itinye ọgbaghara n'etiti gọvanọ na ndị Anambara mana ọ gaghị erer ha."
Ọ gara n'ihu kwuo na a maara Soludo dịka onye na-akwado ọchịchị onye kwuouche ya, na ọ dị njikere ya na ndị omeiwu ọbụla atụnyere ịrrụk ọrụ maka ọdịmma ndị Anambara steeti.
O kwukwara na dịka steeti Apga chị ọgbọọ , na ndị Anambara ga-atụnyere ndị otu Apga na ntuliaka na-abịa.
'Okwu Gọvanọ Anambra megidere ikike onyekwuoucheya, iwu Naijiria- Ndị ọkaiwu

Ebe foto si, Charles Soludo
Ndị ọkaiwu ekwuola na ihe Govanọ Anambra steeti bụ Charles Soludo kwuru banyere ịwọ ndị omeiwu abụghị dị pati ya oke n'ihe mmepe na mpaghara ndị ha na-anọchite na steeti ahụ megidere iwu Naijiria nakwa ikike onyekwuouche ya.
Ọkaiwu Collins Okeke sịrị n'okwu ahụ megidere iwu Naijiria.
Okeke sịrị,"O megidere iyi gọvanọ ṅụrụ oge ọ banyere n'ọkwa."
" O kwesịrị ịbụ Gọvanọ ndị Anambra nile ọ bụghị gọvanọ nanị ndị na-akwado pati ya."
"Iwu Naijiria nke 1999 Akụkụ nke 38(Section 38) na 42 kwuru sị na onye ọbụla nwere ikike inwe echichi masịrị ya banyere ọchịchị masịrị ya ."
"Nke 42 machiri ịkpa oke megide onye maọbụ ọbụla n'ihi nkwenyeọbụ echiche ha banyere ndọrọndọrọ ọchịchị."
N'otu aka ahụ, Ọkaiwu Adigwe Elivira Salleras kwuru na "ikwu ụdị ihe, ọkachasị ịgwa ndị agụghị akwụkwọ ụdị ihe bụ ihe iyi egwu nke nwere ike ịkpachi ha ịtụnyere onye ha chọrọ vootu".
" O megidere ikike mmadụ ikwu uche ya,isonye n'otu masịrị onye.
"Onye ọbụla na-emegide nke a, na-emegide iwu Naijiria."

Ebe foto si, Charles Soludo/Facebook
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Aka na-achị Anambra steeti bụ Charles Soludo ekwuola na ya na ndị omeiwu steeti ahụ abụghị ndị otu Apga agaghị arụkọ ma ọ bụrụ na-atụnyere ha vootu na ntuliaka na-abịa.
Soludo kwuru nke a na nsonso a n' ọgbakọ ya na ndị otu Apga nwere n'Ọka, isiobodo Anambara steeti tupu ntuliaka a kwadoburu ime n'abalị 11 nke ọnwa Maachị, afọ 2023 mana ihe onyonyo ya malitere wuwe na soshal midia ụbọchị Tọzde.
Ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka tinyeburu ntuliaka gọvanọ nakwa ụlọomeiwu steeti n'abalị 11 nke ọnwa Maachị, afọ 2023 ma hihari ya gaa abalị 18 nke ọnwa Maachi iji nye ha o here ịhazi igwe Bivas maka ntuliaka ahụ.
N'ihe onyonyo ahụ nke ndị ntaakụkọ na ndị na-akwado pati ya gbakọrọ, Soludo kwuru na ọ na-atụ anya na ndị mmadụ ga-apụ tụọọ Apga vootu n'igwe sị, sịrị,,
“Maka onye mụ na ya ga-anọ na-arụ ya ga-abụ onye Apga, Ị tụọrọ onye ọzọ, ị mara na ọ bụ sọ ụgwọọnwa ya ka ọ ga na-eri.”
“ A kwụọ ya ụgwọọnwa ya, ọ laa be ya.”
“ Onye nọ n’ụlọoemiwu anaghị arụ okporoụzọ,ọ naghị arụ ụlọọgwụ, ọ naghị ụlọakwụkwọ, maka ego ole ka o nwere.”

Ebe foto si, Charles Soludo/Facebook
“Ọ bụ mụ bụ gọvanọ na-arụ ya. Ọ bụ onye mụ na ya dị mma, onye mụ na ya nọ na pati bụ ya ga-enwe ohere ọ bata ọ gwa m lekwa ihe. ”
“Ọ bụ onye nke m ka ị ga-akpọ m n’ekwentị aza m.”
“ Ọ bụ onye pati m ga-abụ o nwe ozi e ziri n’ụlọomeiwu , o zie m.”
Otu APGA

Ebe foto si, APGA/Facebook
Otu 'All Progressives Grand Alliance' ,APGA n'ịchafụ bụ pati Chekwas Okorie hiwere n'afọ 2003.
Otu a anọọla n'ọchịchị n' Anambara steeti ogologo oge.
Ndị chịarala steeti ahụ dịka Peter Obi, Willie Obiano nọrọ n'ọkwa ọchịchị dịka gọvanọ n'aha Apga.
Ọtụtụ ndị omeiwu n'ụlọoeiwu steeti ahụ bụkwa ndị Apga.
Apga nwekwara ọtụtụ ndị omeiwu n'Ụlọomeiwu Nta Naijiria(mmadụ asatọ; atọ n'ime ha bụ ndị Anambra;










