Anyị akpụpụghị Soludo n’ihu arụsị ọbụla n'ihi Peter Obi – Ohanaeze Ndigbo

Ebe foto si, Peter Obi/Facebook
Otu Ohanaeze Ndigbo ekwuola na ha akpụpụghị Gọvanọ Anambra Steeti bụ Chukwuma Soludo n’ihu arụsị ọbụla maka okwu o kwuru banyere Peter Obi.
Ha kwuru nke a n’akwụkwọ ozi odeakwụkwọ ha bụ Alex Ogbonna wepụtara dịka kepu kepu na-efegharị na ha kpụpụrụ Soludo n’ihu Arụsị Chokoleze nke Mbaise nakwa Ubiniukpabi nke Arochukwu.
Ha kwuru na akụkọ ahụ bụ asị ọcha ma kwuo na Ohanaeze Ndigbo anaghị aga n’ihu arụnsị iji gboo nsogbu metụtara ndị Igbo.
Ha gara n’ihu kwuo na nzukọ ha mere n’ụbọchị 15 Nọvemba, 2022 nke onyeisi ha bụ George Obiozor nọ n’isi ya, na ọ bụ okwu banyere onye Igbo ịbụ onyeisiala ka ha lebara anya.
Otu a kwuru na-agbanyeghi na ha kwudoro atụmatụ ka Onyeisiala Naịjirịa 2023 bụrụ onye Igbo na ha anaghị ewega aha mmadụ nye arụsị n’okwu ikpe udo.
Cheta n’ụbọchị Mọnde, Gọvanọ Soludo wepụtara akwụkwọ ozi ebe o kwuru ọtụtụ ihe banyere ọchịchị Peter dịka Gọvanọ Anambra Steeti nakwa ihe mere ọ gaghị e mere n’ọkwa Onyeisiala Naịjirịa.
Nke a mere ọtụtụ ndị mmadụ ọkachasị ndị Igbo sepụtara isi jiri na-akatọ okwu a Soludo kwuru banyere Peter Obi.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Soludo: Charly Boy, Uwazururike asaala Soludo n’okwu banyere Peter Obi

Ụfọdụ ndị ọnụ na-eru n'okwu n'Ọwụwa Anyanwụ ekwuola na aka na-achị Anambara steeti bụ Charles Soludo wụrụ onwe ya n'ala site n'ozi o zisara megide onye na-azọ ọkwa Onyeisiala 2023 n'aha Labour Party bụ Peter Obi.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Soludo kwuru n'ozi o wepụtara ụbọchị Monde(14/11/2022), na Peter Obi agaghị achịta aja na ntuliaka 2023, na ọ kara ndị Igbo mma ịgakwuru ndị na-azọ ọkwa onyeisala na pati abụọ kachasị na Naijiria nwee nkwekọrịta maka ọganihu ndị ala Igbo n'ọdịnahu.
Onye bubu onyeisi otu aka Ikenga, bụ Ọkaiwu Goddy Uwazuruike katọrọ Soludo, sị n'okwu ahụ jọgburu udele sigbu nkakwụ.
Uwazuruike gwara BBC Igbo n'ekwentị na "Ọchịchị si aka Chukwu".
"Agwa ọjọọ ka agwa ọjọọ bụ ihe Soludo mere."
"Nwa afọ Igbo ọbụla aghọtaghị na ọgụ Peter na-alụ bụ maka anyị ncha, a ga-ajụ onye mụrụ ya."
O kwuru na nkwado a na-enye obi bụ maka ihe ọrụrụ mbụ nakwa ezi agwa ya.
N'otu aka ahụ, otiegwu a ma ama bụ Charles Oputa ama dịka Charly Boy, onye kpọrọ "Soludo "ngwugwu ihe adịghị ekechiri nye anyị" gwara ndị ntorobia ka ha ghara ji okwu Soludo kpọrọ ihe.
N'okwu ya,"Soludo enweghị ihe okwu ya bụ na ndọrọndọrọ taa. Ndị Obidient agala ịsa ya okwu."
" Peter Obi na-azọ ọkwa Onyeisiala Naijiria, ọ bụghị nke otu mpaghara."
"Bikonu, ebe uche na anya anyị dị bụ n'agwa na ihe ndị na-azọ ọkwa onyesiala merela."
Cheta na na nsonso a, Soludo katọrọ Peter Obi na mkparịtaụka ya na Channels TV mere ebe ọ nọ kwuo na ụlọego a si na Obi nyere nAnambra steeti enweghị ihe ọ mụtara nwere isi.

Ebe foto si, Peter Obi/Facebook
Gọvanọ Anambra Steeti bụ Chukwuma Soludo edejuola akwụkwọ ebe ọ na-azaghachị nkatọ ndị katọrọ maka okwu o kwuru banyere ọchịchị Peter Obi ji aha Labour Pati azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa.
Nke a dị n'akwụkwọ ozi o wepụtara na soshal midia ya bụ nke otu n'ime ndị na-ekwuru ya bụ Ejimofor Opara gwara BBC Igbo n'ezie na ọ bụ Soludo ji aka ya dee ya.
Soludo kwuru na ọ gaaraghị azaghachị nkatọ ndị a kama na ọ chọrọ ka o doo ewu na ọkụkọ anya ma gbazie onye ọbụla olu banyere ọchịchị Obi.
Kedụ ihe ndị Soludo kwuru?

Ebe foto si, Chukwuma Soludo/Facebook
- N’okwu ya “Otu onye okenye n’Anambra Steetị gwara m ka m hapụ itinye ọnụ n’ihe ọ kpọrọ ‘Peter Obi na agha soshal midia ya’ maka na onye ọbụla maara na o nweghi ebe o ji azụ aga, na ọ chọrọ onye ọ ga-ata ụta.”
- “Ndị mmadụ na-asị na m na-emere Peter Obi anya ụfụ, Ana m emere ya anya ụfụ m wee sị ya lọghachịte na APGA n’ọnwa Maachị 2022 bịa ọzọ ọkwa Onyeisiala? Nke a bụ okwu ịkpaọchị a-amitaghị mkpụrụ ọbụla.
- Ọ gara n’ihu kwuo na ya Peter Obi dịka ụmụnne, ha lụchaa ọgụ n’oge ndọrọ ndọrọ ọchịchị mana ha emezie ma ṅụkọọ mmanya n’oge emume.
- “Ọ tụrụ m n’anya na Peter Obi hapụrụ PDP ma banye na Labour Pati na-enweghi mgbọrọgwụ, iji mekpaa PDP ahụ ma na-apụ ha vootu.”
- Mgbe m gwara Obi bịa zọọ ọkwa Onyeisiala n’aha APGA, emere m ka ọ mata na ọ bụghị maka na ọ ga-emeri kama na ọ bụ ka anyị wulite ma chịkọta onwe anyị ọnụ n’okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
- “Na nzaghachị, Obi rịọrọ ma ka nye ndị Anambra ohere ka ha họrọ onye dị ha mma na ntuliaka ọkwa Onyeisiala Naịjirịa nke mere m jiri hapụ ndị Pati ka ha mee ihe masịrị ha na-agbagbughi ha n’ụzọ ọbụla”.
- Soludo gara n’ihu kwuo “mmadụ ọ na-eji ego ọha tinye n’ụlọọrụ ebe o so nwere ka ọ na-edosa ego n’ọbaego ebe e nwere ọtụtụ ụlọakwụkwọ na ụlọọgwụ ndị mebiri emebi, ka ọ bụ okporoụzọ ndị na-adịghị mma”.
- Ọ sị na otu Bishop gwara bịa rụọ okporoụzọ dịka Ngige si arụ kama ọ bụghị etu obi si arụ maka na ndị nke Obi rụrụ emebichaala.
- “Ọrụ gọọmentị bụ ịzọ ndụ ndị mmadụ kama ọ bụghị ichekwa ego n’ọbaego ebe agụụ na ụbịam na-akpa ndị mmadụ eze”.
E nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ Gọvanọ Soludo dere n'akara sosha midia ya banyere Peter Obi nke a na-edepụtachaghi ebe a.
Cheta n'izuụka gara aga mgbe Soludo na-azụ ajụjụ na Channels TV, o kwuru na ego ndị Anambra a sị na Peter Obi tunyere n'azụmaahịa amịtaghị mkpụrụ ọbụla.
Nke a mere ọtụtụ ndị mmadụ jiri na-akatọ ya, na-ekwu na gịnị mere na ọ katọghị Willie Obiano nyefere ya ọchịchị n'ọnwa Maachị 2022 na ọ bụrụ Peter Obi chịchara kemgbe afọ itoolu gara aga.









