Enugu auto-crash: Ọ bụ oke ọsọ butere ihe mberede okporoụzọ n'Enugwu Steeti - FRSC

Onye nchikọta ndị ọrụ FRSC nke Enugwu Steeti bụ Joseph Toby ekwuola na ọ bụ oke ọsọ butere ya bụ ihe mberede.
O kwuru sị, " Mmadụ ise nwụrụ, ndị nwoke atọ na ụmụị nwanyị abụọ nwụrụ . Ọ bụ oke ọsọ nke erubeghị isi n'iwu ogboroụzọ butere ya bụ ihe mberede.
O kwuru na ha agwaala ndị uweojii ihe ha chọpụtara ma nyefee ha nyocha maka ihe mere.
Ihe anyị ma maka ihe mberede a?

Ebe foto si, Chukwudi
Mmadụ ise tufuru ndụ ha n'ihe mberede okporoụzọ mere na nso CBN bustop dị na Trans-Ekulu Enugu n'okporoụzọ awara awara si Enugwu gawa Onicha ụbọchị Tozde.
Nke a mere n'ụtụtụ Tozde dịka ụgbọala na-ebu mmadụ 18 e ji eme njem bu akara Enugwu XL884 ENU na nnukwu ụgbọala 'trailer bu simentị kụkọrọ isi.
Ndị nwụụ n'ihe mberede ahụ gụnyere ọkwsọụgbọala ahụ bụ Simon Umeh na mmadụ isii ndị ọzọ, dịka ndị uweojii steeti ahụ si kwuo.
Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ụgbọala bọọsụ ahụ si Abakpa buru ndị mmadụ na-aga New Market dịkwa n'Enugwu oge ọdachi ahụ mere.
Otu onye n'ime ha a kpọrọ Chkwudi sịrị, " Ọkwọụgbọala bọọsụ ahụ si Abakpa-Nike gbararịị ịgbafe ụgbọala nọ ya n'ihu nke na-akwụ anị̀ụrụ were sụkọ isi n'a trailer na-abịa ya n'ihu."
" Amaghị mmadụ ole nwụrụ mana ozu mmadụ asatọ tọgbọrọ n'ụzọ.", Enugwu.

Ebe foto si, Chukwudi
Oge onye ntaakụkọ BBC garuru ebe ya bu ihe mere, ebugalaa ndị ometụtara ụlọọgwụ.
N'otu aka ahụ, Osote Govanọ Enugwu steeti agala leta ụfọdụ ndị ihe metụtara n'Ụlọọgwụ 'Parklane Hospital ma kwee nkwa na aga-enye ha nleta n'efu.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Daniel Ndukwu kwuru na " e bughara ozu ọkwọụgbọala na mmadụ ise ndị o bu n'ụlọọgwụ ebe ndị dọkịta kwuru na hsa anwụọla, a dọnye ozu ha n'ụlọozu.
ọ gara n'ihu kkwuo na ndị uweojjii na-enyocha ihe mere nakwa ịhụ n'aka kpaara ọkwọụgbọala truck ahụ bụ onye gbara ọsọ ka ya bụ ihe mberede mere.
.












