Ihe Buhari kwere na nkwa, o mezuru ha?

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Presidency Nigeria/Twitter

Dịka Naịjịrịa ka mechara ntụliaka Onyeisiala nke ngalaba na-ahụ maka ntụliaka bụ Inec n'ịchafụ kpọpụtara Bola Ahmed Tinubu nke otu All Progressive Congress dịka onye meriri ya bụ ntụlaika, Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari, onye chịrịla afọ asatọ na-akwado ịhapụ ọchịchị dịka Onyeisiala.

Tupu o merie ntụliaka nke o ji bụrụ onyeisiala Naịjirịa, e nwere ụfọdụ nkwa ọ kwere ndị Naịjirịa, ugbua ọ na-akwadọ iritu dịka onyeislala, okwu na-aga n'ihu ugbua nke ụfọdụ kwetara na o mezuru nkwa o kwere, ebe ụfọdụ na-ekwu na mbọ ọ gbara ejughị ha afọ.

Nchịkọta nkwa Buhari kwere ndị Naịjirịa

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Presidency Nigeria/Twitter

Nkwa onyeisiala Muhammadu Buhari na ndị otu pati ya nke bụ 'All Progressive Congress' (APC) kwere ụmụ Naịjirịa dị ole ma ole.

Ị ga-agụta ya n'uju na akwụkwọ nkwa ha ji mee emume achụmnta vootu ha dịka ndị ụlọọrụ INEC si wepụta.

Kama maka edemede a, anyị ga-eji ihe itolu Buahri kwuputara n'afọ 2020 dịka ebe ọ ga-etinye uchu were nwaale ya. Atụmatụ a ka ọ kpọrọ '9 point Agenda'.

Ọ bụ n'akwụkwọ ozi nke onye ndụmọdụ ya bụ Femi Adesina wepụtara n'afọ 2020 ka ha kwuputara ebe ndị ha ga-etinye uchu.

Ihe itolu ndị a gụnyere:

  • Iwulite ma kwalie akụnụba Naịjirịa
  • Iwetulata ụbịam
  • Ikwalite ọrụ ubi iji hụ na nrị juputara, ma iji kwa ya gbaa mgbere mba na mba
  • Ihụ na ọkụ latrik na mpụtara mmanụ agbịdị zuru oke
  • Ikwalite etu esi eme njem na Naịjirịa
  • Ikwalite iji ego achụ ego na ụlọọrụ na arụụta ihe
  • Iwetụlata ego ole eji elekọta ahụike
  • Ihiwe atụmatụ ga-aluso nrụrụaka ọgụ
  • Ichekwa Naịjirịa

Ihe Buhari na-ekwu maka imezu nkwa ọ kwere ndị Naijirịa

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Presidency Nigeria/Twitter

N'ụbọchị 11 nke ọnwa Febụwarị afọ 2023, n'emume ndị gụcharala Mahadum nke Mahadum 'Federal University, Oye-Ekiti, Ekiti Steeti ka Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari nọrọ kwuo na ya emezuola nkwa niile o kwere ndị Naịjirịa kemgbe ọ banyere n'ọchịchị.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

O kwuru nke a site n'ọnụ onye nnọchite anya ya na ya bụ emume bụ Mịnịsta na-ahụ maka agụmakwụkwọ bụ Goodluck Nanah Opiah ka .

Buhari kwuru sị, " Ka m chetere unu na ọchụchọ m na oge ọchịchị m dịka onyeisiala kamgbe afọ 2015 hiwere isi n'ịkwalite nchekwa Naịjiịa, ikwalite akụnụba Naịjirịa, iluso mpụ ọgụ. Ọ bụ site n'obi juputara n'ọṅụ ka m na-ekele Chineke na-ekwu na m mezuru nkwa atọ ndị a".

Buhari gara n'ihu kwuo sị, " Mgbe m na-abanye n'ọrụ dịka onyeisiala, ndị otu oyiegwu na ndị omekome ndị ọzọ ji Naịjirịa aka n'olu. Mana ugbua, ọ bụ obi siri ike ka m ji ekwu na ọgụ alụsọrọ ndị otu oyiegwu mụtra mkpụrụ dịka anapụla ha mpaghara dị iche iche nọ n'aka ha na mbụ. Ugbua otu oyindụegwu na Naịjirịa nọzị n'ọnọdụ o dị ndụ ọnwụ ka mma"

"Ya bụ ihe adịghi mfe, ọ bụ itinye uchu n'ọrụ mịtara mkpụru a".

Ọ rụtụrụ aka na mpụ na nrụrụaka were sị,"Anyị ewepụla aka ike nrụnrụaka jiri jide Naịjirịa".

Maka agụmakwụkwọ ka o kwuru sị, " O doro mmadụ niile anya na ọchịchị m ji nwayọ nwayọ na-ewelite bọjet ego anyi wepụtara maka nwulite agụmakwụkwọ na Naịjirịa.

Ihe ọnụ ọgụgụ na-ekwu maka mmezu nkwa atọ kacha gbaa ọkpụrụkpụ Buhari kwere ndị Naịjirịa

Maka akụkọ a, anyị ga-ewepụta ụfọdụ nkwa gbara ọkpụrụkpụ Muhammadu Buhari kwere ma gosi gị ihe ọnụ ọgụgụ na-egosi maka ọnọdụ ha.

Ihe ọnụ ọgụgụ na-ekwu maka iwụlite akụnụba Naịjirịa

Anyị ga-eji ụfọdụ ihe dịka ọnụ ahịa nrị, ụgwọ Naịjirịa ji na ihe ngosi ndị ọzọ were mee nke a.

Ọnụ ahịa nrị site n'afọ 2012 ruo afọ 2022 dịka ọ bụ afọ abụọ a kacha dị nso:

Ọnụ ọgụgụ na-egosi ọnụ ego nrị na Naịjirịa

Ọnụ ahịa ji 19% rịa elu n'afọ 2022, bụ nke kachasị n'ime afọ iri abụọ. Garri bụ nri nke a na-erikarị ka ihe ngosi a na-akọwa kacha dị ọnụ ala mana ọnụ ahịa nri ndị ọzọ dị mkpa dịka tomato na akwụkwọ nri gbagoro elu bụ nke na-emetụta ọtụtụ ezinaụlọ n'ebe ọ dị ukwuu.

Nke ọzọ a bụrụ ụgwọ Naịjirịa ji

Ọnụ ọgụgụ na-egosi ụgwọ Naịjirịa ji
Nkọwa foto, Ọnụ ọgụgụ na-egosi ụgwọ Naịjirịa ji

Naịjirịa bụ mba e ji mmepụta mmanụ agbidi maara eritebeghi uru n'ọnụahịa mmanụ a na-arị elu n'ihi enweghi ike isipụta mmanụ nke ha kama ha na-ebubata nke e siri na mba ọzọ.

Dịka o siri dị, ndị ọkammụta maka akụnụba obodo amaghị etu a ga-esi kwụọ ụgwọ ndị a e ji nakwa ego ndị maara ya n'elu maka na ego gọọmentị na-enwete anaghịzi ezu site n'afọ 2022.

Ihe ọzọ na-egosi ọnọdụ akụnụba mba bụ ọnụ ọgụgụ ndị na enweghị ọrụ na Naịjirịa. Lee ihe ọnụ ogụgụ a na-ekwu -

Ọnụọgụgụ ndị enweghị ọrụ na Naịjirịa

Ọnụ ọgụgụ ndị enweghị ọrụ

Ihe mbụ ọtụtụ ndị ntoroọbịa Naịjirịa chọrọ bụ ọrụ.

Dịka ọ dị ugbua, ọtụtụ ndị Naịjirịa chọrọ ịrụ ọrụ enweghi ọrụ.

A bịa na ndị ntoroọbịa, ihe karịrị ọkara ndị dị afọ 15 ruo 24 na-achọ ọrụ.

Nsogbu banyere mgbochi ọrịa Covid 19 sokwa n'ihe kpatara ya mana ọnụọgụgụ ndị na-enweghi ọrụ dị mbụ na-arị elu tupu nje a apụta.

Akụnaụba etoola kamgbe afọ 2015, mana o rubeghi n'ogogo ịnabata mmadụ niile na-enweghi ọrụ.

Enweghi ezi nchekwa so n'otu n'ihe ndị a na-arụ aka mere akụnaụba etoghi ọfụma, mana ndị nkọwa akụnaụba rụtụkwara aka n'ụkọ ego mgbanwe na mmechi okeala maka ibubata ngwa ahịa gbochiri azụmaahịa.

Ihe ọzọ kwa eji atụle akụnụba obodo bụ nke a kpọrọ 'Multi Dimensional Poverty Measure' nke bụ mpụtara ngụkọ nke jị etu atụmatụ ego, agụmakwụkwọ na akụrụngwa eji akwado obodo sị metụta ezịnụlọ ndị nọ na mba.

Ọnụ ọgụgụ na-egosi ezịnụlọ nọ n'ụbịam
Nkọwa foto, Ihe ngosi a na-akọwa na ndị nọ na mpaghara Ugwu kacha ata ahụhụ na Naịjirịa

Maka okwu nchekwa

Maka nchekwa, anyị ga-eji ọnụ ọgụgụ ndị ngalaba IEP Global Peace Index jiri nwalee ogoogo Naịjirịa nọ maka ihe gbasara udo.

Ọnụ ọgụgụ ngalaba a wepụtara maka ọnọdụ udo nke afọ 2022 na-egosi na Naịjirịa enweghị ezigbo nchekwa dịka mba ndị gbara ya gburugburu.

Ọnọdụ enweghị udo nke Naịjirịa na mba ndị gbara ya gburugburu

Ihe ndị ọnụ na-eru n'okwu maka ntụliaka nwere ikwu maka nke a?

Mazi Ugo Egbujo onye ọnụ na-eru n'okwu ma na edekwara ụlọ mgbasaozi edemde maka ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa.

O kwuru sị, " Obi ejuchaghị m afọ etu Buhari siri rụọ ọrụ. E chere m na dịka ọ bara nọrọ ihe dịka ọnwa isii na ndị mmadụ agaghị ana ngarị n'okporoụzọ, maọbụ ha chọrọ ị na ngarị ha abanye n'ọhịa, kama ọ bụghị ihe mere".

O kwuru maka nchekwa ma kọwaa na ọ chere na Buharị kwesịrị ịghọta na ọ bụrụ na-elekọtaghị ndị uweojii nkeọma na mpụ agaghị ebeleta.

O kwuru sị, "A jụrụ m ndị uweojii etu e si elekọta ha, aghọtara m na-enweghị onye na-elekọta ha. Ọ bụ ngarị ha na-ana n'ụzọ ka ha ji elekọta onwe ha".

Mgbe ha bidoro n'ime afọ abụọ, ha wepụtara ezigbo atụmatụ kama ọdachi osinachi dịka covid-19 cheere ha aka mgba.

Egbujo sị, "Mgbe ha bidoro na-etinye anya maka ntụliaka afọ 2019 ka ha dapụrụ n'usoro, ha hapụrụ ihe ha kwesịrị ime ma tinye aka na ntụliaka".

O gara n'ihu kọwaa ma sị "Buhari rụrụ otu ọrụ kacha dị mkpa na Naịjirịa kamgbe afọ 2019. Ọ rụrụ ụzọ ụgbọoloko nke jịkọrọ Legọs na Ibadan. Ọzọ bụkwa akwa mmiri Naịja nke abụọ bụkwa nnụkwụ ọrụ Buhari rụụrụ ndị Naịjirịa... E nwere ọtụtụ ihe Buhari rụrụ ma kwụwa aka ọtọ".

O kwuru na ihe ọzọ chere Buharị aka mgba bụ enweghị ego dịka ego ole a na-ere mmanụ agbịdị kụrụ afọ n'ala.

Egbujo kwuru sị, "Ihe abụọ nyere Buharị nsogbu bụ enweghị ego, kama anyị chere na ọ ga-aluso nrụrụaka ọgụ kama ndị na-eme nrụrụaka gbara oche ọchịchị ya gburugburu".