BVAS, IReV ga-arụrịrị ọrụ na ntuliaka ọkwa gọvanọ na Maachị 11 - Inec

Ngalaba nhazi ntuliaka na Naịjirịa bụ 'Independent National Electoral Commission' (Inec) ekwela nkwa na ọdachi niile e nwere na ntuliaka onyeisiala n'ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị agaghị adịkwa na ntuliaka nke ọkwa Gọvanọ a ga-eme na steeti dị icheiche n'ụbọchị 11 nke ọnwa Maachị 2023.
Onyeisioche Inec bụ Mahmood Yakubu kwere nkwa a oge ya na ndị welitere isi na Inec nwere ọgbakọ n'ụbọchị Satọde, Maachị 4.
Ọgbakọ ahụ na-abịa dịka ụbọchị olemole gachara Inec ji kpọpụta Bola Ahmed Tinubu nke pati 'All Progressives Congress' (APC) dịka onye meriri ntuliaka ọkwa Onyeisiala Naịjirịa.
Ntuliaka ahụ nwere ọtụtụ mperi dịka ndị mmadụ si kpesa nakwa dịka ụfọdụ otu ndị na-elekọta ntuliaka si kwuo.
Mperi ndị a gụnyere ndị ọrụ Inec abịaghị n'oge na 'polling unit' dị icheiche, enweghị akụrụngwa zuru ezu maka ntuliaka, enweghị ike iziga mpụtara ntuliaka gaa IReV dịka iwu si kwuo, dgz.
Nke a mere ka Atiku Abubakar onye zọrọ ọkwa onyeisiala n'otu 'Peoples Democratic Party' (PDP) nakwa Peter Obi onye nke 'Labour Party' kwuo na ha ga-aga ụlọikpe ịgbagha mmeri Tinubu.
N'ọgbakọ nke ụbọchị Satọde, Mahmood Yakubu kọwara na Inec atụleela ntuliaka nke gara aga, chọpụta ebe niile ha si rie mperi ma dozikwaa ha.
"Anyị atụleela teknụzụ anyị niile ma wulite ha iji hụ na ọdachi niile e nwere, ọ kachasị gbasara iziga mpụtara ntuliaka, agaghị adịkwa na ntuliaka nke ụbọchị 11 nke ọnwa Maachị," ka Yakubu kwuru.
Ihe ise INEC ga-eme tupu ntuliaka ọkwa gọvanọ
- Inec ga-enyekwa ndịọrụ ha ọzụzụ ọzọ iji chetara ha ihe ha kwesịrị ime n'ụbọchị ntuliaka
- Igwe 'Bimodal Voter Accreditation System (BVAS) ga arụ ọrụ nke ọma
- Ihe a ga-eji BVAS mee bụ inyocha ndị ga-atụ vootu nakwa ijikwa mpụtara ntuliaka
- Ndịọrụ Inec niile a chọpụtara na ha akpaghị ezi agwa na ntuliaka nke ọkwa onyeisiala agaghị eso na ntuliaka nke ọkwa gọvanọ na Maachị 11
- Ndị isi Inec na steeti dị icheiche ga-enye onye ọbụla a hụrụ mere nrụrụaka ntaramahụhụ kwesịrị ya.
Ebe a ga-enwe ntuliaka Gọvanọ
Inec kwuru na ntuliaka nke ọkwa gọvanọ ga-adị na steeti 28, mana ntuliaka maka ụlọ omeiwu steeti ga-adị na steeti niile.
Ụfọdụ ebe a na-emeghị ntuliaka maka ụlọ omeiwu etiti n'ụbọchị 25 nke Febrụwarị, a ga-emezi ya n'ụbọchị 11 nke Maachị; ebe ndị a gụnyere mpaghara Enugu East n'Enugwu Steeti, Esan East/West na Igueben nke Edo Steeti.
Mpụtara ntuliaka nke ụlọ omeiwu etiti
Dịka onyeisi Inec bụ Mahmood Yakubu si kwuo, akpọpụtala mpụtara ntuliaka maka oche omeiwu etiti ọnụgụgụ ya dị 423.
Nke a gụnyere oche sineti 98 nke mere ka ọ fọdụ mmadụ 11 ka oche sineti zuo; oche 325 n'ụlọ omeiwu nta bụ 'House of Representatives', ọ fọdụ mmadụ 35 ka oche ụlọ omeiwu nta zuo.
Pati asaa nwetara oche na sineti ebe pati asatọ nwetara oche n'ụlọ omeiwu nta.
Lee etu okwe si gbaa na sineti: APC - 57; PDP - 29; LP - 6; SDP - 2; NNPP - 2; YPP - 1; APGA - 1.
N'ụlọ omeiwu nta, lee ndị nwetara mmeri: APC - 162; PDP - 102; LP - 34; NNPP - 18; APGA - 4; ADC - 2; SDP - 2; YPP - 1.









